Kelee Buhari n'akịdị ọ gwọrọ ka ọ gwọta ọzọ - Ngige

Chris Ngige
Nkọwa foto, Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa
Mgbe e biputara ya

Chris Ngige bụ minista na-ahụ maka ọrụ kwuru na Naịjirịa gaara ịgba ntụ ma ọ bụrụ na ahọpụtaghi onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọkwọ ụgbọ Naịjirịa.

Ngige onye kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Onicha nke Anambra Steeti, sị na APC bịakwutere Naịjirịa na-ezughi oke mgbe ha were ọchịchị n'aka PDP.

Ọ sịrị na ọ na-eju ya anya na ndị Naịjirịa anaghị akụrụ Buhari aka n'itute akụnaụba Naịjirịa site n'ọnwụnwụ ọnwụrụ.

Mgbe a jụrụ ya maka nsogbu dị na nchekwa, Ngige kwuru "Ekwula naanị maka akụnaụba na nchekwa, onweghi onye gaara eme nke ọma na ngalaba ndị a karịa gọọmentị anyị."

"Achọrọ m ka ị mata otu ihe nke bụ na onye ọzọ ọbụla na-achuso ọnọdụ nchekwa na akụnaụba gaara eme nke ọjọọ karịa."

Mohammadu Buhari

"Mgbe anyị batara, ọnụ ego mmanụ gbaturu nke ọjọọ, mana anyị chịkwara akụnaụba pụta n'ime ụbịam."

"Ndị Naịjirịa kwesiri ị na-akụrụ anyị aka kwa ụbọchị, ha kelecha Chineke, ha e kele anyị. N'ihi na Chineke ji Buhari na ụfọdụ n'ime anyị mee ka Naịjirịa gaa n'ihu."

Minista a kwuru na ọchịchị Buhari ekewapụtala ọrụ karịrị nde asatọ site n'ọrụugbo na ụlọ mmepụta nkwa ahịa, kwuo na ọchịchị gara aga tụkwasiri anya naanị na mmanụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ụzọ ọjọọ egbuola anyị - Ndị ọkwọ ụgbọala