Ihe ị kwesiri ịma maka iwu ọhụrụ haziri mmekọ ndị nwere ụlọ na ndị bi na be ha n'Enugu state

Aha onyonyo, Ihe ị kwesiri ịma maka 'Enugu state Landlord and Tenant Bill'
Ihe ị kwesiri ịma maka iwu ọhụrụ haziri mmekọ ndị nwere ụlọ na ndị bi na be ha n'Enugu state
Mgbe e biputara ya

Ọbụghịzi ihe ọhụrụ na Ụlọ omeiwu n'Enugu state mepụtala iwu machiri atụtụ ego ndị nwere ụlọ na-anara ndị bi n'ụlọ ha maọbụ ndị na-achọ ịkwabata n'ụlọ ha.

Iwu ahụ wepụtara usoro ndị na-achọrọ mmadụ ụlọ Bekee kpọrọ 'agents' si arụ ọrụ, wepụta ego ole ha kwesiri ịnara nakwa ego ole ndị ọkaikpe na-elekọtara ndị mmadụ ụlọ ha kwesiri ịnara na ihe ndị ọzọ ma nyekwa ntaramaahụhụ ndị dara iwu ahụ.

Omeiwu Anthony Okey Mbah, na-anọchitaanya Nkanu East Constituency ma bụrụ onyeisiala na Kọmittee na-ahụ maka ụlọ obibi nakwa ego mmepe si mba ofesi n'ụlọomeiwu Enugu state kowara ihe ihe ndị kacha mkpa n'iwu ahụ.

Okey kwukwara ka ha si mee na-enweghị onye e megidere n'iwu ahụ.

Okey ji ohere ahụ kọwaa etu a ga-esi mee ka onye ọbụla rubeisi n'iwu ahụ

N'ihe ndị a niile, a na-atụanya na Iwu a ga-ebido ọrụ mgbe ọbụla Gọvanọ Peter Mbah binyere aka na ya nke nwereike ime nso nso a.