Ihe anyị ma maka ntọhapụ Simon Ekpa site n’ụlọmkpọrọ mba Finland
A tọhapụla Simon Ekpa bụ onyeisi otu n'ime ndị chọrọ mnwereonwe Biafra a kpọrọ United States of Biafra site n'ụlọmkpọrọ mba Finland.
Otu ụlọọrụ ntaakụkọ na mba Finland bụ yle kwupụtara nke a n'akụkọ dị n'obaozi ha n'ụbọchị 17 Nọvemba 2026.
Cheta na ụlọikpe dị na mba Finland tụrụ Simon Ekpe mkpọrọ afọ isii n'onwa Sepụtemba afọ 2025 maka n'ihi ebubo ime mpụ iyi ndụ egwu na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nigeria n'agha ịchọ nnwereonwe Biafra.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Dịka otu afọ gachara, Ekpa gbara akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị dị na Finland megide ikpe ahụ e jiri tụọ ya mkpọrọ.
Ụlọikpe mkpegharị nọrọ n'ọnwa Ọktoba afọ 2026 lebagharịa anya n'ikpe ahụ ma kpebie ibelata afọ isii e nyere Ekpa ka ọ bụrụzie afọ anọ ka ọ ga-anọ.
Mana ọ nọzubeghi afọ anọ ahụ tupu akụkọ na a tọhapụla ya amalite iwu na soshal midia.
Ka ọ dị ugbua, okwu ya ka nọ n'Ụlọikpe Kachasị na mba Finland na-agbanyeghi na a tọhapụla ya site n'ụlọmkpọrọ.



