CBN Nigeria: Kedụ etu mmachi dọla azụmahịa ga-esi metụta gị?

Ọdọahịa ebe a na-ere ngwa nri
Mgbe e biputara ya

Naịjirịa bụ ala a ma ama na-atụbata ụfọdụ nri dịka mmanụ nri, azụ mkpọ, azụ frij, nnu, shuga wdg.

Nke a mere na iwu onyeisiala Naịjirịa manyere ịkwụsị ịnye ndị na-atụbata nri dọlla azụmahịa ga-emetụta ọtụtụ nri.

Muhammadu Buhari kọwara na o mere nke a n'ihi na Naịjirịa etozuola ịkọpụta nri onwe ya.

Mana onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba obodo bụ Ugochukwu Obi-Chukwu kwuru na atụmatụ a agaghị emetụta nri ka ndị mmadụ si eche.

O kwuru na ọ ga-ete obere aka tupu mmetụta ọ metụtara nri apụta ihe n'ihi na dọla a na-enye ndị na-atụbata nri ebughị ibu na mbụ.

Nri ndị nwereike itinye ego

Nri nwa

Nri nwa

Mmanya ike

Mmanya ike

Ngwa nri

Ọdọahịa ebe a na-ere ngwa nri

Azụ frij

Azụ
Nkọwa foto, Sọọsọ pacent ịrị atọ azụ a na-eri na Naijiria bụ nke e nwetara n'ala anyị

Mmiri ala ehi

Mmiri ala ehi

Mmanụ nrị

Mmanụ nri

Appụlụ na mkpuru osisi ndị ọzọ

Mkpụrụ osisi ụfọdụ a na-atụbata

Nri ndị ọzọ:

  • Mmanya dị icheiche
  • Shuga
  • Okporoko
  • Mmanụ anwụ
  • Ọka
  • 'Wheat'
  • Ntụ e ji eme achịcha Bekee (Flour)
  • Mmanụ ọpapa

Ugochukwu Obi-Chukwu kwuru na ihe na-enye ndị mmadụ oke echiche bụ etu onyeisiala si manye ya bụ iwu n'enweghi ebe o jidere aka

Ọ gwara BBC Igbo n'ekwentị na nke ahụ ga-eme ka ndị mmadụ chịrị aka n'obi n'ihi na ha agaghi enwe ntụkwasiobi ebe onyeisiala nọ.

N'ọnụ ya, "Onyeisiala agwabeghi anyị ihe bụ "nri" o kwuru na iwu a ga-emetụta"

Nke a pụtara na o nwereike imetụta ngwa e ji arụpụta nri ma chekwaa ya.