Ihe ị kwesịrị ịma maka CSP Catherine Ugorji nwereike irite 'Nwaanyị uweojii nke afọ a' nke UN, CSP Catherine Ugorji esepụtala isi dịka onye nwereike irite 'nwaanyị uweojii nke afọ a' nke UN
Onye bụ CSP Catherine Ugorji a onye ọbụla kpụ n'ọnụ?
Catherine Ugorji nwereike irite nturuugo nke "Nwaanyị uweojii nke afọ a", n'aka ngalaba mbaụwa bụ United Nations (UN).
Ọ bụ otu n'ime ụmụnwaanyị abụọ (onye nke ọzọ bụ Rebecca Nnanga nke mba Kamerun) a họpụtara maka ya bụ nturuugo, n'ime 21 a họpụtaburu.
Ugorji so na ndị uweojii Naịjiria na-arụ n'okpuru UN Multidimensional Integrated Stabilization Mission in Mali (MINUSMA).
Ugorji bụ otu n'ime ụmụnwaanyị 477 ndị ọrụ nchekwa na-achịkọta udo na mba Mali.
Luis Carrilho bụ onye ndụmọdụ n'ihe gbasara ndị uweojii nke ngalaba UN kwuru na odudu Ugorji enyerela aka ibelata mpụ na mpaghara Gao bụ ebe ọ na-achịkọta na mba Mali.
Lee ihe Kamerun kwuru maka Nnanga