Dịka a na-akwado ịmepe akwụkwọ, otu jikọtara ndị nkuzi mahadum bụ ASUU nakwa ogbo ha bụ NASU n'aha ịchafụ
ekwuola ooloo, na aha agaghị eso mepee akwụkwọ n'izuụka na abịa n'afọ efu.
Onyeisi ndị
otu Academic Staff Union of Universities (ASUU) bụ Biodun Ogunyemi kwuru na
eziokwu atọgbọghị na ya bụ nkwa gọọmentị etiti kwere ha maka ịkwụ ha ụgwọ ọnwa.
Ogunyemi kpọrọ okwu aha n'isi onyeisi okwu mgbakọ ego Naịjirịa dị n'aka bụ Ahmed Idris bụ onye ha sị na ọ bụ ya mebiri iwu Onyeisiala, Muhammadu Buhari, nyere maka ịkwụ ha ụkwọ ha.
Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị gọomenti kwadoo maka ogologo abụbụ ọrụ n'aka ndị nkuzi mahandum maka otu ha sịghi were ọrụ ha kpọrọ ihe.
Ndị otu a malitere abụbụ ịdọ aka na ntị nke izuụka abụọ ụbọchị Monde maka gọọmentị ikpọ ekwo nkụ tinye ha na usoro IPPIS bụ usoro gọomenti chọrọ iji na-akwụ ha ụkwọ ọnwa bụ nke ha sị na ọdabachaghị.
Nke a na-abịa dịka Minista agụmakwụkwọ na Naịjirịa bụ Adamu Adamu nyereikike ụbọchị Fraịde ka ụlọakwụkwọ niile mepee ụbọchị Monde bụ ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa ọktoba dịka ha mechichere kemgbe ọnwa Maachi afọ a maka COVID-19.
Mana tupu mmechi a abịa, gọomentị na ASUU na-akwakọrịta mpị gbasara usoro IPPIS bụ nke ha sị na ọ ga-eme ka gọọmenti kpanye ha n'abụ.
Onyeisiala Buhari enyebuola iwu ka etinye ndị ministri niile na ndị ọrụ ndị ọzọ na ya bụ usoro akwụmụgwọ ọhụrụ iji belata oshi na nururu aka n'akwụmụ ụkwọ ndị ọrụ.
ASUU sị na ha degaare gọomenti akwụkwọ n'Ọgụst ka ha nye ha ohere ịhụ usoro nke ha wepụtere maka ịkwụ ụkwọ onwa ha bụ nke ha kpọrọ University Transparency Accountability Solution.
Ọ sị na gọomentị azaghị ya bụ oku ruo ụbọchị iri atọ nke ọnwa Septemba dịka ha bu n'obi ịkpasasi ya bụ usoro nke ha weputere.
Gọọmentị ka na ekwukwa na ọnweghịzị onye nkuzi ha ji ụkwọ dịka Minista agụmakwụkwọ nke nta bụ Chukwuemeka Nwajiuba si kwuo, ma kwukwa na ndị nkuzi niile nọzị na IPPIS ka ọ dị ugbua.