Babcock sex video: Ebe ụmụakwụkwọ abụọ mahadum Babcock siri 'daa iwu'

Babcook University
Mgbe e biputara ya

N'ụbọchị Wenesde ka mahadum a chụpụrụ otu nwata akwụkwọ ha pụtara na otu ihe nkiri ebe ha na-akwa iko nke na-ewu na sochal midia.

N'ime akwụkwọ mgbasaozi mahadum a zitere BBC, site n'aka ọnụ na-ekwuru ha bụ Joshua Suleiman sị na ihe a mere kamgbe ọnwa Epụrel.

O kwukwara na ọ bụghị n'ime ụlọakwụwkọ Babcock ka ha kwara iko a.

"A chụrụ nwoke ahụ nọ n'ime ihe onyonyo a n'ọnwa Febụwarị nke afọ a ka e mechara nyocha chọpụta na aka ya dị n'ime ajọ agwa a kpara n'ime ụlọakwụkwọ a."

Akwụkwọ mgbasa ozi ahụ kwukwara na a chụọla nwaada ahụ ya na nwoke ahụ kwara iko n'ime ihe onyonyo ahụ.

Ihe gbakara ụfọdụ mmadụ isi nke mere ha jiri na-ajụ ihe kpatara nke a.

Dịka o si kwụrụ ugbua, ụlọakwụkwọ a gbagidere ụkwụ n'iwu mahadum ha medidere ụdịrị agwa.

Babcock bụ mahadum ụlọụka e ji Sabat mara n'ala Igbo nwe - nke pụtara "Seventh Day Adventist Church" na Bekee.

Babcock university so n'ime mahadum ndị nkiti nwe na Naịjirịa malitere n'afọ 1999.

Lee ihe ị kwesịrị ịma maka Mahadum Babcock

Babcock University
Nkọwa foto, Babcock University

1) Ha na-erube isi n'omume ndị Sabat na mahadum ahụ

Dịka anyị ekwuola na ọ bụ ndị Sabat nwe ya bụ mahadum nke mere ha ji erube isi n'emume ụka Sabat na-amlite namgbede Fraịde rue ehihe Satọde.

2) Iwu megidere iyi aka na-amakụ ahụ

Akwa ọbụla na-amakụ ahụ esoghi n'ụdịrị akwa a na-ekwe ka ụmụakwụkwọ yiri na mahadum a.

Mahadum a na-akpasị onye ọbụla yi ụdịrị akwa bịa akwụkwọ ka onye chọrọ iwakpo ndị mmadu n'ike.

3) Nwoke nanwaanyị ekwesighi iso na-aga ụfọdụ ebe n'ụfọdụ oge.

Mahadum a machiri ụmụnwoke na ụmụnwaanyị iso na-agagharị n'ụfọdụ ebe n'ụfọdụ oge.

Ha sị na o bụ ezigbote nsogbu ma ha hụ ndị mmadụ n'ụdịrị ọnọdụ a.

4) Anaghị anabata uwe jean na trawụza "pencil"

Uwe jean, bụ uwe ndị mmadụ kachasị eyi n'ụwa sokwa n'ihe a machiri na ya bụ mahadụm.

Uwe ụmụnwaanyi dịka "skirt" dị n'elu ikpere so kwa n'ihe a nabataghị.

trawụza agbadaghị ala nkeọma sọkwa n'ahịa iwu.

5) Adịghị eyi ọla na iyeri

Iyi iyeri ntị, iyeri imi, nke ire, nke ara na iyeri ọnụ so n'ihe ha machiri.

A machikwara ịkpụ ụfọdụ isi.

6) Ụmụakwụkwọ adịghi esi maọbu rie anụ

Mahadum a adịghị ekwe ka esie nri n'ebe obibi ha. Ha adịghi iri anụ, ihe ha na-eri bu ihe a kpọro "tofu".