FAAN ekwuola na ha ga-agbape Sam Mbakwe International Cargo Airport Owerri, Imo state

Ebe foto si, Festus Keyamo / Instagram
Ụlọọrụ Federal Airport Authority of Nigeria, FAAN ekwuola na ha ga-agbape ọdọ ụgbọelu Sam Mbakwe International Cargo Airport dị n'Owerri, Imo state.
FAAN mere ka a mata nke a n'ozi ha wepụtara n'akara X soshal midia ha nke Henry Agbebire bụ onyeisi ngalaba mgbasaozi ụlọọrụ ha binyereaka na ya.
FAAN kwuru na ha ga-agbape ọdọ ụgbọelu ahụ n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Nọvemba 2026.
Ha kwuru na okporoụzọ ebe ụgbọelu si efeli nke Bekee kpọrọ 'Runway' ha mechiri n'Ọktoba 20, 2026 ka ha rụgharịrị ihe mebiri na ya dịka ụlọọrụ Nigeria Civil Aviation Authority (NCAA) si nye ikike ya.

Ebe foto si, Getty Images/FAAN X
Ha sị na NCAA mere nnyocha banyere ọnọdụ nchekwa ma nye ikike ịgbape ya.
FAAN ji ohere ahụ na-ekele Gọvanọ Imo state bụ Hope Uzodimma maka nkwado o nyere n'oge a na-arụzị ihe mebiri n'ọdọ ụgbọelu ahụ.
Ha gara n'ihu kọwaa na ọdọ ọgbụelu ahụ agaghị arụ ọrụ n'ime abalị ruo na ha etinyechaa ọkụ latrịk n'okporoụzọ ebe ụgbọelu na-ada nakwa ihe nchekwa niile ka họrọ n'usoro NCAA wepụtara.

























