Ọkpara onyeisiala Amerịka Donald Trump ebutela coronavirus, dịka ọnụ na-ekwuru ya siri kwuo.
Ọ sị na nyocha chọpụtara na Donald Trump Jr, dị afọ 42, butere coronavirus na mbido izu ụka ma banye ịnọdụ iche na ulọ nta ya kemgbe ahụ.
N'ime akwụkwọ ozi o wepụtara, ọ sị : "O nweghi ama ọrịa ọbụla dịka ọ na-eso usoro ndị ọrụ ahụike wepụtara maka ọrịa a."
Don Jr bụ onye abuọ n'ụmụ onyeisala Amerịka butere ọrịa a.
Barron Trump, dị afọ 14, butere ọrịa a n'ime ọnwa gara aga, mana ọ gbakere ọsịsọ.
Don Jr sọ na ndi ọnụ na-eru n'okwu banyere ndọrọndọrọ ọchịchị nna ya nọ n'ime ya.
A na-echekwe na Don Jr n'onwe ya nwere ebumnuche ịzọ oche onyeisiala Amerịka, mana ọ na-ekwuda ya bụ atụmatụ.
Enyi nwaanyi Don Jr bụ Kimberly Guilfoyle, bụbu onye ntaakụkọ na Fox News, butere coronavirus na Jụlaị ma gbakee.
Don Jr ebuteghi ya n'oge ahụ.