You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ka ụkọchukwu onye Anglican si bụrụ onyeisiala mba

    Ọ bụghịzi akụkọ na ụkọchukwu Wavel Ramkalawan meriri ntụliaka mba Seychelles nke afọ 2020.

    E duru ya n'ihi ọrụ oche onyeisiala n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Oktoba, 2020.

    Dịka onye ụkọchukwu ọ bụ, ozi onyeisiala Ramkalawan bụkarị maka udo, nnagide, na arịrịọ ka ndị mba Seychelles jịkọta aka ọnụ maka idi n'otu mba ahụ nakwa ịkwụsị adighị n'otu esemokwu were ọtụ afọ ndọrọndọrọ ọchịchị butere.

    Mmeri ụkọchukwu a tụrụ n'anya makana ọ bụ otu pati na-achị mba ahụ kamgbe afọ 1977.

    Nke a bụkwa ugboro isii ọ na-pụta azọ ọkwa onyeisiala, ije ọ malitere kamgbe afọ 1998.

    Gọọmenti di iche iche akatọọla ya maka ụfọdụ ihe ọ na-ekwu n'ebe o na-enye okwuchukwu n'ụlọụka ya.

    N'agbanyeghị ihe ndị a niile, ụkọchukwu Ramkalawan kwuru na otu ihe na-edu ya n'ugboro ise o na-enweteghị oche onyeisiala bụ okwu Nelson Mandela(onye na-ekwuchitere ndị mmadụ ọnụ ha) nwụrụlanụ, " Onye mmeri bụ onye na-arọ nrọ na anaghịọ awụsa ọwa ya."

  2. Juventus na Barcelona ga-akwata ya n'abalịa

    N’egwuregwu, Juventus na Barcelona ga-ama okaibe na asọmpi nke Champions League na-elekere asatọ nke abalịa.

  3. Etu ndị amaghị ama si gbuo nwaanyị dị ime n'Ezinifite ka o si ahịa na-alọta.

    Ụmụada Uga dị n'Anambra Steetị eburula ngagharịiwe na mkpesa gaa n'Ezinifite maka ada nwaanyị dị ime e gburu ka o si ahịa na-alọta.

    A sị na nke a mere na Satọde ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọktoba, 2020.

    Nwaanyị a bụ onye Uga, a lụrụ n'Ezinifite dị ime ọnwa atọ mgbe ndị a maghị ndị ga bụ gburu ya.

    Nke a mere ndị ada ibe ya ji si n'Uga bịa mgbaru n'Ezinifte ebe a lụrụ ya.

    Mbọ BBC Igbo gbara inwete ozi n'aka ndị uweojii banyere nke a amịtaghị mkpụrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra bụ Haruna Mohammed azaghị ekwentị ya.

  4. A na-achọ nwaanyi tufuru nwa ya n'ọdọugbọelu dị na Qatar

    N’ofesi, gọọmenti mba Qatar sị na ha ga-etinye anya na ya bụ nyocha emere ịchọpụta nwaanyị tufuru nwaọhụrụ ya n’ikpo ahịhịa n’odougboelu dị na Doha ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba.

    Dịka ọtụtụ na-agbarụ ihu maka ya bụ nyocha, ndị ọrụ ọdọugboelu ahụ sị na-ebumnaobi ha bụ ka ha chọpụta nwaanyị kpara ya bụ arụ.

    Ha kpọbara ụmụnwaanyị niile nọ na ụgbọelụ iri n'otu ebe ịme nyocha ka ha mara onye mụrụ ya bụ nwa.

    Ndị ọrụ ahụ rịọkwara mgbaghara maka ya bụ ihe ha mere mana na-ekwu na ha ebughị n'obi ịkpasụ ndị mmadụ iwe.

    Ndị gọọmentị ha sị na ha ga-eme nyocha ịmata ka ndị ahụ siri mee ya bụ nyocha.

    Ụgbọelụ ahụ si Qatar aga Australia.

  5. Mpụtara ule Waec agaghịzị apụta taa

    Ndị ọrụ West African Examinations Council ekwuola na ya bụ mpụtara ụleakwụkwọ kwesiri ịpụta taa agaghịzị apụta maka ọgbatauhie so ngagharịiwe emere na Naịjirịa.

    Waec sị na ọ bụzị n’izuụka na-abịanụ ka ya bụ mpụtara ga-apụzi.

  6. Josep Maria Bartomeu agbaala arụkwaghịm na Barcelona

    Onyeisi Barcelona bụ Josep Maria Bartemeu agbaala arụkwaghịm ka ndị nkwado ha kwanyere ya ọkụ n’ike ka ọ pụọ agbanyeghị na ọ nabatala isonye na European Super league.

    Oteela ndị nsonso Barcelona chọwara ka Bartomeu pụọrọ ha kemgbe ya na Lionel Messi malitere ịnwe nsogbu.

    Bartomeu banyere Barcelona kemgbe afọ 2014 dịka onyeisi ha ridara ụbọchị Tuzde ya na ndị isiọrụ ndị ọzọ.

    N'okwu ikpeazụ ya, Bartomeu sị na Barca amalitela ịkwado maka Super league tupu ọ pụọ bụ nke ọ sị na ọ ga-enyere ha aka ịkpata ego n'ọdị n'ihu.

    N'izu gara aga ka BBC kwuru na amụma na-aga n'ihu maka ịmalite Lig ọzọ akpọrọ Super League ndị otu egwubọolụ nwere agba n'Uropu ga-eso gbaa bụ nke a ga-etinye ijeri pound anọ na ụma isii.

    Cristiano Ronaldo agaghị eso Juventus gbasị Barcelona bọọlụ na Champions League taa makana ọ ka bu coronavirus.

  7. Ndị ekperima abanyela ọrụ izu ohi site na ngagharịiwe a na-eme na Philadelphia

    Ndị uweojii Steeti Philadelphia dị n'Amerịka ekwuola na ndị ekperịma abanyela ọrụ izụ ngwahịa ndị mmadụ nke abalị abụọ site na ogbugbu ndị otu ha gburu nwaokorobia onyeisi ojii.

    Ha sị na a agbagburu Walter Wallace maka na ọ jụrụ ịtọgbọ mma o ji n'aka mgbe ha bịara ijide ya.

    Ndị ụmụnna Wallece sị na isi adịchaghị ya bụ nwaadị gbara afọ iri abụọ na asaa mma.

    N'abalị Tuzde ka ndị uweojii dọrọ ndị ogbe Port Richmond aka na ntị ka ha chaa n'ụzọ maka ndị ekperima banyere ọrụ izu ngwaahịa ndị mmadụ.

    Ndị ọrụ gbata gbata dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha baa ụlọ maka ya bụ ọgbaaghara si ngagharịiwe banye ihe ọzọ.

  8. Buhari ahọpụtagharịala Mahmood Yakubu dịka onyeisi INEC ruo afọ ise ọzọ

    Onyeisiala Muhammadu Buhari ahọpụtagharịala Mahmood Yakubu dịka onyeisi ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission (INEC) ruo afọ ise ọzọ.

    Onye ndụmọdụ pụrụiche Buhari na mgbasaozi bụ Femi Adesina wepụtara ozi a ma sị na nke a ga-abụ agba nke ikpeazụ Yakubu ga-eji ọkwa a n'ozi e zigara onyeisi ndị Sịnetị bụ Ahmad Lawan.

    Ọ sị na na nhọpụta a dị n'usoro iwu na-achị Naịjirịa nke afọ 1999 dịka a ghazigharịrị.

    Mana ọ sị na ọ dizi n'aka ndị ụlọomeiwu ukwu ịnabata nhọpụtagharị Yakubu.

    Onyeisiala Buhari họpụtara Yakubu n'ọkwa n'ọnwa Nọvemba afọ 2015, n'ime ọnwa isii o merichara ntulaiaka onyeisiala.

    Kamgbe Yakubu naara Attahiru Jega ọkwa onyeisi Inec, ọ haziela ọtụtụ ntuliaka na Naịjirịa gụnyere ntuliaka ukwu n'afọ 2019 e ji họpụtagharịa Onyeisiala Buhari.

  9. Unu abọọla chi eee!

    Anyị ụkpa ekele anabata unu n'ụtụtụ taa.

    Biko a hapụkwala isonye n'ọgbakọ anyị www.bbc.com/igbo maka akụkọ ndị hiri odo.

  10. Ụlọikpe na Legọs atọhapụla ụmụnwoke 47 eboro ebubo ịdịna onwe ha

    Ọkaikpe Rilwan Aikawa atụhapụla ikpe na-ebo ụmụ nwoke iri anọ na asaa ebubo na ha na-edina onwe ha.

    Aikawa kwuru na ndị gbara ha ya bụ ikpe esoghi usoro kwesiri ekwesị.

    Ndị gbara ha ikpe abịaghị ụlọukpi maka ya bu ikpe ma ha akpotaghị ndị aka ebe.

    Anwuchiri mmadụ iri anọ na asaa a maka ebubo na ha chọrọ ibanye otu ụmụ nwoke na-edina onwe ha kama ụmu nwoke a kwuru na ọ bu ihe mmemme ncheta ọmụmụ ka ha bịara.

  11. Ọ bụ ndị Ipob wakporo Ebonyi ụbọchị Monde- Umahi, Aga m eti ndị e mebiri ihe ha aka n'obi- Umahi

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi eboola ndị otu Ipob na steeti ahụ ebubo ibute ọgbaghara mere na steeti ahụ ụbọchị Monde, abali 26 nke ọnwa Oktoba, afọ 2020.

    Umahi kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'ikuku ụbọchị Tuzde kwuru na ọ bụ ndị butere ọgbaghara n'Ebonyi si n'otu obodo dị n'otu otu okpuru ọchịchị dị na steeti ahụ n'aha ndị Ipob.

    "Na Monde,abalị 2o Oktoba , ndị wakporo Ebonyi mebie ihe si ebe ọzọ.

    "Ụnyahụ bụ Tuzde, 26 Oktoba, ndị bịara bụ ndị Ebonyi si otu obodo n'otu okpuru ọchịchị n'aha ndị Ipob."

    Ọ rịọrọ ndị Ebonyi mgbaghara maka mkpamkpa ndị omwekome na ndị agboro kpara na steeti ahụ ma tie ndị ọrụ nchekwa na nddị mmadụ tụnyere ndụ ha n'ọgbaghara ahụ.

    O kwere nkwa iti ezinaụlọ ndị agboro merụrụ ahụ maọbụ gbuo n'oge ọgbaghara so ngaghariiwe EndSARS na steeti ahụ.

  12. Gere akụkọ gbasara coronavirus n'Afrịka n'otu nkeji

  13. Anyị na-enye gọọmenti Imo abalị 14 ịkwụ anyị ụgwọọnwa - NLC Imo steeti

    Ngalaba na-achịkọta ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress (NLC) nke Imo steeti enyela gọọmentị steeti ahụ ụbọchị iri na anọ (14) imezu ihe ha chọrọ maọbụ chebiri ihe ga-adapụta na ya.

    N'ozi e binyere aka nke ha zipuru, ngalaba NLC depụtara ụzọ ihe atọ na ụma ha chọrọ ka gọọmentị mezuo, nke gụnyere:

    • Ịkwụzu ụgwọ ọnwa e ji ndị ọrụ Imo steeti kemgbe ọnwa Febrụwarị
    • Ịkwụzu ụgwọ e ji ndị larala ezumike nka kemgbe ọnwa Febrụwarị
    • Ịmalite ịkwụ ụgwọ opekatampe N30,000 gọomentị etiti kwuru ka a na-akwụ ndị ọrụ Naịjiria

    Ha kwuru na ha akwenyerela gọọmentị ugwu kemgbe ọnwa Febrụwarị, mana ihe ka dị etu ọ dị.

    Lee ihe ha kwuru n'uju.

    Austin Chilakpu bụ onyeisi ha gwara BBC na kemgbe ọnwa Febrụwarị ka ha na-enwere gọọmentị ndidi ka ha nwee ike ịkwụzu ndị ọrụ na ndị larala ezumike nka ụgwọ e ji ha.

  14. Ọtụtụ ndị Igbo ekwenyeghị n'oku ịkpa oke Nnamdi Kanu- Ohaneze

    Onyeisi otu ọhaneze bụ Nnịa Nwodo ekwuola na ọtụtụ ndị Igbo akwadoghị okwu ịkpa oke maọbụ nkpusu iwe na ọnụma sị n'aka otu Ipob na onye ndu ha apụta.

    Nwodo onye kwuru nke a mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ AIT nwere ụbọchị Monde sị na ejighi ibute ọgbaghara mara ndị Igbo.

    Ọ sị, “Anụghị ebe Ipob kpọrọ oku ka e mebie akụnaụba ndị Yoruba. Mana anụrụ m ihe Ipob kwuru na-akụsu iwe na ọnụma.

    "Achọrọ m ikwu hoohaa na ọtụtụ ndị Igbo akwụnyeghịrị Ipob n'ihe ha kwuru (maka EndSARS). Ọ bụghị omenala anyị."

    "Ọ dịka ihe ga-eme na onye Igbo nwere ihe akụ na ihe enwenwe na mpaghara Naijiria dị iche iche."

    "O kwuru na ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ ekwuola na ha akwadoghị okwu Ipob kwuru."

    N'okwu akụnaụba ndị e mebiri n'ọgbaghara so ngagharịiwe EndSARS, Nwodo kpọrọ oku ka gọọmenti gụkọ ndị e mebiri ihe ha ma gbatara ha ọsọ enyemaka.

    Ọ katọrọ etu gọọmenti ji jiri aka ike so ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe maka mkpagbu n'aka ndị uweojii.

  15. Legos agbapeela ahịa niile dị na steeti ahụ

    Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu, enyeela ntụziaka ka emepe mkapmkpam ahịa niile dị na steeti ahụ.

    N'akwụkwọ mgbasaozi nke Kọmishọna na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo bụ Wale Ahmed wepụtara ụbọchị Tuzde, o kwuru na ahịa niile mama nke nri ma na ndị ọzọ enweela ohere impe kwa ụbọchị.

    Cheta na gọọment tinyeburu ụbọchị ahịa nri na-azụ iche ma tinyekwa ụbọchị ngwa ndị ọzọ na-abụghị nri na-azụ iji mgbochie nkesa ọrịa coronavirus.

  16. 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado Agha Biafra'

  17. 'Onye ga-atụpụrụ Nnamdi Kanu ọnụ maka 100 million o tinyere n'isi gọvanọ Wike?'

    Kọmishọna mgbasa ozi gọvanọ Rivers State bụ Paulinus Nsirim ekwuola na gọọmenti Rivers State agaghị atụpụrụ onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ọnụ maka okwu naira nde 100 o tinyere n'isi gọvanọ Nyesom Wike.

    Ọ kwuru na ọ ka na-agbagoju ya anya etu ndị ntaakụkọ si buru akụkọ ahụ na-efesa ma na-achọ ka ha nụ n'ọnụ gọọmenti Rivers State gbasara ya.

    Cheta na Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steetị enyela ndịisioche okpuruọchịchị dị na steetị ahụ iwu ka ha nwuchie ndị Ipob niile nọ n'okpuruọchịchị ha.

    Nke a na-abia dịka nso nso a na ọgbaghara dapụtara n'Oyigbo dị na steetị ahụ n'etiti ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa ebe Ipob fere ọkọlọtọ ha.

  18. Onye bụ Amy Coney Barett?, Ihe anyị maka Amy Coney Barett bụ ọkaikpe ọhụrụ nke ụlọikpe kachasị na mba Amerịka

    Ụlọomeiwu mba Amerịka ahọpụtala Amy Coney Barett dịka onye ga-anọchi n'ọkwa nke Ruth Bader Ginsburg hapụrụ mgbe ọ nwụrụ.

    Nke a mere n'ime naanị otu izuụka tupu e mee ntụliaka ọkwa onyeisiala na mba ahụ.

    Ndị otu Republican tụnyere vootu ihe pụtara 52-48 iji meri otu Democrats na-achọghị ka o rite ya bụ ọkwa.

    Onye bụ Amy Coney Barett?

    • Amy Coney Barrett bụ onye ọkwaiwu
    • Ọ nwetara ọzụzụ ịbụ onye ọkaiwu na Mahadum Notre Dame
    • Ọ na-aka ụka katọlịk ma kwuo na ọ gaghị akwụsị ya ịrụ ọrụ ya ọfụma
    • O nwere ụmụ asaa, abụọ n'ime ha bụ ndị o si mba Haiti zụpụta.
    • Ya na di ya bi n'obodo South Bend Indiana.
    • O kwenyere na ị gụpụta iwu ala dịka e si dee ya n'agbanweghi ihe ọbụla iji sonye oge a nọ na ya.
  19. Gọvanọ Wike enyela iwu ka a chọpụta ndị Ipob niile nọ na Rivers Steetị

    Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivas Steetị enyela ndịisioche okpuruọchịchị dị na steetị ahụ iwu ka ha nwuchie ndị Ipob niile nọ n'okpuruọchịchị ha.

    O dọrọ aka na ntị na onyeisioche ọbụla hapụrụ ndị Ipob ka fee ọkọlọtọ ha n'okpuruọchịchị ga-anata ntaramahụhụ.

    Wike kwuru nke a mgbe ya na ndịisioche okpuruọchịchị, ndịisi obodo, ndị ntoroọbịa na ndị obodo nwere mkparịtaụka na Pọtakọtụ na Mọnde.

    Ọ sị na Rivas Steetị bụ obodo udo na-anabata onye ọbụla na-agbanyeghi agbụrụ onye ahụ si pụta na ha agaghị anabata ka Ipob mebie steetị ya.

    "E nwere otu a sị na-eyi ndụ egwu a kpọrọ Ipob". Ọ bụghị m kpọrọ ha ndị oyi ndụ egwu, ọ bụ ụlọikpe kpọrọ otu na-eyi ndụ egwu.

    Wike nyekwara iwu sị ka a majakwala onye Igbo ọbụla na-aga mkpa ya n'ụzọ ziri ezi na-enweghi nsogbu ọbụla.

    Cheta na nso nso a na ọgbaghara dapụtara n'Oyigbo dị na steetị ahụ n'etiti ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa ebe Ipob fere ọkọlọtọ ha.

  20. Unu apụtala ụtụtụ?

    Ọ bụ ebe a ka anyị dopuru iche ịwetara unu akụkọ ndị dị mkpa taa.

    Jisinuike sonye anyị na-eleghi anya n'azụ.

    Yagazie.