FIFA maara na ocheegoolu DR Congo etozughị ịgba asọmpi ntozu Iko mbaụwa ha na Nigeria ma hapụ ya

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ ọhụrụ na-ekwu na ndị ọrụ otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ ụwa, Fédération Internationale de Football Association (FIFA), maara na ocheegoolu mba Democratic Republic of Congo bụ Lionel Mpasi, emechabeghị usoro ịgbanwe obodo ọ na-anọchite site na France gaa DR Congo tupu o zute Nigeria.
Nke a ebutela ajụjụ ọhụrụ gbasara otu FIFA siri mesoo mkpesa Nigeria banyere ntozu ụfọdụ ndị egwuregwu DR Congo n' asọmpi ntozu Iko mbaụwa nke afọ 2026.
DR Congo meriri Super Eagles 4-3 site na penariti mgbe egwuregwu ahụ kwụsịrị 1-1 ka nkeji 120 gachara na Rabat, Morocco, n'ụbọchi16 Nọvemba 2025.
Mpasi gbara nkeji 120 niile n'ọnụ ụzọ goolu DR Congo.
Mgbe egwuregwu ahụ gasịrị, Nigeria mere mkpesa n'ihu FIFA, na-ajụ maka ntozu ọtụtụ ndị egwuregwu DR Congo.
FIFA mechara jụ mkpesa ahụ n'ihi ihe gbasara usoro iwu.

Ebe foto si, Getty Images
Mana akwụkwọ akụkọ 'The New York Times' kwuru na akwụkwọ ndị ha nyochara gosiri na ndị ọkaiwu FIFA mechara chọpụta na Mpasi emechabeghị usoro dị mkpa iji gbanwee obodo ọ na-anọchite anya site na France gaa DR Congo.
Akwụkwọ akụkọ France, 'Le Monde', kọkwara na ndị ọkaiwu FIFA chọpụtara nsogbu ahụ na Maachị 2026, obere oge tupu DR Congo ezute Jamaica n'asọmpi Intercontinental play-off.
Mpasi, onye dị afọ 32, bụ onye a mụrụ na France. Ọ gbakwarala mba France n'asọmpi ndị ntorobịa.
Dịka akụkọ ndị ahụ si kwuo, DR Congo malitere usoro ịgbanwe obodo Mpasi na-anọchite anya n'afọ 2021, mana usoro ahụ agwụchabeghị.
Akwụkwọ FIFA ndị akụkọ ahụ zoro aka na ha kwuru na nke a pụtara na e nyeghị Mpasi ikike zuru oke ịgbara DR Congo bọọlụ.
Gịnị ka FIFA tụlere ime?
he ọhụrụ a emeela ka a jụọ ajụjụ ọzọ gbasara otu FIFA siri mesoo mkpesa Nigeria.
Ụlọọrụ 'The New York Times' kwuru na FIFA tụlere uche n'ọtụtụ ihe ha ga-eme gbasara mekpesa ahụ Nigeria mere, nke gụnyere inye Nigeria mmeri n'egwuregwu ahụ, ịta DR Congo ahụhụ, iwepụ DR Congo ma tinye Nigeria n'asọmpi 'Intercontinental play-off' ha na Jamaica, maọbụ ghara ime ihe ọbụla n'ihi na Nigeria mere mkpesa ha mgbe oge gafere.
N'ikpeazụ, FIFA enyeghị DR Congo ntaramahụhụ ọbụla gaara agbanwe onye ga-aga Iko mbaụwa.
N'aziza ha, FIFA gwara 'The New York Times' na kọmitii ya nwere onwe ha, na ha na-eme mkpebi dabere n'iwu n'okwu ọbụla.
Ruo ugbu a, FIFA ekwetaghị n'ihu ọha na e mesoro mkpesa Nigeria na DR Congo n'ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.






























