Etu mbọ igwuputa ozu ndị nwụrụ n'ụgbọelu kpọkara n'Ondo state si aga

Ọ banyela ụbọchị atọ a na-achọ ozu ndịagha Nigeria bụ ndị nọ n'ụgbọelu kpọkara n'Ondo steeti ma gbuo mmadụ iri abụọ na ise.
Dịka ndịagha na-achọ ibekere ụgbọelu ahụ maọbụ ozu ndị nwụrụ, ha machiri ndị mmadụ ịga na gburugburu ebe ụgbọelu ahụ dara ma kwuo na ha ga-eme nnyocha ma chọpụta etu mkpamkpa ahụ si kpaa.
N'aka nke ọzọ, ọkwa iri uju nakwa ikwanyere ndị nwụrụ ugwu ikpeazụ dịka Onyeisiala Bola Tinubu si maa ọkwa ka na-aga n'ihu.
Cheta na ndịagha Nigeria mmadụ iri abụọ na ise nakwa ndị ọrụ ụgbọelu mmadụ ise na-eme njem n'oge ụgbọelu ha kpọkara n'obodo a nakpọ Igbokoda dị na Ondo steeti.

Ihe iche aka mgba dịịrị ndị ọrụ gbatagbata
Ndị ntaakụkọ BBC gara n'Igbokoda bụ obodo ụgbọelu ndịagha ahụ kpọkara n'Ondo steeti kwuru na otu ihe iche aka mgba dịịrị ndị ọrụ gbatagbata bụ etu ebe ahụ dị.
Ha sị na ọ bụghị ebe ụgbọmmiri ọbụla na-aga maọbụ ebe ndị na-egwu mmiri ga-abịrị maka na o nwere apịtị nakwa ebe na-emi emi.
Ọzọkwa bụkwa ibute akụrụngwa ọrụ e ji egwuputa ihe bụkwa ihe iche aka mgba maka na ọ dịghị mfe ibubata ọtụtụ ihe ndị ahụ gafee elu mmiri ma gaa n'ebe a na-achọ ụgbọelu ahụ.
Ndị ọrụ gbatagbata ji droonu na-efe n'elu na-achọ ịmara nke ha ga-ahụ.

Ụfọdụ ihe anyị hụrụ n'ebe ụgbọelu ahụ kpọkara
Ndị ntaakụkọ anyị gara n'ebe ahụ ụgbọelu kpọkara n'Ondo steeti. Mgbe ha ruru, ha nọ n'elu ala maka na ha enweghị ike ịbanye maọbụ gaa na mmiri ahụ.
N'ebe ha nọ, ha ahughị ihe yiri ozu mmadụ maọbụ ụgbọelu ndịagha daraada.
Mana ọtụtụ ndị mmadụ nakwa ndị ọrụ nchekwa kwenyere na ọ bụ ebe ahụ ka ụgbọelu ahụ kpọkara.
Ọzọ bụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ụgbọelu ahụ nakwa ozu ndị nwụrụ nwereike ịnọ n'ala ala ọdọ mmiri ahu maọbụ n'ime apịtị.

Etu ọ dị ugbua, a na-ekwu na nnyocha DNA nwere ike ọ gaghị adị mfe maka na ozu ndị ahụ nwụrụ n'ụgbọelu kpọkara nọ n'ibe n'ibe na-agbanyeghị na e bipụtala aha ha.
Kemgbe ụbọchị ihe ahụ mere ndị obodo na-agbakọ n'ebe ọdọ mmiri ahụ na-ekiri etu e si na-achọ ozu ndị ahụ nakwa akụkụ ụgbọelu ahụ kpọkara.






























