Etu e si kpọọ nwafọ Naịjirịa ọkụ na mba Libia
Ụmụnwoke atọ batara n'ụlọọrụ ebe nwafọ Naịjirịa na-arụ ọrụ, wụọ ya mmanụ ụgbọala n'ahụ ma mụnye ya ọkụ dịka ministry ime obodo mba Libia si kwuo.
Otu United Nation sị na nke a mpụ na-enweghi isi megide ndị mbịarambịa na na Libia.
Ozi si n'aka ministry ihe na-em n'obodo n'ụbọchị Wenesde sị na a nwuchiela mmadụ atọ bụ ndị Libia e che na aka ha dị ogbugbu nwoke a.
Ha sị na ọ bụ onye akaebe kọwara etu ụmụnwoke a si bata ebe ahụ ma wakpoo ma mụnye nwoke ahụ ọkụ.
A mabeghi mpaghara onye a kpọrọ ọkụ si na Naịjirịa.