Anyị ga-achọpụta isi ihe butere ọgụ n'etiti Aguleri na Umuoba Anam - Gọvanọ Soludo

Aha onyonyo, Anyị ga-achọpụta isi ihe butere ọgụ n’etiti Aguleri na Umuoba Anam - Gọvanọ Soludo
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra State ekwela nkwa na ọchịchị ya ga-ahụ isi ihe butere ọgụ n'etiti Aguleri na Umuoba Anam.

Gọvanọ Soludo kwuru nke a oge ya na ndị ọnụ na-eru n'okwu n'obodo abụọ ahụ nwere mkparịtaụka n'obi ọchịchị Anambra state dị n'Awka.

Ndị bịara ọgbakọ mkparịtaụka ahụ gụnyere ndị Igwe obodo, ndị uweojii ndịisi ụka na ndịisi otu jikọrọ obodo (President General Town Union) nke obodo abụọ ahụ.

Gọvanọ Soludo agbarụọla ihu, gwa ndị Umuoba Anam na Aguleri ka ha kwụsị ọgụ

Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo, ndị ndu ọdịnaala na ndị ndu okpukperechi n'ọgbakọ udo a haziri n'etiti Aguleri na Umuona Anam

Iji weta udo n'ọgụ a na-ada n'etiti obodo Aguleri na Umuoba Anam ugbua, Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwuola hoohaa na ihe kpatara ọgụ ahụ bụ mmadụ ịkpachapụ anya nupu isi n'iwu okeala.

Ọ kwuru na mmadụ ekwesighị iji aka ha na-achọ ịgbanwe ebe okeala obodo ọbụla dị.

Na nzụkọ udo ọ kpọrọ n'Awka, ọ gwara ndị Umuoba Anam na ha enweghị ikike ịgbanwe okeala maka na otu onye obodo ha bara n'ime Aguleri gaa zụrụ ala.

Soludo ji obodo Awka na Abuja maa atụ, wee gwa ha na "ọ na-abụ onye zụọ ala n'Awka, ọ gụgharịa aha obodo ebe ọ zụrụ ala"?

"I mee nke a ndị Awka achụọ gị ọsọ. Ọ masịkwa ụnụ gbakọọ nụ aka zụọ ala n'obodo ọzọ, ịnweghị ikike ịkpọzi ebe ahụ aha obodo i siri bịa."

Ọ dọrọ ha aka na ntị ka onye ọbụla kwụsị ọgụ, tigbuo zọgbuo na ịgba ụlọ ọkụ ma nyekwa kọmitii udo eguzowere ntuziaka ka ha sie imi n'ala nyochaa mkpesa niile.

Ọ bụ esemokwu ebe a ga-adonye 'sign board' butere ọgụ na-ada n'etiti Aguleri na Umuoba Anam - Ifeanyi Idigo

Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo, ndị ndu ọdịnaala na ndị ndu okpukperechi n'ọgbakọ udo a haziri n'etiti Aguleri na Umuona Anam

Ifeanyi Idigo bụ onye ji ọkwa odeakwụkwọ obieze nke Igwe Aguleri kọwaara BBC na ihe kpatara esemokwu ahụ bụ na Igwe ndị Umuoba Anam gara zụrụ ala n'aka onye Aguleri, ka ọ zụchara ala ahụ, o tinye 'sign board' n'ihu ala ahụ, kpọọ ya obodo Umuoba Anam.

Nke a kpasuru ndị Aguleri iwe, ha wee si ka e wepụ 'sign board' ahụ n'ihi na ọ bụ ala ndị Aguleri.

Dịka o siri kwuo, Umuoba Anam jụrụ ajụ, nke mere nsogbu jiri malite.

Ọ sịrị "kamgbe Juun ka nsogbu ahụ malitere, anyi na ha mechara nwee mkparịtaụka udo, mana anyị amaghị na ndị ụmụoba Anam akwadola maka ọgụ"

"Ha ji aka ike wakpoo anyị na mberede, nke na anyị amaghị na ha na-abịa''.

Maazị Ifeanyị Idigo kwuru na ugbua, "a gbaala ụlọ Igwe Michael Idigo ọkụ, ma obi ya nke ochie ma nke ọhụrụ. Ha gbakwara ọtụtụ ụgbọala ọkụ n'obi Eze ahụ.

"Mụ onwe m bụ odeakwụkwọ Igwe, a gbara ụlọ m ọkụ. O nweghị otu ihe m wepụtara tupu ụlọ m agbachaa ọkụ."

Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo, ndị ndu ọdịnaala na ndị ndu okpukperechi n'ọgbakọ udo a haziri n'etiti Aguleri na Umuona Anam

Ọgụ obodo abụọ ahụ malitere n'ụbọchi mbụ nke ọnwa Ọktoba. A gbaala ọtụtụ ụlọ ọkụ, ma merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ.

Ndị ọrụ nchekwa ekwubeghị ma o nwere onye nwụrụ na nsogbu ahụ.

N'ụbọchị 2 Ọktoba ka ụfọdụ onyonyoo fegharịrị n'ikuku, nke gosiri ka ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ ha.

N'onyonyo ahụ, a nụrụ ka ụda egbe na-ada aghara aghara, ebe onye a nụrụ olu ya n'otu onyonyoo gwara ndị mmadụ ka ha zere ịga n'obodo Umueri maọbụ Aguleri n'ihi na esemokwu atọpụla ọgọdọ ma gbarazie ọtọ n'etiti ha.