Onyeisiala Trump akwadola ka e jiri egbe gbagbuo Nidal Malik Hasan bụbu Ọchịagha

Ebe foto si, Bell County Sheriff's Office via Getty Images
Pentagon ekwupụtala na ha ga-akwụgbu onye bụbu Ọchịagha n'otu ndịagha mba America site n'ịgba ya egbe; nke a bụ oge mbụ n'ime ihe karịrị afọ iri isii ka a ga-eji ụdị usoro a gbuo mmadụ bụbu onye otu ndịagha.
Cheta na Nidal Malik Hasan, onye bụbu Ọchịagha n'otu ndịagha mba America na dọkịta, gburu ndịagha America ejighị ngwa agha n'ogige ndịagha Fort Hood n'afọ 2009, ma merụọ mmadụ iri atọ na abụọ ọzọ ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị Pentagon bụ Sean Parnell, kwupụtara n'akara soshal midịa na Mọnde na odeakwụkwọ na-ahụ maka agha, bụ Pete Hegseth, tụrụ aro ahụ nke Onyeisiala Donald Trump kwadoro.
Nke a ga-abụ mbụ a ga-eji egbe gbuo mmadụ n'usoro ndịagha kemgbe agha mbaụwa nke abụọ kwụsịrị.
Otu ndị ọkaikpe mejupụtara ndị ọrụ iri na atọ mara Hasan ikpe maka ebubo iri na atọ nke gụnyere ịkpachara anya gbuo mmadụ na ebubo iri atọ na abụọ nke ịnwa igbu mmadụ, ha niile wee kwado n'otu olu ka a mara ya ikpe ọnwụ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Hasan, bụ dọkịta na-ahụ maka ọrịa uche n'otu ndịagha mba America si Virginia, gburu ndịagha iri na atọ n'ogige ndịagha dị na Texas n'afọ 2009, ma mesịa kweta n'ụlọikpe na ya bụ onye gbara ha egbe, ma rịọkwa mgbaghara maka "mmehie ọ bụla" o mere.
N'oge a na-ekpe ya ikpe n'ụlọikpe ndịagha n'afọ 2013, o kwuru na o kwenyere na ya na-echekwa ndị Alakụba na ndị Taliban na Afghanistan.
Ogbugbu ndị ahụ mere n'ụbọchị nke ise n'ọnwa Nọvemba n'afọ 2009 bụ mwakpo kacha nke e egbu ọtụtụ mmadụ n'ogige ndịagha America nọ, nke na-abụghị n'oge a na-alụ agha kpọmkwem.
E mere mwakpo ahụ n'otu ụlọọrụ ahụike juru eju, ebe ndịagha na-akwado ịpụ maka ọrụ na-eche ka e nyochaa ahụike ha ma nye ha ọgwụ mgbochi.
Ugbu a, Hasan so n'ime ndị mkpọrọ anọ nọ n'ahịrị ndị a ga-egbu n'otu ndịagha mba America.
Dịka iwu ndịagha America si dị, igbu ndịagha chọrọ nkwado onyeisiala mba America.
Ọ chọkwara ka e nyochaa mkpesa na mkpebi ikpeazụ gbasara iwu iwu ndịagha tupu a gaa n'ihu.

























