Dangote ga-amalite ịrụ ụlọọrụ mmanụ agbịdị ijeri dọla 16 ọhụrụ na mba Kenya

Ihe niile ezuola oke maka emume e ji agbape ụlọọrụ na-eshipụta mmanụ agbịdị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Africa bụ Dangote East Africa Petroleum Refinery and Petrochemicals SEZ.
Ozi ruru anyị aka kwuru na emume a ga-adị na Mokowe nke mpaghara Lamu County na mba Kenya.
Ụlọọrụ ahụ a na-eme atụmatụ ya ga-ewe ego ruru ijeri dọla iri na isii ($16b) iji rụọ ya ma bụrụkwa nke ga na-eshipụta mmanụ ruru barel narị puku asaa (700,000) kwa ụbọchị ma ọ bụrụ na a rụchaa ya n'afọ 2030.
A na-atụkwa anya na ụlọorụ ahụ ga-ebelata oke ndabere mpaghara ahụ nwere na mmanụ ndị e si mba ndị ọzọ tụbata.
Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na Nairobi n'ubọchị Tuzde 29 Septemba 2026, onye hiwere ụlọọrụ ahụ bụ Aliko Dangote kwuru na ya hụtara ụlọọrụ ọhụrụ a dịka mbọ e ji akwụsị ntụbata mmanụ agbịdị n'Africa.
Dangote kwuru na o nweghị nsogbu maọbụ ihe mkpọbiụkwụ ọbụla ọ na-ahụta gbasara ụlọorụ ahụ a na-eme atụmatụ ịrụ n'egberemmiri Indian Ocean Coast dị na mpaghara Lamu dịka ụfọdụ si ekwu.
"O nweghị nsogbu ọbụla na-adị n'ụdịrị okwu ndị a. O nwere ndị na-achọghị ka Africa mepee," ka nwoke a kachasị baa ọgaranya n'Africa kwuru.
Dangote kpughere atụmatụ o nwere intinyekwu ijeri dọla iri ise ($50bn) na mpaghara Africa niile dịka o tinyechara ihe karịrị ijeri dọla iri abụọ na ise ($25bn) n'azụmaahịa ndị dị adị.
O kwuru na ihe ọzọ ụlọọrụ ya ga-etinye aka ga-ejikọta itinye nnukwu ego n'ụlọọrụ mmepụta ngwaahịa.

Dangote gwara ndị na-etinye ego na atụmatụ ire aka oke na-aga n'ihu ugbua n'ulọọrụ Dangote Petroleum Refinery abụghị naanị maka iji kpakọta ego kama, site na mmasị o nwere ime ka akụnaụba ruo onye niile aka.
Ọ sịrị na atụmatụ a ga-eme ka ndị Africa sonye na mmụba akụnaụba nke iwunye ụlọọrụ na mpaghara Africa ga-ekepụta.
"Ọ bụghị maka na anyị chọrọ ego. Mba. Ọ bụ maka na anyị chọrọ ikesa akụnaụba ka o ruo onye niile aka," ka Dangote kwuru.
Ọ gara n'ihu sị "ebumnobi anyị bụ ka anyị kesaa ịkpata akụ" ma kwupụta na ụlọorụ niile nke ha na-elekọta ga-ejiri nwayọọ banye n'aka ọhanaeze.
"E kwuola m na ụlọọrụ niile anyị na-elekọta site n'ụbọchị taa, ga-emecha bụrụ ndị ọhanaeze nwe," ka o kwuru.
Dangote kpughere na ụlọọrụ ọhụrụ na-eji ụgbọmmiri ebu ibu, bụ nke ụlọọrụ ya haziri ga-amalite ọrụ, ebe mmụba nke ụlọọrụ na-emepụta ntụ akụkụ 'fertilizer' ga-abụ nke ọhanaeze ga-esonye na ya.
Aliko Dangote kwuru na ebumnobi ụlọọrụ ya bụ ikepụta nde kwuru nde ndị Africa nwere aka oke, bụ ndị ga-erite uru na-abụghị naanị site n'ego ọmụrụnwa ha, kama site na mmụba nke azụmaahịa ụlọorụ ahụ.
O kwuru na mgbe ụlọorụ nshipụta mmanụ dị na Lamu ga-eru n'ogogo ịbanye n'aka ọhanaeze, na a ga-ewepụta ya na Kenya karịa iwere ya gaa Nigeria.
























