Afcon ikpeazụ ga-abụ n'ụlọikpe - ọ bụ Morocco ka ọ bụ Senegal ga-abụ ndị mmeri?

Ebe foto si, AFP via Getty Images
- Onye dere ya, Ian Williams
- Ndị mere akụkọ a, BBC Sport Africa
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Onye ọbụla ma na ọ bụ nkeji 60 ka a na-agba asọmpi bọọlụ, mana asọmpi ikpeazụ nke Afcon nke afọ 2025 bụ ihe a ka na-agba kemgbe ọnwa itoolu.
Ugbua, otu akukụ: Morocco maọbụ Senegal ga-abụ ndị mmeri.
Mana nke a pụtara na ọ bụzi n'ụlọikpe ka aga egbubi asọmpiahụ, ọ bụghị n'ama egwuregwu.
N'ụbọchị Tozde, ikike kacha ikike n'okwu ikpe n' egwuregwu akpọrọ 'Court of Arbitration for Sport (Cas), na Bekee ga-amalite ịnụ mgbagha Senegal na-agbagha mkpebi napụrụ ha mmeri ha chere na ha nwetara n'ọnwa Jenụwarị megide ndị Morroco bụ ndị lere ha ọbịa na Rabat.
Mana dị ọ na-agụ ahu ka ka ebie okwu ahụ bụ ndị a dọọla aka na ntị na ọ gaghị abịa n'otu ụbọchị.y.
Ya mere , kedụ etu anyị si rute ebe a? Kedụ ihe ga-eso ya?
Kedụ ihe mere n'agba nke ikpeazụ n'asọmpi Afcon?
N'ihu mmadụ dị 66,000 ndị nkwado ha n'ụlọ ebe niile na-ede jiji n'ama egwuregwu 'Prince Moulay Abdellah Stadium' dị na Rabat, dịka Morocco na-achọ ịgbali ịchụta Iko nke Africa ha nke mbụ kemgbe afọ 1976.
Maka asọmpi ikpeazụ ahụ danyere n' ọgbaghara rue oge nkwụsị.
O nweghị onye nyere goolu oge Senegal chere na Ismaila Sarr nyere goolu nyere ha mmeri mana mecha chọpụta na ogbuubọọlụ bụ Jean Jacques Ndala egbuboola opi ka Morroco gbaa 'free kick.'
Nsogbu kawanyere njọ n'ebe Nkeji 98 oge e lechara igwe VAR Ndala nye Morocco ohere chere-ka-m-gbaa( penalty.)
Iwe adịla ọkụ, onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Senegal bụ Senegal coach Pape Thiaw kpọrọ ndị egwu bọọlụ ya pụọ n'ọgbọ, ebe ndị nkwado malitere ha na ndị ọrụ nchekwa ịkụkọ isi,dịka ọgbaghara dara .
Asọmpi mechara malitekwa ọzọ, n'ebe Nkeji124, ohere inweta ihe kwara ha kemgbe afọ 5 fulahụrụ Morocco oge Brahim Diaz nke Real Madrid enyelighị goolu site na Penarịti, dịka o tinyere bọọlụ n'aka Ocheegoolu Edouard Mendy.
Goolu nke Pape Gueye' nyere n'oge mgbakwụnye nyere Senegal otuohere iji otu goolu asataghị ihe merie agba ma buru iko ahụ nke ugboro abụo dịka ha siri chee.
Gịnị mere e jiri kagbuo mpụtara Afcon ikpeazu?

Ebe foto si, Reuters
Otu egwu bọọl mba Morocco bụ 'Royal Moroccan Football Federation (FMRF) na-egbughị oge nyere mkpesa n'aka otu 'Confederation of African Football (Caf), sị na Senegal dara iwu asọmpi.
Isi nke 82, nwere isi okwu a kpọrọ,"Withdrawals", kwuru sị: " Ọ bụrụ na, otu egwu bọọlụ ọbụlka, ihe ọ skwara ya ya bụrụ kpatara ya, hapụ ọgbọ asọmpi tupu easọmpi agwụ, na abụghọ ogbuubọọlụ nyere ha ikike, a ga-ewe ha dịka ndi e meriri n, ma gụpụ ha n'asọmpi."
N'Ọnwa Maach, otu mkpegharị Caf kwetara na Senegal atufuola asọmpi ahụ ma nye Morocco mmeri dịka onye ji ọkpụ goolu atọ asaghị asa merie.
Dịka enwerela ebe Caf kagburu mpụtara asọmpi n'Afcon nakwa asọmpi ntozu Ikomba ụwa, ndị ọzọ gunyere onye bụbu nnukwu onyeisi Caf kwuru na ọ b u naanị ogbuu bọọlụ bu onye nwere ikike ịhapụ asọmpi ma o nwee ndị gawara.
FMRF kwuru na ha chọrọ ezigbo ntule iwu ji asọmpi mana otu egwuregwu Senegal kọwara mkpebi ahụ dịka , 'mmegbu na enweghị oyiri, ma sị na ha anabataghị ya nke mere ka ha gbagharịa akwụkwọ. n'aka Cas.
Kedụ nke bụ ụlọikpe 'Court of Arbitration for Sport'?
E hiwere Cas n'afọ 1984 n'obodo dị na mba Swizerland a kpọrọ Lausanne, dịka ụlọikpe mbaụwa kwụụrụ onwe ya maka idozi ikpe metụtara asọmpi dịka asọmpi mba ụwa ghọrọ ihe nnukwu ego, nakwa ihe esemokwu.
A na ewe ikike Cas dịka ojechaa-ọgwụ, nke pụtara na mkpebi ya na-abụ ikpeazụ belusọ na Ụlọikpe Kachasị nke mba Switzerland eguzoro n'ụfọdụ ihe, dosa mkpebi ya n'akụkụ.
Kedụ mgbe anyị ga-enweta mkpebi?

Ebe foto si, Getty Images
Dịka a na-anụ ikpe ahụ na nzuzo dịka ndị o metụtara si kwekọrịta, a na-atụ anya na ọ ga-ebi n'ehihie Tozde.
Cas adọọla aka na ntị na nke a bụ mmalite ilebanye ikpe ahụ anya.
Ozi ha kwuru sị, na ụlọikpe dọrọ aka na ntị sị, "agaghị ekwuli oge aga enye mkpebi ikpeazụ mana ọ gaghị abụ ụbọchị a nụrụ ikpe ahụ."
Dịka e cherela ọnwa itoolu tupu e ruo ebe a, ,mkpọbi ụkwụ dị na okwu a bụ na iwu Cas kwuru na mgbagha mkpebi kwesịrị ịbụ n'ime ọnwa anọ a nụchara ikpe ahụ mana iwu na-atụzi aka ihe a na-eme kwuru ka ndị na-elebara ikpe ahụ anya gbalie mee ya n'ọnwa atọ.
Ozi ọma dị na ya bụ e nwere ike ime ya ọsịsọ.N'afọ 2020, otu egwu bọọlụ Manchester City weghara ikpe mkpegharị na Cas maka mkpebi Uefa ịmachi ha isonye n'asọmpi otu egwu bọọlu maka ịda iwu metụtara ego
A nụrụ ikpe ahụ n'abalị asatọ nke ọnwa Juun, mkpebi ahụ gaara Man cityi n'abalị 13 nke ọnwa Julai.
Kedụ ihe ga-apụ mpụtara ikpeazụ n'okwu a?
Na-agbanyeghị mgbagha mkpebi Caf kwụụrụ onwe ya, ịkụsa mkpebi Caf nyere ka ewetu aaaaaaha otu ahụ na-ahazi asọmi bọọlu n'Africa, ọbụladị dịka ọtụtụ na-akatọ Caf maka inye Morocco mmeri.
Onyeisi Caf bụ Patrice Motsepe kwuru n'ọnwa Machị na ha ga akwụ na mkpebi ọbụla Cas ga-enye, ya mere ọ gaara Senegal, ọ ga-apụta na a ga-akpa iwu Afcon aka.
Iji iwe pụọ n'ọgbọ nke agụ Teranga ewetala mgbanwe n'iwu asọmpi bọọlụ.
"Ogbuubọọlụ nwere ike ịnye ọgbaabọọlụ ''red card' ma ọ pụọ n'ọgbọ egwu na nnupuisi na mkpebi ogbuboolu nyere n'asọmpi, dịka Ifab, bụ otu naeme iwu na-achị asọmpi bọọlụ si kwuo n'ọnwa Eprelu.
"Iwu ọhụrụ a metụtara ndị ọrụ otu egwu bọọlụ bụ onye kpaliri ndị egwu bọọlụ ka ha pụọ n'ọgbọ egwu. Otu egwu bọọlụ mere ka ahapụ asọmpi gaetufu asọmpi ahụ."
Senegal achụọla Thiaw dịka a gbapụrụ mba ha n'agba nke 32 nke Asọmpi ikombaụwa. .Ebe a chụrụ Walid Regragui, onye nọ n'isi ihe mere ndị Morocco n'ọnwa Maach.
Ihe ọbụla e kpetara n'ike ahụ, eseokwu ga-adịzị n'etiti otu egwu bọọlụ abaụọ ahụ.
























