You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. A nwụchiela mmadụ 25 maka igosi asambodo covid-19 adịgboroja

    N’afrịka, ndị uweojii mba Uganda anwụchiela ndị njem iri abụọ na ise a na-enyo maka igosi asambodo nnyocha covid-19 adịgboroja.

    E jidere iri abụọ na atọ n’ime ha ka ha na-akwado ime njem n’ọdọụgbọelu Entebbe dị nso isiobodo Kampala, ebe a nwụchiri abụọ ndị ka batara abata.

    Mara na mba Uganda ka mepere okeala ha na mba ndị ọzọ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba, ka ọnwa isii ha ji buso mfesa ọrịa coronavirus agha gachara.

    Ugbua, ha na-ana ndị njem akwụkwọ gosiri na ha ebughi ọrịa covid-19, site na nnyocha e mere na-akarịghị ụbọchị ise tupu onye ahụ emee njem.

    Ndị njem na-abata n'ime mba ahụ kwesịkwara iweta akwụkwọ gosiri na ha ebughi ya bụ ọrịa n'ime ụbọchị atọ tupu ha abanye ụgbọelu ga-ebulata ha.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ 10,590 ebutela ọrịa coronavirus na mba ahụ, ebe mmadụ 97 nwụrụla n'ime ha.

  2. Igbo ndị ọma ka ọ dị nụ echi

    Hie nụ ụra n'udo ma chete soro anyị echi.

  3. Igbo ndị ọma anyị ji eme ọnụ

    Nnọọnụ na peeji anyị taa!

    Anyị amalitela iwetere unu akụkọ dị iche iche na-ekpo ọkụ n'ala Igbo nakwa mba ụwa niile.

  4. Igbo ndị ọma ebe a ka anyị ga-awụsa ọwa nke taa

    I meela n'isonye anyị taa, ka ọ dị echi.

  5. Manchester City ewerela Arsenal gụrụ akara atọ dị ọkụ

    Manchester City gosiri Arsenala ihe nwoke ji kara ibe ya dịka ha ji oru ọkpụ goolu a na-asataghị otu merie ha n'asọmpi Premier League.

    Goolu a si n'aka Raheem Sterling na nkeji 23' n'ọkara nke mbụ n'asọmpi.

    Arsenal nwara ike ha dịka dimkpa ha bụ mana Manchester City ekweghi ha nyeta goolu.

    N'otu ahụ Manchester City gbalịkwara inye Arsenal goolu ọzọ mana ha jụwara isi ruo mgbe asọmpi a gwụrụ na nkeji 90'.

    Ugbua Arsenal bụ ndị ise ebe Manchester City bụ ndị iri n'ogogo tebụlụ.

  6. Ndịagha Naịjirịa sị ha ga-amalite emume a kpọrọ 'Ọchị Agụiyi' na Naịjirịa niile

    Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha ga-amalite atụmatụ a kpọrọ 'Ọchị Agụiyi' bụ Crocodile Smile na bekee n'ebe niile na Naịjirịa.

    Ozi a si d n'akwụkwọ si n'aka ọnụ na-ekwuru ndịagha na Naịjirịa bụ Sagir Musa.

    Emume a nke bụ ihe ha na-adị emekarị kwa ngwụcha ọnwa anọ afọ ọbụla ga-amalite n'ụbọchị 20 ọnwa Ọktoba ruo ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba afọ 2020.

    Ha sị emume a ga-agbakwasị ụkwụ n'ibuagha megide mpụ na-eme n'ịntanet iji nyocha ma chọpụta mgbasaozi akụkọ maọbụ echiche ọjọọ na-eme n'elu ịntanet.

    Ha sị na nke a ga-abụ mbụ ndịagha mba Afrịka ga-eme emume ga-ebuagha megide mpụ n'ịntanet.

    Ha kwukwara na ọ ga-enyocha inyochapụta ndị Boko Haram batarala n'obodo dị na mpaghara ugwu nakwa ebe ndị ọzọ na Naịjirịa.

    Ha kwere ngwa na ọ bụ maka udo na ọganihu ndị Naịjirịa ka na-achọ ma rịọ ka ụmụ Naịjirịa kwadoo ha n'oge niile ha ga-eme ya bụ emume.

  7. Chelsea akpọrọla ụkwụ ọcha n'aka Southampton

    Southampton fooro ntụtụ taa ma sị na Chelsea agaghị emeri ha n'asọmpi Premier League dịka ha ji ọkpụ goolu atọ atọ gbaa onwe ha onye lawa onye lawa.

    Chelsea malitere inye goolu abụọ na nkeji 15' na 28' site n'aka Timo Werner bụ onye nyere goolu abụọ a.

    Danny Ings nke Southampton sara otu goolu na nkeji 43' tupu ọkara mbụ apịachie ọnụ.

    N'ime ọkara nke abụọ, na nkeji 57' Che Adams mezuru ya goolu nke ndị Southampton.

    Na-egbughi oge, Kai Havertz nyere ndị Chelsea goolu nkeji 59' iji mee ya nke atọ.

    Mana Jannik Vestergaard nke Southampton mere ka odo Chelsea anya na ha mụ anya site n'inye goolu nke atọ ha na nkeji 90'.

    Nke a mere ka a ga-asị na Chelsea na Liverpool tetere ụra n'otu akwa ndina dịka ha abụọ enweghi ike merie n'asọmpi ha gbara taa.

    Ugbua Chelsea bụ ndị isii n'ogogo tebụlụ Premier League.

  8. Ọ bụ na mma agha Liverpool anaghị aghọzi nkọ?

    Otu egwuregwu Everton ekweghi ka Liverpool ṅụrụ mmiri tọgbọ iko n'asọmpi Premier League ha gbara nke ha ji ọkpụ goolu abụọ abụọ si onye laba.

    Liverpoo bu ụzọ nye goolu na nkeji 3' site n'aka Sadio Mane mana Everton sara mgbe Michael Keane nyere goolu na nkeji 19'.

    Otu egwu abụọ ndị kwechiri na onweghi onye ga-emeri ibe ya ruo na nkeji 72' mgbe Mohamed Salah nyere goolu ọzọ.

    Na-egbughi oge, Dominic Calvert-Lewin saara ndị Everton goolu na nkeji 81' nke gbawara obi ndị Liverpool.

    Mana ebe obi Liverpool nọzi gbaa riri bụ mgbe ogbu pịpịrọ gụpụrụ goolu Jordan Henderson yere na nkeji 90' ma sị na ọ bụ nke a kpọrọ "offside".

    Kamgbe a malitere asọmpi Premier League nke afọ a, Liverpool ahụbeghi gbaa, ọ dịzi ka mma agha ha ọ nwụọla nkọ.

    Ha ji akara iri nọrọ n'ogogo abụọ na tebụlụ Premier League ebe Everton ji akara iri na atọ bụrụ ndị mbụ.

  9. Chibuike Amaechi na-eleta ọrụ ụzọ oloko si Legọs gawa Ibadan ugbua

      • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo

    Minista na-ahụ maka njem bụ Chibuike Rotimi Amechi nọ na Legọs ugbua ebe ọ gara njem nleta etu ọrụ si aga n'ụzọ oloko si Legọs gawa Ibadan.

    Ya ndị na-elekọta ya bụ ọrụ bu ụzọ gaa n'ọdọụgbọoloko nke dị na Yaba tupu ha-esi ebe ahụ gawa nke dị n'Agege na mpaghara Legọs

    Lee photo etu o si aga dịka anyị si hụ ya.

    Ọ gakwara n'ọdọụgbọoloko nke dị n'Iju dị na mpaghara mpụta Legọs.

    Cheta na Amaechi kwere nkwa na gọọmentị etiti na-akwado ịgbape njem ụgbọoloko nke ga-esi nke si Legọs gawa Ibadan dị n'Oyo steeti.

    Ọ bụ ya bụ ọrụ ka ọ bịara Legọs ịleta ma marakwa ebe arụrụ ya be.

  10. Mmadụ 212 ebutela coronavirus ọzọ na Naịjirịa

    Ngalaba na-ahụ MAKA mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ "Nigeria Centre for Disease Control" (NCDC) ekwuola na nnyocha ọhụrụ ha mere gosiri na mmadụ 212 ọhụrụ ebutere coronavirus ọzọ.

    Nke a butere ndị ọrịa ahụ fesarala mmadụ 61,194.

    Mmadụ 52,304 n'ime ha agbakeela ma laa be ha ebe mmadụ 1,119 lara mụọ site n'ọrịa a.

  11. Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo

    Daalụ nụ maka ịsonye anyị taa.

    Anyị ga-ewetara unu akụkọ niile dị mkpa gbasara ihe na-akpọtụ na Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

  12. I meela wee nọnyere anyị taa

    Ụbọchị nta ka anyị chụọ n'owere nchị.

  13. Gere akụkọ gbasara coronavirus n'otu nkeji

  14. Zabaleta awụsala ọwa n'ịgba bọọlụ

    Pablo Zabaleta bụ nwaafọ Argentina gbaara Manchester City na West Ham bọọlụ awụsala ọwa.

    Zabaleta dị afọ iri atọ na ise gbara bọọlụ afọ iri na asatọ ma bulie ọtụtụ iko.

    N'ozi o wepụtara n'elu Twitter ya, o kelere nd mmadụ maka nkwado ha nyere ya n'ime afọ 18 ahụ ọ gbara bọọlụ, ma kelekwa ndị klọb, ndị otu ya n'egwuregwu bọọlụ, ndị nchịkọta niile chịkọtara ya nakwa ndị ọzọ.

  15. Idemmiri achụpụla ndị mmadụ n'obodo Unagboke Inyimagu dị n'Ebonyi steeti

    Ọtụtụ ezinaụlọ dị n'obodo Unagboke Inyimagu dị n'Abakaliki dị n'Ebonyi steeti na-achọ ebe ha ga-edebe isi ha dịka oke idemmiri nyere ha ọsọ n'ụlọ ha.

    Mmiri tojuru n'ọtụtu ụlọ gụnyere ụlọụka nakwa ụlọakwụkwọ dị n'obodo ahụ.

    Onyeisi ụlọakwụkwọ praịmarị Unagboke bụ Oriakụ Bosa Clement, kwara arịrị sị na ha anaghị aganwu akwụkwọ n'ihi oke idemmiri a, ma kwuo na ha ataala ezigbo ahụhụ.

    Igwe Emmanuel bụ otu okenye nọ n'obodo ahụ kwuru sị na oke idemmiri a si n'akwammiri a na-arụchaghị arụcha dị nso ebe ahụ, ma na-akpọku gọọmentị ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.

    Igwe obodo ahụ bụ Sunday Nwokpuru kwuru na ugbo ọ kọrọ ji, osikapa na akpụ ruru ala 100 lara n'idemmiri a, dịka o kwukwara na mmiri a achụpụla ndị mmadụ n'ụlọ.

    Obasi Peter bụ onyeisi ndị ntorobịa n'obodo ahụ kpọkuru gọọmentị ka ọ gbatara ọsọ enyemaka.

  16. Ndi ọrụ gọọmentị na Mali emeela ngagharịiwe maka ndị otu ha a nwụchiri

    Narị kwa narị ndi ọrụ gọọmentị na mba Mali mere ngagharịiwe n'isi mba ahụ bụ Bamako iji kpọọ ka atụghapụ ndị ọrụ ọchịchị ime obodo ndị oji egbe ji.

    Ndị a na-eme ngagahrịiwe gara ụlo ọrụ Praịm Minista mba ahụ ga-enye akwụkwọ ha dere mkpesa ha.

    Ha sị na ihe karịrị mmadụ iri na-arụ ọrụ n'okuru ọchịchị ime obodo nọ n'aka ndị oji egbe.

    N'izuụka gara aga, ndị oji egbe a tụghapụrụ otu onye na-arụ ọrụ enyemaka si mba Frans.

    Nwaanyị a aha ya bụ Sophie Pétronin dị afọ 75. Ha tughapukwara onye zọbụru ọkwa onyeisiala mba ahụ bụ Soumaïla Cissé, 70,

    Ntughapụ ndi so n'ime nkwekọrịta ndi oji egbe a na gọọmentị mba ahụ gụnyere ịtụghapu ndị otu ha ruru 100 no n'aka gọọmentị Mali.

  17. Ọgbakọ ndị gọvanọ agbarụrụọla ihu maka etu e ji wepụta SWAT

    Ọgbakọ ndị gọvanọ Naịjirịa a kpọrọ "Nigeria Governors’ Forum" (NGF) na Bekee gbawala onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Mohammed Adamu na oge oji wepụta ngalaba ọhụrụ a kpọrọ "Special Weapons and Tactics Team" (SWAT) adabaghị ma ncha.

    Aka na-achịgasị steeti dị iche iche a kwuru nke a dika Maazị Adamu na-akọwara ha ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa dika ha na-eme nzukọ nke 18 ha n'elu ịntanetị.

    NGF, n'ozi onyeisi ha bụ Kayode Fayemi nke Ekiti steeti binyere aka, sị na ha tinyere ọnụ n'ọtụtụ ihe na-eme na Naịjirịa ọkachasị ngagharịiwe na-ame maka mkpagbụ a na-ebo nagalaba Bekee kpọrọ "Special Anti-Robbery Squad" (SARS) naka nwị uweojii ọzọ.

    Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs dekwere nkwekọrịta ha nwere na Nzukọ ahu n'akara Twitter ya dịka ọ na-ekwu na ha kwenyere n'ihe ndi ntoroobịa na-eme.

    Fayemi n'onwe ya tinyere akwụkwọ ozi ha n'akara ya

  18. Nzụkọ gọọmentị etiti na ASUU amịtabeghi mkpụrụ

    Akụkọ na-ekwu na gọọmentị etiti ekweela ịmapụta ego ruru ijderi irii atọ iiji kwụ ndị nkuzi mahadum ụgwọ.

    E kwukwara na gọọmentị etiti kwere nkwa ịmefu ego ruru ijeri iri abụo n'iwulite ngalaba agụmakwụkwọ na Naịjirịa.

    Nke a pụtara ihe dịka gọọmentị etiti nakwa otu ndị nkụzị Mahadum nwechara nzụkọ imeụlọ.

    Onye ndụ ndị nkuzi bụ Biodun Ogunyemi kwuru na ọ ga-ebugara ndị otu ya nkwa ndị gọọmentị kwerela ka amara ma ọ masịrị ha tupu e nwee nkwekọrịta ọbụla.

    Adọtịkwuru nzụkọ ahụ rue ụbọchị iri abụọ na otu n'ọnwa Ọktoba.

  19. Twitter nwere nsogbu n'abali Tọzde: Lee ihe mere

    Ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa malitere iti mkpu na akara Twitter ha adịghị emekpe n'ọnụ ụtụtụ taa.

    Ndị mmadụ malitere ikwu na onwereike bụrụ na gọọmentị Naịjirịa agbachiela ya bụ ogige ịntanetị.

    Mana, ihe mere bụ na Twitter nwere nsogbu na tecknuzu ha ji arụ ọrụ.

    Ha si na ha na-agba mbọ ịhụ na mmadụ niile wetere ohere imepe akara Twitter ha na nsogbu adịghị.

    Ha kwukwara na ha ahụbị̄ghị ama na ọ bụ ndi mmadụ wakporo ha ma kpata ihe a mere.

    Ọ bụ site n'elekere iri nke abalị ka ụfọdụ ndi malitere kwuwe na ha anaghị abanwu akara Twityter ha NA naịjirịa.

    Mana ugbua, ọtụtụ sị na ọ gbapeela.

  20. Unu efoola chi?

    Anyị ji n'aka na unu tetara ọfụma!

    Dọnyerenu anyị taa maka akụkọ ndị dị ọkụ ka o si dị ọkụ.