Pete Edochie na-eme ejije anwụọla ka ọ gbara afọ 79

Foto Pete Edochie ka o yi uwe ọcha
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye na-eme ejije a ma ama bụ Pete Edochie anwụọla dịka ọ gbara afọ 79.

Ozi nwa ya nwoke bụ Leo Edochie wepụtara kwuru na Pete Edochie nwụrụ n'ụtụtụ Wenezde 25 Nọvemba 2026 n'Enug state

Ozi ahụ kwuru na ọ rịara ọrịa prostate cancer tupu ọ nwụọ.

Onye bụ Pete Edochie?

A mụrụ Pete Edochie na Maachị 7 1947 n'Enugu State.

Nna ya rụrụ ọrụ n'ụlọọrụ Nigerian Railways. Ọ bụ ọrụ a kpọgara nna ya Kaduna state bụ ebe Pete nọ too dịka nwatakịrị.

Pete Edochie gara ụlọakwụkwọ Saint Patrick's na Saint James Primary Schools na Zaria tupu ọ gaa ụlọakwụkwọ Saint John Secondary School, Kaduna, n'afọ1960.

Ka afọ anọ gara, ọ hapụrụ ụlọaakwụkwọ ga soro nna ya rụọ ọrụ n'ụlọọrụ Railway ahụ. N'afọ 1966 dịka agha tiwapụrụ na mpaghara ugwu Nigeria, ọ hapụrụ ebe ahụ tupu agha ime obodo Bekee kpọrọ civil war amalite.

Oge ọ dị afọ 20, Pete Edochie nwetara ọrụ n'ụlọọrụ mgbasaozi Eastern Nigerian Broadcasting Corporation.

N'afọ 1980, o nwetara ọzụzụ n'ụlọọrụ British Broadcasting Corporation ma rigoo n'ọkwa dị elu ma mechaa bụrụ onyeisi mbụ ụlọọrụ Anambra Broadcasting Service 3FM Stereo n'afọ 1987.

Ọ lara ezumike nka otu afọ oge gọọmenti malitere itinye aka ha n'etu ụlọọrụ ahụ si arụ ọrụ.