Ego ole ka ọ na-ewe iji zọọ ọkwa onyeisiala Nigeria?

Collage of images of Bola Tinubu, Atiku Abubakar, and Peter Obi
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Dịka ịchụnta vootu maliterela maka ntuliaka na Nigeria n'afọ 2027, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche na-emefu nnukwu ego iji chụọ nta vootu, mana ajụjụ ọtụtụ na-ajụ bụ, 'ego ole ka o na-ewe iji zọọ ọkwa onyeisiala na Nigeria?

Ọtụtụ ihe na-eri ego n'ịchụnta vootu gụnyere mgbasaozi ahịa, nhazi ọgbakọ ịchụnta vootu, mgbagharị, ịkpokọta ndị mmadụ, nhazi maka ụbọchị ntuliaka kpọmkwem, na ihe ndị ọzọ.

Ajụjụ gbasara ego ole ọ na-ewe iji zọọ ọkwa onyeisiala Nigeria bụ ihe na-agbalite kwa oge ọbụla a na-eme ntuliaka, ọ bụkwa ajụjụ nke ụfọdụ ndị ọkachamara kwenyere na onweghị otu onye nwere ike iza ya hoohaa.

Mana akụkọ a ga-ele anya n'etu otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche na ndị na-azọ ọkwa ọchịchị si enweta ego ha ji achụ nta vootu, ihe iwu kwuru gbasara ego ole e kwesịrị imefu n'ịchụnta vootu, ego ole ụfọdụ ndi zọrọla ọchịchị mefuru, nakwa ndị ọ bụ ọrụ ha ị na-eleba anya n'iwu gbasara mmefu ego n'ịchụnta vootu.

Etu e si enweta ego maka ịchụnta vootu

Otu ndọrọndọrọ dị icheiche nwere ụzọ dị icheiche ha si enweta ego make ịchụnta vootu n'oge ntuliaka. Ụfọdụ n'ime ha gụnyere:

  • Ire akwụkwo 'form' maka ndị chọrọ ịzọ ọkwa'
  • Onyinye sitere n'aka ndị ọgaranya na ndị ide ji ego
  • Ntụkọta ego ọha obodo

I ji maa atụ, otu ndọrọndọrọ 'All Progressives Congress APC' nwetara ijeri kwuru ijeri naịra site n'ire 'form' maka ndị chọrọ ịzọ ọkwa.

Ndị chọrọ ịzọ ọkwa ụlọomeiwu steeti na APC kwụrụ nde naịra isii iji zụta 'form', nke ahụ bụ ego kacha nta ndị chọrọ ịzọ ọkwa n'APC kwụrụ. Maka ọkwa onyeisiala nke Bola Tinubu na-azọ, ego ole ọ kwụrụ i ji zụrụ akwụkwọ bụ nde naịra 100.

Ndịisi pati APC kwuru na ọnụọgụgụ ndị zụrụ akwụkwọ iji zọọ ọkwa na pati ha dị 2,980. Ọ bụrụ na ha niile zụrụ nke ọnụahịa ya kachasị nta bụ nde naịra isii, pati APC gaara enweta ijeri naịra 17.

Otu a ka ọ dịkwa na pati ndị ọzọ, dịka otu Africa Democratic Congress ndị rere akwụkwọ maka ịzọ okwa onyeisiala na pati ahụ ọnụego dị nde naịra 90, ebe ndị otu Nigeria Democratic Congress rere nke ha ọnụego dị nde naịra 60.

Ọzọkwa, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ahazikwa atụmatụ dị icheiche ebe ha na-akpọkọta ndị ọgaranya na ndị oji ego achụ ego ka ha bịa tụkọtara ha ego maka ịchụnta vootu.

Ọtụtụ oge, ndị ọgaranya anaghị ekwe akpọpụta aha ha maọbụ ego ole ha na-enye, mana e nwekwara ndị na-akpọpụta ego ole ha na-enye, dịka na 2018 mgbe ide ego bụ Arthur Eze nke Anambra Steeti kwupụtara na ya na-enye otu ijeri naịra iji kwado Dave Umahi onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'Ebonyi Steeti n'oge ahụ.

Nke ọzọ bụ ntụkọta ego ọha nke a kpọrọ 'crowdfunding' na bekee. N'afọ 2022, pati APC wepụtara otu akụrụngwa 'mobile app' nke ha kpọrọ 'Bless Me', bụ nke ha ji rịọ ụmụ Naịjirịa ka ha tụọrọ ha ego nke Tinubu ga-eji kwado ịchụnta vootu ya n'afọ ahụ.

APC mechara kwuo na ha nwetara ihe karịrị nde naịra 190 n'ime nkeji olemole ha ji wepụta akụrụngwa ahụ.

Otu 'Labour Party' jikwa ntụkọta ego ọha nweta ego iji kwado onye zọọrọ ha ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 bụ Peter Obi. Aisha Yesufu bụ onye nkwado Obi kwuru na ha nwetara ihe ruru nde naịra 595 site n'ụzọ dị otu a.

Ihe iwu kwuru maka ego ole e kwesịrị imefu n'ịchụnta vootu?

Ngalaba 92 nke iwu ntuliaka Nigeria kwuru na onye na-azọ okwa onyeisiala agaghị emefu karịa ijeri naịra 10 n'ịchụnta vootu.

Maka ọkwa ndị ọzọ, lee ihe iwu ahụ kwuru:

  • Ọkwa Gọvanọ - ijeri naịra atọ
  • Ọkwa Sinetọ - nde naịra 500
  • Ọkwa ụlọ omeiwu nta - nde naịra 250
  • Ọkwa ụlọ omeiwu steeti - nde naịra 100
  • Ọkwa onyeisi okpuruọchịchị - nde naịra 100
  • Ọkwa 'councillor' n'okpuruọchịchị - nde naịra 10

Iwu ntuliaka Nigeria kwukwara na onweghị onye maọbụ otu nwere ikike inye onye na-azọ ọkwa ọchịchị nkwado ego karịrị nde naịra 500.

Chetakwa na ọnụego ndị a bụ dịka mmegharị iwu ntuliaka nke afọ 2026 siri dị, tupu oge a, iji maa atụ n'afọ 2023, onye na-azọ ọkwa onyeisiala enweghị ikike imefu karịa ijeri naịra ise n'ịchụ nta vootu.

Ego ole ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mefuru na ntuliaka ndị gara aga?

Statistics showing how di Labour Party bin spend over 1.395 billion naira for di 2023 presidential election campaign
Nkọwa foto, Iwu kwuru na otu ndọrọ ọchịchị ọbụla ga-enye ngalaba nhazi ntuliaka bụ Inec atụmatụ mmefu ego ha n'oge ntuliaka ọbụla, mana otu 'Labour Party' bipụtara nke ha n'afọ 2023

Onweghị ụzọ doro anya e si amata ego ole otu ndọrọndọrọ maọbụ ndị na-azọ ọkwa ọchịchị na-emefu n'oge ntuliaka.

Ọ bụ ngalaba nhazi ntuliaka bụ Indepedent National Electoral Commission (Inec) ka ọrụ ahụ dịịrị itinye anya ma mata ma ndị otu ndọrọndọrọ ọchị a na-erubekwa isi n'ihe iwu kwuru.

Mana ụfọdụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ji aka ha bipụtara oha obodo ego ole ha mefuru n'oge ntuliaka 2023.

Otu n'ime ha bụ bụ ndị 'Labour Party', nke onyeisi haziri etu ego si batara ha bụ Aisha Yesufu kwuru na ha mefuru ihe dịka otu ijeri naịra na ụma (1.395 billion) maka ntuliaka ahụ.

Nke a gụnyere nde naịra 744 ha mefuru n'ụlọikpe maka ikpe soro ntuliaka ahụ.

Pati ọzọ bipụtakwara etu ha si mefu ego n'ịchụnta vootu n'afọ 2023 bụ otu African Action Congress (AAC) nke onye zọọrọ ha ọkwa onyeisiala bụ Omoyele Sowore.

Ha kwuru na ha mefuru ihe dịka nde naịra 40 maka ntuliaka ahụ.

Etu Inec si agbado anya n'ego a na-emefu n'ịchụnta vootu?

Dịka iwu ntuliaka si kwuo, Inec na otu ndọrọndọrọ dị icheiche ka ọ dịịrị ịgbado anya mara ego ole a na-emefu n'oge ịchụnta vootu, iju hụ na ọ gafeghị ihe iwu kwuru.

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị nwere ọnwa isii ma ntuliaka gachaa iji dekọọ ma gbakọọ ego niile ha mefuru na ntuliaka ahụ ma degara Inec akwụkwọ nke onyeisi pati ahụ na onye mgbakọ ego ha ga-ebinye aka na ya, ha ga-ewetakwa akwụkwọ ụlọikpe gosiri na ihe ha depụtara bụ eziokwu.

Ntaramahụhụ dịịrị pati ọbụla na-enyefeghị Inec ozi ahụ n'ime ọnwa isii bụ nha nde naịra 10 maọbụ nha otu nde naịra maka ụbọchị ọbụla ruo mgbe ha mere ihe iwu kwuru.

Mana iwu a ekwughị ma Inec e kwesịrị ibipụta akwụkwọ ozi ahụ ka ọha na eze soro hụrụ.