Sir Wicknell nwa afọ mba Zimbabwe ji ego achụ nta ego a hụrụ n'anya ma kpọkwaa asị n'Africa

Ebe foto si, Zanu-PF
- Onye dere ya, Ish Mafundikwa
- Ebeg o si, Harare
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Wicknell Chivayo dị afọ 45 bụ nnukwu onye ji ego achụ nta ego si mba Zimbabwe.
Wicknell na nwunye ya bụ Lucy Muteke nwụrụ n'ihe mberede helikọpta n'izuụka gara aga.
Ọnwụ na ndụ ha kewara ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ha.
Mana Wicknell kpọrọ onwe ya "Sir Wicknell".
Ọ bụ onye na-egosipụta onwe ya na soshal midịa ma na-egosi ihe o meere ndị mmadụ, ndị o nyere ego nakwa mgbe o zụrụ ụgbọala ọhụrụ.
Chivayo na-egosi na ya na ndịisiala mba dị iche iche n'Africa dị na mma, na-egosi ọtụtụ ụgbọala ya nakwa etu o si eme njem nakwa akpụpụ ụkwụ ya ndị dị oke ọnụahịa.
Ndị hụrụ ya n'anya na-ahụta ya dịka nwoke ji nnukwu ego na-ebi ezigbo ndụ ebe ndị na-ahụghị ya n'anya na-ahụ ya dịka ihe gosiri na ịkpaoke dị n'etiti ndị nwere ego na ndị na-enweghị.
Mana Chivayo adịghị ege ndị na-akatọ ndu ya. Dịka ego ya na-eto, ọ na-egosi akụnụba ya n'agbanyeghị na ọtụtụ ndị mmadu na mba Zimbabwe n'ọke agụụ dịka ụlọakụ mba ụwa si kwuo.
Pedzisai Ruhanya bụ onyeisi 'Zimbabwe Democracy Institute think-tank' kwuru na "ọ na-enye ndị were ego karịa ndị na-enweghị ego".
Ọ hụrụ ihe Chivayo na-enye ndị ọgaranya dịka nkwado otu ndọrọndọrọ ọchịchị Zanu-PF nakwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gbasiri ike.
Mana ọtụtu mmadụ nọ n'ihe ibe akwa ọkachasị ndị ritere elele n'aka Chivayo dịka ndịisi ụka, ndị ọchịchị, ndị ji ego achụ nta ego.
N'ime ha bụ Cleopas Mukungunugwa so na ndị gbakọrọ n'ụlọ ya dị n'isi obodo mba Kenya dịka a na-akwado olili ozu ya n'ụbọchị Thursday.
O nyere Cleopas Mukungunugwa ụgbọala abụọ karaaka.

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Chivayo si n'ụlọakwụkwọ pụọ mgbe ọ dị afọ iri na ise maka na ezinaụlọ ya enweghị ike ịkwụ ụgwọ akwụkwọ ya. Nna ya nwụrụ mgbe ọ dị afọ ise.
Ọlụ ya mbụ bụ onye ozi 'clerk' na-ahụ maka ibu ndị njem n'ụlọọrụ na-ahụ maka njem tupu o bido na-agbara onwe ya mbọ, na-ere ekwentị ma na-azụ ahịa ịtụmgbere mgbanwe ego mba ofesi dịka mba ha na-enwe nsogbu ego ha ịda mba.
N'afọ 2005 ka a tụrụ ya nga afọ ise maka mpụ mbupu ego mba South Africa ruru 837,000 (n'oge ahụ $137,500, £72,000). Ọ nọrọ afọ atọ n'ụlọ mkpọrọ Chikurubi dịka e wepụrụ afọ abụọ họrọ.
Ọ banyere na ngala ọkụ latrịk site n'ihe a kọwara dịka ndị gọọmenti na-enye ọrụ.
Ọ bụ onyeisi ụlọọrụ Intratrek Zimbabwe nke ya na ụlọọrụ ọkụ latrịk nke mba China bụ CHiNT Electric na-emekọ.
Nke a mere mgbe gọọmenti mba ahụ wepụtara iwu mere ka ụlọọrụ niile ndị mba ọzọ hiwere na Zimbabwe nyefee ya n'aka nwa amaala ha.

Ebe foto si, Zanu-PF
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mmekọ Chivayo na ndị nọ n'ọchịchị bụ otu ihe e jiri mara ya na soshal mịdịa.
N'ọnwa Juun ka Eze Mswati III nyere ya ikike ị bụ nwa amaala obodo Eswatini ma nye ya akwụkwọ ikike. O kesara foto na onyonyo ọ be ọ sekpuru ala n'ihu eze obodo ahụ
Foto ndị ọ na-ekesa gosiri ebe ya na ọtụtụ ndị isiala mba dị icheiche dịka Bola Tinubu nke Nigeria, Samia Suluhu Hassan nke Tanzania, Peter Mutharika nke Malawi, Daniel Chapo nke mba Mozambique, Hakainde Hichilema nke mba Zambia. O sokwa na ndị nabatara Onyeisiala mba South Africa na Zimbabwe mgbe ọ bịara hụ ugbo Mnangagwa na mbido afọ a.
Mmekọ ya na ọtụtụ ndị eze obodo ndị a abụghị naanị n'azụmaahịa. N'ọnwa ọgọst ka Chivayo na nwunye ya so na ndị ọbịa mgbe Charlene bụ nwa nwaanyị Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto mere emume ikwe nkwa alụm di na nwunye.
Ọ bụ Onyeisiala Ruto bụ Chivayo na nwunye ya gaa n'ụgbọelu 'helicọpta' ha.
Chivayo setere nke ma kesaa ya na soshal mịdịa na-eto chukwu na Onyeisiala bu ya n'ụgbọala.
Ruto dere n'akara X soshal mịdịa ya mgbe Chivayo nwụrụ sị "a ga m echete ya dịka ọnyị m na ya, ezigbo agwa ya, nakwa nkwenye o were maka ọ dị na mma africa".
Mana na mba Kenya ndị mmadụ na-enyo mmekọ Chivayo na Onyeisiala Ruto enyo maka na ha na-egosipụta ya na soshal mịdịa.
Ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal mịdịa adịghị mma ide ede.

Ebe foto si, @sir_wicknell
Na mba Zimbabwe ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ ndị na-ekwu okwu emegide ya n'ọnwu maka n'Africa adịghị ekwugide onye nwụrụ anwụ mana akụkọ banyere ya bụ okwu a kpụ n'ọnụ na mba ahụ.
N'ọdọ ahịa dị na Harare ka otu onye bụ Christabel Moyo kwupụtara ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na-ajụ "gịnị bụ ime ka onye Africa na mmadụ ga-enwete ego site n'ọrụ ngo o wetere n'aka gọọmenti nke ha buniri ọnụ ahịa ya elu ma jiri ya na-akwado otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Zanu-PF? ".
"Ihe ọ na-eme bụ ike ndị nwere ego ụgbọala ma ego n'agbanyeghị na ụlọọgwụ dị na mba Zimbabwe na-emebi".

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Mana ọtụtụ ndị mmadụ ekweghị nara onyinye Chivayo nyere ha. Eunor Guti bụ nwunye nwoke hiwere ụlọ ụka Assemblies of God Africa dị na mba Zimbawe nwụrụ anwụ aha ya bụ Archbishop Ezekiel Gutika ka o nyere ego ruru $250,000 mana okwegi nara ya.
N'afọ 2024 ka o nyere otiegwu a maama na-agba gọọmenti ụkwụ aha ya bụ Thomas Mapfumo nnukwu ụgbọala nakwa ụlọ mana okweghi nara ya ma kwuo na ọ chọrọ inye ngarị ma kọwa ego ya dịka ego mpụ.
Mana n'afọ a ka ọ natara ego ruru otu nde dọla ($1m) ka o nweeike iti egwu na-emume alụmdị na nwunye nakw nchete ọmụmụ na Jah Prayzah a ga-eme n'ọnwa Novemba.
Chivayo rụrụ nnukwu ụlọ ọchọrọ igbape n'ọnwa November n'obodo ha bụ Gandani n'ọdịda anyanwu Harere n'oge nchete ọmụmụ ya.
Mana ọnwụ Chivayo mere ka otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Zanu-PF. na-enweghị onye nkwado ha a maama.
Ọnwụ ya mere ọtụtụ ndị obodo ha na-ajụ etu o si too n'agbanyeghị na a mụrụ ya n'ezinaụlọ enweghị ihe.





























