You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ezenwaanyị Elizabeth etunyela Rashford ugo pụrụ iche

    Ezenwaanyị Eliza etunyela ọgba bọọlụ ndị Manchester United bụ Marcus Rashford ugo pụrụ iche maka mbọ ọ gbara inye ụmụaka onweghị ka ọ ha ha nri, n’oge a kpọchiri obodo maka ọrịa covid-19.

    Nturu ugo bụ nke Bekee kpọrọ ‘Member of the Order of the British Empire’ (MBE).

    Rashford tinyere ego ya ma kpọkwaa oku ka ndị mmadụ tụkọta ego iji na-enye ụmụntakịrị nri.

    Dịka a malitere ịgbape obodo obere obere, Rashfor gakwara n'ihu n'atụmatụ ahụ ma rịọkwaa gọọmentị ka ha tinye aka.

    Oge Rashford malitere atụmatụ a, o bu n'obi na ndị mmadụ ga-etinye aka tụkọta otu narị puku paụnd (£100,000), mana ka ọ dị ugbua, ego a tụkọtara agafeela nde paụnd iri abụọ (£20 million).

  2. Burna Boy etinyela ọnụ n'okwu maka ịkwụsị SARS

    Otiegwu aha ya na-ewu n'ụwa niile bụ Burna Boy etinyela ọnụ ya n'okwu gbasara mmekpa ahụ ndị uweojii na-emekpa ndị mmadụ na Naịjirịa.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ya maka ịgbachị nkịtị kamgbe ngagharịiwe malitere ịrị ibe ya elu maka nke a.

    O kwuru na ya agaghị agbachị nkịtị gbasara nke a n'ihi na ya bụ ihe jọgburu onwe ya.

    Burna Boy gara n'ihu kwuo sị: "Ihe kacha m mkpa ugbua bụ ka ndị ka e mechie ngalaba ndị uweojii a bụ SARS."

    "O doro m anya na ihe a na-emebu na mbụ bụ ịgbanwe aha ha, nye ha aha ọhụrụ, mana ugbua, ihe anyị chọrọ bụ ka e mechie ya kpamkpam."

    Burna boy kelere ndị niile sonyere na ngagharịiwe na-aga n'ihu na steeti dị icheiche na Naịjirịa ugbua.

    O kwukwara na ya ga-ewepụta ego iji nyere onye ọbụla merụrụ ahụ na ngagharịiwe a aka.

    Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya ga-emepe ngalaba ga-enye aka ịkuziri ndị na-eto eto maka ntọala Naịjirịa nakwa Afrịka.

    Burna Boy kpọpụtara aha ụfọdụ ndị akụkọ kwuru na ha nwụrụ n'aka ndị uwe ojii ma kwuo na agaghị echefu aha ha.

  3. Ndị uweojii ejirila egbe kụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe na Ogbomosho

    Ihe onyonyo pụtara na soshal midia na-akọwa na ndị uweojii ji mgbọ egbe chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe maka mkagbụ ha na-ebo ndi uweojii SARS n'Ogbomosho di n'Oyo steeti.

    Otu onye nọ oge ihe mere gwara BBC na mgbo egbe tụrụ otu onye mana ya akpọrọla ya gaa ụlọ ọgwụ.

    Onye ahụ zitere BBC ihe onyonyo gosiri ebe a ba-acho ịzọ onye bu akpa yiri nke mgbọ egbe.

    Ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Oyo steeti Fadeyi Olugbenga gwara BBC na onweghi onye ọbụla ha gbara egbe, ma kwụọ na ọ bụ anwụrụ anya mmiri ka ha jiri kụsasịa ndị a na-eme ngagharịiwe.

  4. Emebiela ọtụtu ihe dịka ọgbaghara dara n'etiti ndị Awụsa na Yoroba n'Ikorodu dị na Legọs

    Mpaghaara obodo Igbo-Olomu dị n'Isawo-Agric nke di n'okpuru ọchịchị Ikorodu, na Legọs steeti chiobi ha n'aka dịka ọgbaghara dara n'ebe ahụ ụbọchị Fraịde.

    Onye ntaakụkọ BBC bi n'ogige ihe a na-me kwuru na ebe niile juru oyi ugbua dịka ndi mmadụ nọ na-ezere isi ha n'ime ụlọ ha.

    Akụkọ na-ekwu na nsogbu a malitere n'ụbọchi Monde dịka ikorobia ụfọdụ si agbụrụ abụọ a lụsịrị onwe ya ọgụ n'ebe ahụ.

    Ugbua, ọkụ ndị a na-ese okwu mụnyere agbaala ọtụtụ ọdọ ahịa.

    Ihe onyonyo ndi mmadụ tinyere na soshal midia na-egosi oge ọgbaghara ka dị ọkụ, dịka nke a etinyere na Twitter n'ụbọchị Tọzde.

  5. Algeria adụnyela Naịjirịa otu ọnụ akara n'asọmpi enyi na enyi

    Otu egwuregwu bọọlụ mba Ọjerịa ji otu ọkpụ goolu anasataghị merie ndị Super Eagles nke Naịjirịa n'asọmpi enyi na enyi ha gbara na Fraịde.

    Goolu a bịara n'ime nkeji isii a malitere asọmpi a site n'aka Ramy Bensebaini nke Ọjerịa.

    Naịjirịa nwara ike ha ịsa goolu a mana ndị Ọjerịa fooro ntụtụ taa sị na nke a agaghị eme, ebe na Naịjirịa kwechikwara nke ga.

    Nke a bụ asọmpi mbụ oche goolu ndị Naịjirịa bụ Maduka Okoye na-amalite.

  6. Agwaala onyeisi ndi uweojii ka ọ mee ihe maka SARS - Buhari

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwuru na ya na onyeisi ndi uweojii bụ Muhammed Adamu zutere n'obi gọọmentị n'Abuja maka okwu ngalaba uweojii a na-akpọ SARS.

    Buhari sị na ya agwaala maazị Adamu ka ọ gbaa mbọ lebanye anya n'okwu ndị ntoroọbịa na-eme ngagharịiwe na-eme banyere mmekpa ahụ ha na-ebe ndị ọrụ uweojii SARS.

    Buhari sị na ya enyela iwu ka anwụchie onye uweojii ọbụla aka ya dị n'ajọ ihe ndị a na-ebo ndị SARS.

    Ọ rịrịọ arịrịọ ya ndi mmadụ nwee ume ala dịka ha na-eme ngagharịiwe n'udo.

  7. Unu asaala chi?

    Anyị na-enye unu ekene pụrụ iche dịka unu na-esonye anyị taa.

    Akụkọ pụrụiche ga-esi ebe ruo unu aka.

    Ya gazie.

  8. Ka chi fo

    Ụmụ Igbo, anyị ga-akwụsị ebe a taa.

    Ka chi fo nụ.

  9. Ndi amakaekwu agbabuola onye omeiwu na mba Gana

    Na Ghana akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị omekome gbagburu otu onye omeiwu mba ahụ.

    Ndị ajọ mmadụ a gbagburu Ekow Quansah Hayford n'ụzọ ebe o sị emume ịchụnta votu patị ha alọta n'isiututu Fraịde.

    Akụkọ kwuru na ndị amakaekwu mmadụ isii ji egbe nwakporo ya bụ nwaamadị na-anọchị anya ndị Mfantseman ka ọ na-alọta ebe elekere nke mbụ ụtụtụ Fraịde.

    Ọbaozi ntaakụkọ ndị Joy Online si na ya bụ nwaamadị kọwaara ha onwe ya tupu ha agbaa ya ọnụ egbe abụọ sị ya na ọ bụ ya bụtere nsogbu dị na Gana.

    Redio Citi Fm kwukwara na ha gbakwara draịva ya egbe, mana ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua. Onweghị ihe metutara mmadụ atọ ndị ọzọ so ha.

    Cheta na ntuliaka ndị Gana na-abịa n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba.

  10. Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe na Malawi

    Ọzọ dịka ibe ya, n'Afrịka, bụ na ndị mmadụ emeela ngagharịiwe maka ihe ha kpọrọ ịkpaoke ụmụnwaanyị n'owuweọrụ na gọọmentị Malawi.

    Ndị mere ya bu ngaghịiwe sị na onyeisiala ha bụ Lazarus Chakera eweghị ụmụnwaanyị n'ọrụ dịka iwu kwesiri.

    Iwu be ha kwuru na ọnweghị ụmụnwoke maọbụ ụmụnwaanyị ga-akarị pasent iri isii n'ọchịchị ebe ha si na ụmụnwaanyị nọ n'ọchịchị erughị pasent iri atọ.

    Ndị kpokobara ya bụ ngaghrịiwe bụ ndị Women’s Manifesto Movement sị na onyeisiala ha anaghị eme ihe ha turu anya.

    Nke a mere ka onyeisiala ha si njem abali atọ o mere na Tazania gbalata na mberede.

  11. Ụlọikpe na Port Harcourt amaala onye mgbuisi, Gracious David-West, ikpe ọnwụ

    Ụlọikpe na Port Harcourt, River steeti, ekpebiela ikwugbu ya bụ nwaamadị na-egbu ụmụagbọghọ na họtelụ n'Igweọcha, River steeti.

    E kpere David-West ikpe ọchụ n'isi ụmụnwaanyị itoolu ya na ịkpankata igbu onye ọzọ.

    Onye okaikpe kpebiri ya bụ ikpe bụ Jọstis Adolphus Enebeli kpebiri na ọ bụ Graciuos David-West gbara afọ iri anọ gburu Maureen Ewuru, Jennifer Nwokocha, Blessing Effiong Linda Warifa Samuel, Dorcas Francis, Kelechi Bridget, Onuoha Rose, Samuel Anthonia Ibe ma kpakwaa nkata igbu Benita Etim.

    Ikpe David-West malitere na Pọtakọtụ kemgbe ọktoba 2019 mgbe ndị uweojii kpaara ya aka n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa ahụ.

    Onweghị onye gosiri onwe ya maka ịgwado David-West maọbụ ndị o gburu kemgbe ya bụ ikpe malitere.

    Onweghịkwa ndị bịara iburu ozu ụmụnwaanyị ndị ahụ n'ụlọ ndowe ozu.

  12. Ndị uweojii na-achọ onye otu ha gbara nwaanyị egbe n'ọnụ na Legọs

    Ndị uweojii na Legọs ekwuola na onye gbara nwaada Joy Eze egbe n'ọnụ na Legọs bụ onye otu ha anaọghị n'ọrụ oge ọ kpara mkpa mkpa a.

    N'ozi ha tinyere n'akara Twitter ha, ndị uweojii Legọs sị na onye uweojii a aha ya bụ Eze Aiwansoba gbara Eze egbe n'ọnu ka ha na-ese okwu.

    Ndị Uweojii sị na mmadụ abụọ a nwere mmekọrịta.

    Joy Eze na-anata ọgwụgwọ n'ụlo ọgwụ ebe a na-achọ Maazị Aiwansoba achọ.

  13. Ǹdị uweojii ejirila anwụrụ anya mmiri chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe maka SARS n'Abuja

    Ndị na-eme ngagharị iwe maka ngalaba uweojii Bekee kpọrọ "Special Anti Robbery Squad" (SARS).

    N'akụkọ ha tinyere na soshal midia gosiri ebe e ji anwụrụ anya mmiri achụsasị ndị na-eme ngagharịiwe n'Abuja.

    Nke a na-abịa dịka ndị na-eme ngagharịiwe gburu otu onye uweojii n'Ughelli dị na Delta steeti, dịka ndị uweojii siri kwuo.

  14. FBI akụsaala otu chọrọ ịtọrọ Gọvanọ obodo Michigan

    Ngalaba nchekwa na nyocha nke mba Amerịka bụ Federal Bureau of Investigation bụ FBI n'aha ịchafụ ya ekuwola na ha ejidela otu chọrọ ịtọrọ ma wepụ Gretchen Whitmer dịka Gọvanọ steeti Michigan.

    Whitmer na-akpasu ọtụtụ ndi mmadụ iwe bụ ndị na-ekwenyeghị na coronavirus dị, dịka o tinyere iwu ụfọdụ si siri ike maka nchekwa coronavirus.

    Ndị ọrụ gọọmentị sị na mmadụ isii a bụ ụmu nwoke kpara nkata ijide Whitmer ma kpee ya ikpe adịgboroja maka ebubo imegide mba Amerịka.

    Mmadụ isi a bụ Adam Fox, Barry Croft, Kaleb Franks, Daniel Harris, Brandon Casert na Ty Garbin bụ ndị agbara akwụkwọ n'ụloikpe maka ịbụ otu oyi egwu na iso na otu ọjụọ.

  15. Atụmatụ 'World Food Programme' eritela ntụrụgo Nobel Peace Prize nke afọ 2020

    Kọmịtị na-ahụ maka ntụrụgo World Food Programme enyela atụmatụ akpọrọ 'World Food Programme' nturugo ahụ nke afọ 2020.

    Ha kwuru na atụmatụ ahaụ gbara mbọ ịkwụsị ndị mmadụ iji agụrụ ebute nkewa na agha n'eitit ndị mmadụ.

    Otu onye na-ekwuchitere otu ahụ kwuru na ọ bụ "oge afọ ojuju" dịrị ha.

    Echere na atụmatụ ahụ akpọrọ WFP na-enyere ihe ruru nde iri itoolu na asaa aka na mba ụwa ruru iri asatọ na asatọ n'ụwa.

    Nturugo ahụ pụtara Krona nde iri.

  16. Ndị na-eme ngagharịiwe egbuola otu onye ụweojii na Delta

    Ndị uweojii ebola ndị na-eme ngagharịiwe na Delta steeti ebubo ịgbu otu onye nke ha ma zurukwa otu egbe AK-47.

    Ha kwuputara nke a n'akara Twitter ha ma kpoo oku ka ọgbaghara na mwakpo si na ngagharịwe a mapụta kwụsị kpam kpam.

    Onyeisi ndị uweojii bụ M.A. Adamu katọkwara mwakpo na mmebi ngwa ọrụ ndị uweojii nke mere n'obodo Ughelli dị na steeti ahụ.

    Cheta na ọ bụ ihe onyonyo si n'Ughelli pụta n'ụbọchị satọde gosiri ebe ndị uweojii wakporo otu onye ntorọbịa ma buru ụgbọala ya gbapụ bụ ihe malitere ngagharịiwe na-eme ebe niile na Naịjirịa ugbua.

  17. Nigeria v Algeria ga-akpọtụ taa

    Ọ bụ taa ka Super Eagles nke Naịjirịa na Desert Foxes nke mba Algerịa ga-asọkọta mpi n’asọmpị enyi na enyi .

    Egwu dike na ibe ya ahụ ga-amalite n’elekere asaa na nkeji iri atọ nke mgbede na Naịjirịa.

    Cheta na akụkọ na-efegharị bu na mmadụ anọ n'ime ndị Super Eagles butere ọrịa coronavirus mana otu na-elekọta bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF pụtara kọwaa na ọ bụghị eziokwu.

  18. Kọmịshọna uweojii nke Imo steeti akatọọla onye uweojii tiri ndị na-eme ngagharịiwe ihe

    Kọmịshaọna uweojii nke Imo steeti bụ Issac Akinmoyede akatọọla agwa onye uweojii kpara dịka o tiri ndị na-eme ngagharị iwe nke #EndSARS ihe.

    Ihe onyonyo gosiri ya bụ onye uweojii ebe ọ mara ndị na-eme ya bụ ngagharịiwe ụra n'ụbọchi Tụzde.

    Akinmoyede kwuru na ya bụ agwa abụghị agwa ziri ezi onye uweojii kwesịrị ịkpa.

    O kwukwara na ya bu onye uweojii ga-erite ntaramahụhụ dịrị ya maka agwa ọ kpara.

    Akinmoyede gwara ndị mmadụ ka ha mee ngaharịịwe ha n'ụzọ ziri ezi.

  19. Ndị na-eme ngagharịiwe maka SARS nọbọrọchi n'ihu Ụlọ Omeiwu Legọs

    Ndị na-eme ngagharịiwe maka ngalaba uweojii Bekee kpọrọ "Special Anti Robbery Squad" (SARS na Legọs rarụrụ n'ihu Ụlọ Omeiwu steeti ahụ dị n'Alausa.

    Ọtụtụ n'ime ha sị na ha agaghị ala be ha ma ya bụrụ na ha ahụghị isi ihe ha na-achọ.

    Dịka ụfọdụ sonyere ngagharịiwe otiegwu RunTown na Falz haziri n'ehi na mpaghara akwa etiti Legọs, ndị nke mere nke ha na mpaghara steeti ahụ Bekee na-akpọ "Legọs Mainland".

    Onye na-akpa ọchị eji Mr Macaroni mara so n'ime ndi a rarụrụ n'ezi.

    N'agbanyeghi na ha sị na ndị uweojii bịara buru oche, ngwa egwu nakwa mkpuchi miri ha jiri nọdụ ebe ahụ, ndị ntoroọbịa a sị na ha ga-anọdụ ruo oge chi foro.

  20. Unu asaala chí

    Igbo bụ Igbo! Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị.