Super Eagles nke Nigeria ejirila ụtalị mmụọ pịajasịa ndị Tanzania ogbe azụ

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Super Eagles nke Nigeria na ndị ogbo ha nke Tanzania na-achịpụ ya ugbua n'asọmpi itozuoke n'egwuregwu Iko Mba Africa (Afcon) 2027.
Nke a na-akpọtụ n'ama egwuregwu Godswill Akpabio dị n'Uyo Akwa Ibom State.
Ka ọ dị ugbua, Super Eagles ji ọkpụ goolu atọ asatara naanị otu na-emenyụ ndị Tanzania anya dịka asọmpi a abanyela nkebi nke abụọ (2nd half).
Alhassan Yusuf nke Nigeria bu ụzọ sụnye goolu nke mbụ na nkeji 12' mana A.M. Msanga nke Tanzania sara goolu ahụ na nkeji 32'.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
O nweghi ndị ọbụla nyetere goolu ọzọ ruo na ngwụcha nkebi mbụ.
Mana dịka a malitere nkebi abụọ na nkeji 52' Tolu Arokodare mezuru ya goolu abụọ nye ndị Nigeria.
Na-egbughi oge na nkeji 60' nwamadị a (Tolu Arokodare) mezuru ya nke atọ nke mere ojiri bụrụ ọkpụ goolu atọ.
Ruo na nkeji 90' ogbu pịpịrọ gbuchiri asọmpi ahụ, ndị Tanzania siri ọnwụ ka ha saa goolu abụọ ndị a mana ndị Super Eagles nke Nigeria foorola ntụtụ taa sị na ihe dị etu ahụ adịghị.
Ka dị ụgbua, Nigeria nwere ezi olileanya itozuoke n'asọmpi Afcon 2027 maka na ha bụ ndị abụọ n'otu ha.
Ha ji akara isii bụrụ ndị abụọ na tebụlụ ebe Guinea Bissau ji akara asaa nọrọ na ndị mbụ n'ime asọmp atọ a gbaarala.
Etu ihe si kwụrụ tupuu asọmpi amalite

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Dịka asọmpi itozuoke n'isonye n'asọmpi African Cup of Nations (Afcon) nke afọ 2027 na-aga n'ihu, ndị otu egwu ụmụnwoke Nigeria ga-ezute otu egwu bọọlụ ụmụnwoke nke mba Tanzania n'ụbọchị taa bụ Fraịde abalị 13 Nọvemba 2026.
Nigeria ga-ezute Tanzania n'ama egwuregwu Godswill Akpabio International Stadium dị n'Uyo dịka ha na-atụ anya inweta mmeri iji hụ na ha nwere ohere itozuoke n'isonye n'asọmpi Afcon 2027.
Dịka tebụlụ asọmpi itozuoke Afcon 2027 si dị, Nigeria na mba Tanzania, Guinea-Bissau na Madagascar nọ n'otu L.
Ka ọ dị ugbua, Nigeria na-agba mbọ ịhụ na ha nwetara mmeri n'asọmpi a maka na Tanzania etozuola isonye n'asọmpi a n'ihi na ha so na mba atọ ga-achịkọba ya.
Cheta na Nigeria agbaala asọmpi abụọ, merie otu ma kpụọ afọ n'ala n'otu n'asọmpi nke abụọ ha.
Oto ọzọ nọ n'otu L bụ Guinea-Bissau bụ ndị nọ n'isi otu ahụ ugbua dịka ha meriela asọmpi abụọ ma gbaa onye lawa onye lawa n'asọmpi nke atọ ha ebe mba Nigeria nọ n'ogogo nke abụọ maka inweta otu merie naanị.
Madagascar bụ mba ji akara abụọ nọrọ n'ogogo atọ dịka kụrụ afọ n'ala n'asọmpi nke mbụ ha ma gbaa onye lawa onye lawa na asọmpi abụọ ndị ọzọ ha gbara.
Tanzania nwetarala naanị otu akara nọ n'ogogo ikpeazụ dịka ha kụrụ afọ n'ala n'asọmpi nke mbụ ha ma gbaa onye lawa onye lawa na nke abụọ.




























