Gọvanọ Abdullahi Umar Ganduje nke Kano steeti achụọla onye ndụmọdụ ya bụ Salihu Tanko Yakasai maka ide ihe na soshal midia na-akatọ onyeisiala Muhammadu buhari.
Kọmishọna mgbasa ozi nke Kano steeti, bụ Muhammad Garba, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi nke o wepụtara n'ụbọchị Sọnde.
Dịka ngagharịiwe maka mmekpa ahụ ndị uweojii na-aga n'ihu, Yakasai kwuru na ọ dị nnukwu mwute etu onyeisiala si agba nkịtị mgbe ndị mmadụ na-ekwupụta etu ihe si ara ha ahụ na Naịjirịa.
O kwuru sị: "Ugboro ugboro, ị gaghị ewepụta naanị nkeji ise iji gwa ndị mmadụ ka ha wetuo obi. Ndị mmadụ i mere njem gaa steeti iri atọ n'isii na-arịọ ha ka ha tụnyere gi vootu. Ihe a na-agbawa obi."
Yakasai gara n'ihu kwuo sị: "Ihe ọbụla ị na-eme na ndụ a, ekwekwala ka olu gi fuo. Kwusie okwu ike megide ihe ọjọọ, kwusie okwu ike banyere ihe i kwenyere na ya. Ekwekwala ka ọkwa ị nọ na ya nwa mgbe nta gbochie gi ịkwụnyere ndị nke gị."
Dịka kọmishọna mgbasaozi nke Kano steeti si kwuo, Yakasai akọwaala na ihe o kwuru bụ uche aka ya, ọbụghị ihe gọvanọ Ganduje sị ya kwuo.
Mana Muhammad Garba kwuru na "dịka onye na-ekwuchitere gọvanọ, ụfọdụ ndị mmadụ agaghị ama mgbe Yakasai na-ekwu uche ya maọbụ mgbe ọ na-ekwuru gọọmentị kano steeti."