Tinubu akasiela ndịagha elu obi maka ọnwụ mmadụ 32

Ụgbọelu ndịagha Nigeria
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Nigeria bụ Bola Tinubu akasiela ezinaụlọ ndị njem iri abụọ na ise (25) nakwa ndị ọrụ asaa nke ụgbọelu ndịagha Nigeria kpọkara n'ụbọchị Mọnde 5 Ọktoba 2026.

N'ozi Bayo Onanuga bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala wepụtara n'abalị Mọnde, o kwuru na Tinubu egosipụtala mwute ya gbasara mkpọka ụgbọelu ahụ mere n'ụtụtụ Mọnde na mpaghara Igbokoda dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ilaje n'Ondo Steeti oge o si Benin na-aga Lagos Steeti.

"Onyeisiala na-ezipụ ozi nkasiobi nye ezinaụlọ mmadụ 25 na ndị ọrụ asaa ọdachi a metụtara, tinyekwara Onyeisi ndịagha elu bụ Air Marshal Sunday Kelvin Aneke na ndịagha elu niile," ka ozi ahụ kwuru.

Military Air Crash: Ụgbọelu ndịagha akpọrịela n'Ondo steeti

Ụgbọelu ndịagha kpọkasịrị

Ụgbọelu ndịagha nke bu akara NGR 931 si Lagos aga Benin akpọriela na mpaghara Igbokoda dị n'Okpuru Ọchịchị Ilaje nke Ondo steeti n'ụbọchị Mọnde, abalị 5 nke ọnwa Oktoba, afọ 2026.

Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Festus Keyamo bụ onye gbara ama n'ozi o wepụtaran'akara ya n'ọbaozi X, kwuru na ụgbọelu ahụ bu mmadụ 32 nke gunyere ndị njem 25 nakwa ndị ọrụ ụgbọelu asaa.

Ozi keyamo kwuru sị, " Obi di m mwute ịgwa ọha mmadụ na nd i na-ahazi njem ụgbọelu gwara m na ụgbọelu ndịagha bu akara 'NGR 931 n'ọdụ ya nke si Lagos aga Benin furu ka o ji nkeji iri na abụọ gafee Elekere Itoolu taa."

"E mechara nweta ozi na ụgbọelu ahụ dara na nso ọdọ ndịagha mmiri dị n'Igbokoda, Ondo Steeti. A hụla ogbokoro ya ,ebe ndi ọrụ gbatagbata malitererela ọrụ."

Ozi ahụ na-abịa dịka ihe onyonyo na-ewu na soshal midia gosiri igwe mmadụ gbakọro n'ikpere mmiri nakwa ndị nọ n'ụgbọmmiri dịka otu olu na-akọwa ọdachi dapụtara n'asụsụ Yoroba.

Ọdachi a mbụ ụgbọelu n n'ọnwa 10 ụgbọelu ndịagha Nke ikpeazụ mere bụ N'abalị isii nke ọnwa Disemba afọ 2025 oge ụgbọelu ndịagha ụgbọelu kpọkasịrị na nso Karabonde dị n'Okpuru Ọchịchị Borgu dị na Niger Steeti. mana ndị ọkwọụgbọelu abụọ nọ n'ụgbọelu ahụ pụtara na ndụ.