Ka ụkọchukwu onye Anglican si bụrụ onyeisiala mba
Ọ bụghịzi akụkọ na ụkọchukwu Wavel Ramkalawan meriri ntụliaka mba Seychelles nke afọ 2020.
E duru ya n'ihi ọrụ oche onyeisiala n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Oktoba, 2020.
Dịka onye ụkọchukwu ọ bụ, ozi onyeisiala Ramkalawan bụkarị maka udo, nnagide, na arịrịọ ka ndị mba Seychelles jịkọta aka ọnụ maka idi n'otu mba ahụ nakwa ịkwụsị adighị n'otu esemokwu were ọtụ afọ ndọrọndọrọ ọchịchị butere.
Mmeri ụkọchukwu a tụrụ n'anya makana ọ bụ otu pati na-achị mba ahụ kamgbe afọ 1977.
Nke a bụkwa ugboro isii ọ na-pụta azọ ọkwa onyeisiala, ije ọ malitere kamgbe afọ 1998.
Gọọmenti di iche iche akatọọla ya maka ụfọdụ ihe ọ na-ekwu n'ebe o na-enye okwuchukwu n'ụlọụka ya.
N'agbanyeghị ihe ndị a niile, ụkọchukwu Ramkalawan kwuru na otu ihe na-edu ya n'ugboro ise o na-enweteghị oche onyeisiala bụ okwu Nelson Mandela(onye na-ekwuchitere ndị mmadụ ọnụ ha) nwụrụlanụ, " Onye mmeri bụ onye na-arọ nrọ na anaghịọ awụsa ọwa ya."