NCDC adọọla ndị Nigeria aka na ntị dịka ọrịa Ebola gburula otu onye na mba Kenya

Mgbe a na-eli ozu onye ọrịa Ebola gburu na mba DR Congo
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Nigeria bụ 'Nigeria Centre for Disease Control and Prevention' (NCDC) adọla ọhanaeze aka na ntị ka ha mụrụ anya nọrọ na nche maka nje Ebola.

Onyeisi NCDC bụ Jide Idris dọrọ aka na ntị a dịka mba Kenya kwupụtara na ọrịa Ebola egbuola otu nwa amaala ha.

N'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Tuzde, Idris gwara ụmụ Nigeria ka ha ghara ịtụ ụjọ, mana ha kwesịrị ịkpachara anya ma soro ndụmọdụ ndị ọrụ ahụike.

'Onye a nwụrụ si mba DRC bata Kenya'

Ndị ọrụ ahụike na-ebuagha megide mfesasị ọrịa Ebola

Akụkọ mwuru na onye nwụrụ na Kenya bụ nwa amaala obodo ahụ biri na mba Democratic Republic of Congo (DR Congo) ruo afọ asaa.

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na mba Kenya bụ Aden Duale kwuru na nwoke ahụ si DR Congo gafee Uganda tupu ọ febata na Nairobi.

Duale kọrọ na mgbe ọ bịarutere Kenya, e nyochara ya n'ọdọụgbọelu tupu onye ikwu ya akpọga ya n'ụlọọgwụ.

Nlele gosiri na o bu Ebola Bundibugyo, ụdị Ebola na-adịghị ahụkaarị.

Ndị ọrụahụike Kenya ekwuola na ha achọpụtala mmadụ 28 ha na nwoke ahụ kpakọrịtara, ebe ha na-achọkwa ndị njem 23 na ndị ọrụ ụgbọelu anọ so ya n'ụgbọelu.

Ntuziaka NCDC nyere maka mgbochi na nchekwa megide ọrịa Ebola

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
WhatsApp BBC News Igbo nọ n'obaozi
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụlọọrụ NCDC gwara ndị Nigeria ka ha na-asa aka mgbe niile ma zere imetụ ọbara maọbụ mmiri ahụ onye na-arịa ọrịa, ọkachasị onye nwere akara Ebola.

O dụkwara ndị mmadụ ọdụ ka ha ghara imetụ aka n'ozu onye nwụrụ n'ọrịa ha amaghị ihe kpatara ya, ma ghara ijide anụ ọhịa na-arịa ọrịa maọbụ metụ ozu ya aka.

"Ndị kwesịrị ịga ụlọ ọgwụ ozugbo gụnyere ndị nwere ahụ́ adịghị mma mgbe ha si ebe Ebola metụtara lọta, maọbụ ndị kpakọrịtara na onye a na-enyo enyo na o butere nje ahụ" dịka ozi ahụ siri kwuo.

NCDC gwakwara ndị mmadụ ka ha na-enweta ozi gbasara Ebola n'aka ụlọọrụ ahụ, ụlọọrụ 'Federal Ministry of Health and Social Welfare' na ndị ọrụahụike ndị ọzọ, kama ịgbasa ozi asị.

Ndị njem kwesịrị ilekọta ahụ ha

NCDC dụrụ ndị si ebe Ebola metụtara lọta ka ha na-elekọta ahụ ha ruo ụbọchị iri abụọ na otu.

"Ọ bụrụ na ha amalite inwe akara ọrịa, ha kwesịrị izere ịkpọtụrụ ndị ọzọ ma chọọ enyemaka ahụike ozugbo, ebe ha ga-agwa ndị ọrụahụike ebe ha gara," Idris kwuru.

NCDC gbakwunyere na ọ na-enyocha ọnọdụ Ebola na Kenya, DR Congo na mba ndị ọzọ, ma na-arụkọ ọrụ na ndị mmekọ mba na mba iji mee ka Nigeria dị njikere.

Ka ọ dị ugbu a, ihe karịrị mmadụ 4,000 ka a kọrọ na ha nwụrụ n'ọrịa Ebola na DR Congo n'afọ a.

Ebola na-agbasa site n'ịmetụ mmiri ahụ onye bu ọrịa, dịka ọbara, maamịrị maọbụ agbọọ.

Ndụmọdụ nye ndị ọrụahụike

NCDC gwara ndị ọrụahụike ka ha na-etinye nje Ebola n'uche mgbe ọbula ha na-enyocha onye nwere akara ọrịa ahụ ma ọ bụrụ na onye ahụ gara ebe ọrịa ahụ dị maọbụ kpakọrịtara na onye nwere ike ibute ya n'ime ụbọchị 21.

O kwuru na akara mbụ Ebola nwere ike ịdị ka ọrịa ndị ọzọ na-ebute ahụ ọkụ, ya mere ekwesịghị ichere ruo mgbe onye ọrịa malitere ịgba ọbara.

Ọ bụrụ na e nwee onye a na-enyo enyo na o nwere Ebola, a ga-ekewapụ ya ozugbo ma jiri ngwa nchebe kwesịrị ekwesị tupu agwa ndị ọrụahụike ọha.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post