Stan Nze and Blessing Jessica Obasi: A na-ekwu na m lụrụ nwaanyị dị afọ 42 mana ọ gbasaghị m

Stan Nze na Blessing Jessica Obasi
Nkọwa foto, Stan Nze na nwunye ya bụ Blessing Jessica Obasi
Mgbe e biputara ya

Stan Nze akọwaala ihe mere o ji lụọ nwunye ya bụ Blessing Jessica Obasi, n'agbanyeghị na ndị mmadụ na-ekwu na ọ dị afọ iri anọ na abụọ (42).

Agbamakwụkwọ Stan Nze na Jessica Obasi kporo ọkụ na soshal midia n'ọnwa Sepụtemba, n'ihi na onweghị onye ma na ha abụọ na-akwado ịlụ onwe ha.

Na mkparịtaụka ya na BBC Pidgin nwere, Stan Nze kwuru na ihe mere o ji lụọ nwunye ya bụ na ọ naghị awa ya isi.

Aha onyonyo, 'Anaghị m agwọ ọgwụ ọ bụ ihe na-eme n'obodo ka anyị na-egosi' - Kanayo O kanayo

Nwunye m na-enye m udo nke obi

Stan Nze na Blessing Jessica Obasi
Nkọwa foto, Stan Nze na nwunye ya bụ Blessing Jessica Obasi

Stan Nze kọwara na ya na ọtụtụ ụmụnwaanyị mara emekọọla ihe, mana ọ bụ Blessing Obasi ka obi ya nabatara.

"Ọtụtụ ndị mmadụ na-akọ m ọmụ na Soshal midia na-ekwu na m lụrụ nwaanyị tọrọ mụ atọ. Na mụ mara mma karịa ya. No o tosịghị m."

"Gịnị mere mụ ji lụọ nwaanyị dị afọ 42? Nke a, nke ọzọ."

"Mana ihe niile ndị ahụ agbasaghị m. A lụrụ m ezigbo enyi m."

"Alụrụ m onye nyere mụ udo, onye m ma na Chineke kwadoro maka m."

Aha onyonyo, Stan Nze na-egosi iwe ya

Nze gara n'ihu kọwaa na otu ihe dọtara ya ebe nwunye ya nọ bụ na ọ bụghị onye ihu abụọ.

"O nweghị ihe mụ na ya na-ezoro onwe anyị ezoro. Anyị anaghị eme meremere n'ihu."

"Anyị na-anyụ onwe anyị ahụrụ, onweghị ihe na-eme."

"Ọ bụ onye na-anaghị agbakasị m ahụ chaachaa. Ọ na-akpa m ọchị nke ukwuu."

"Naanị otu ihe m na-enyere ya aka maka ya bụ na ọ na-ewe iwe ngwangwa."

"O wekwaanụ iwe, ọ ga-agwa gị ya ebe ahụ etu o si dịrị ya n'obi."

"Mana obere oge, o kporo ihe niile ahụ kpofuo, chịrịkwa ọchị gawa."

Stan Nze kwuru na ya ga-agbasi mbọ ike ịhụ na ya na nwunye ya alụghị ọgụ maọbụ see okwu n'ime afọ mbụ ha ji gbaa akwụkwọ.

"Ọtụtụ na-ekwu na ọnwa isii di na nwunye ji gbachaa akwụkwọ, ha ga-amalite ise okwu, mana ọ gaghị adịrị m otu ahụ," Nze kwuru.

Onye bụ Stan Nze?

Stan Nze
Nkọwa foto, Stan Nze
  • Stan Nze bụ onye na-eme ejije Nollywood a ma ama.
  • Ezigbo aha ya bụ Stanley Ebuka Nzediegwu
  • Ọ bụ onye Osumenyi n'Anambra steeti
  • O meela ọtụtụ ejije gbara ọkpụrụkpụ nke gụnyere 'Rattle Snake - The return of Ahanna';
  • Ọ chọburu ịbụ onye ọkwọ ụgbọelu, maọbụ Dibia bekee
  • Mana o mechara gụọ kọmputa sayensị na mahadum

Onye bụ Blessing Obasi?

blessing jessica obasi
Nkọwa foto, Blessing Jessica Obasi
  • Blessing Obasi bụkwa nwa ada a ma nke ọma n'ime ejije Nollywood
  • Ọ bụkwa onye na-emepụta ejije emepụta, nke bekee na-akpọ 'producer'
  • Ọ bụ onye Abia steeti
  • Ọ gụrụ akwụkwọ kọleji na 'Government Girls College, Umuahia
  • O nwetakwara nzere 'Bachelor's Degree' na Mahadum Legọs (Unilag)