Ụlọikpe CAS ekpebiela na ọ bụ Senegal turuugo n'asọmpi Afcon 2025

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe mkpesa egwuregwu a kpọrọ 'Court of Arbitration for Sports' (CAS) ekpebiela na ọ bụ mba Senegal n'ezie kwesịrị ibuli iko 'Africa Cup of Nations (Afcon)' nke afọ 2025.
Ha kwupụtara mkpebi a n'ụbọchị Tuzde dịka ha tulechara mkpesa nke mba Senegal wetaara ha, gbasara ya bụ okwu.
Senegal bụ ndị meriri egwuregwu ikpeazụ nke asọmpi Afcon 2025 dịka ha ji otu ọkpu goolu asataghị asata dulaa Morocco.
Mana Morocco mere mkpesa nye otu Confederation of Africa Football (CAF), ma kwuo na ọ bụ ha kwesịrị ibuli iko ahụ n'ihi na ndị Senegal gbahapụrụ ya bụ egwuregwu n'otu oge n'ihi ebubo ha boro na onye referii chịkọtara ya bụ egwuregwu na-emegide ha.
Ọ bụ eziokwu na ndị bọọlụ Senegal mechara lọghachite bịa gbachaa ya bụ asọmpi, mana ndị nchịkọta bọọlụ Morocco na-ekwu na dịka iwu chịkọtara Afcon siri dị, ozugbo ndị bọọlụ Senegal hapụrụ ama egwuregwu n'iwe lakpuo n'ime, e kwesịrị ibi egwuregwu ahụ n'oge ahụ ma bunye ha iko Afcon.
CAF hibere otu nnyocha maka ya bụ mkpesa, bụ ndị mechara nnyocha ha ma kwuo na ọ bụ Morocco ka e kwesịrị ibunye iko Afcon 2025 n'ihi na Senegal gbahapụrụ egwuregwu ahụ.
Mana Senegal wegara mkpesa n'ụlọikpe mkpesa egwuregwu bụ CAS n'ọnwa Maachị afọ a, iji gbaghaa ihe ahụ otu nnyocha CAF kwuru.
Ndị nhazi bọọlụ na mba Senegal kwuru na egwuregwu ikpeazụ nke asọmpi Afcon 2025 ruru n'isi, ha bụ Senegal ejiri otu ọkpụ goolu merie, ọ bụ ihe ọjọọ onye ọbụla ikwu ka a napụ ha iko ha meriri n'anya ọcha.
Ọkaikpe mba France gbara afọ 76 bụ Gerald Simon, bụ onyeisi otu ndị ọkaikpe atọ nụrụ mkpesa a ndị Senegal wetara n'ọnwa Ọktoba.
Akụkọ na-abịa.





























