O nweghi mgbe m sịrị na ndị na-akatọ m gaa bukwuo akwa - Enioluwa

Ebe foto si, Enioluwa/Instagram
Nigerian social media personality and actor, Enioluwa Adeoluwa, has denied making comments telling critics to "cry more" in response to criticism, describing screenshots circulating online as fabricated.
Nigeria News Updates
His representatives, Sucre House Entertainment, issued a statement on Saturday, distancing the influencer from the remarks attributed to him in the viral screenshots.
Onye a ma ama na sosal midia bụ Enioluwa Adeoluwa agọọla na o nweghi mgbe ọ gwara ndị na-akatọ ya na ha "bekwuo akwa" na nzaghachị o nyere ha ma kwuo na ozi ahụ na-efegharị banyere nke ahụ bụ okwu asị a rụrụ arụ.
Ụlọọrụ na-elekọta nwamadị a bụ Sucre Entertainment wepụtara ozi na Satọde 21 Nọvemba 2026 iji kwuo na aka nwamadị a adịghị n'okwu ahụ na-efegharị.
Ha kọwaara na Enioluwa ekwughi ụdịrị okwu ahụ ma sị na nke ahụ na-efegharị na soshal midia egosighi okwu ọbụla si n'ọnụ ya.
"Anyị na-ekwu ya hoohaa na Enioluwa ekwughi ihe dị etu ahụ nke na-efegharị. Foto ndị a na-efegharị bụ arụrụ arụ," ka ozi ahụ kwuru.
Ha gara n'ihu kwuo na ọ bụ eziokwu nao nye ọbụla nwere ikike ikwu ihe masịrị ya mana ọ dị mkpa ka onye ahụ ghara iji ikike ahụ ekesa akụkọ ụgha.
Ọ gara kwuo na ọ dị mkpa ka onye ọbụla na-ekesa akụkọ mee nnyocha nke ọma ọkachasị tupu ha ekesaa ya na soshal midia.

Ebe foto si, Sucre Entertainment
Mana gịnị butere okwu a?
Nke a na-abịa dịka ozi e setere na foto ebe a sị na Enioluwa ka gwara ndị na-akatọ "bekwuo agwa".
N'oge ọ gara ọgbakọ emume ebe a kpọrọ ya ka ọ bịa gwaa ndị ntoroọbịa okwu, Enioluwa kwuru na ọtụtụ ndị ntoroọbịa na Nigeria anaghizi adị ike ọrụ na ọ bụ ya mere ihe ji esiri ọtụtụ n'ime ha ike.
Mana ọtụtụ ndị ntoroọbịa gbarụrụ ihu n'okwu ahụ Enioluwa kwuru ma katọọ ya n'ụzọ dị iche iche.
Ụfọdụ ha kwuru na ọ bụrụ na "nne na nna ya ejighi ego, nye ya ezi ọzụzụ ma mepeere ya ụzọ na ọ gaara anọ ebe ọ nọ ugbua"?
N'otu aka ahụ nne ya bụ Bola Adeoluwa tinyere ọnụ n'okwu a ma sị na ọ ghọtara na ndị mmadụ nwere ikike ikwu uche mana ha ghọtaghere ihe nwa ya bụ Enioluwa kwuru.
Ọ sịrị na ọ na-ahụ ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ede na soshal midia banyere nwa kama na nwa ya abụghị ụdịrị mmadụ ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ na-ewute nke ukwuu dịka nne hụrụ nwa ya n'anya na ndị mmadụ na-akatọ ya n'ụzọ na-adịghị mma.


























