You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. FIFA amachiela onyeisioche CAF ruo afọ ise

    International Federation of Association Football FIFA amachiela onyeisioche CAF bụ Ahmad ruo afọ ise maka nrụrụaka na mpụ.

    A dakwuru ya nha ruru dọla puku narị abụọ($200,000). Ahmad ekweteghị na o nwere njọ o mere .

    Akụkọ ka na-abịa

  2. Atọghapụla ụmụakwụkwọ 9 si ABU a tọọrọ na Kaduna.

    Atọghapụla ụmụ akwụkwọ itoolu nke Mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria na Kaduna steeti n’ụbọchị Satọde.

    Ọnụ na-ekwuchitere ụlọakwụkwọ ahụ bụ Mallam Auwal Umar bụ onye gbara ama mana o kweghi ekwu ma ezinaụlọ ụmụ akwụkwọ ahụ akwụrụ ụgwọ tupu atọghapụ ha.

    Mana dịka ụlọ ntaakụkọ Punch si kwuo, otu nna atọọrọ nwa ya sị na ọ kwụrụ ego karịrị naira puku narị ise.

    O kwukwara na o rere ụfọdụ akụnaụba ya tupu o nweike mezuo ego ahụ a gwara ya kwụọ.

  3. Gọvanọ Nyesom Nwike etinyela mmachi ngaghari ọzọ na steeti ya

    Gọvanọ Rivers steeti bụ Myeson Wike etinyela mmachị ngagharị na steeti ya ruo awa iri abụọ na anọ n’ụfọdụ akụkụ steeti ahụ dịka emume ndị omekome na-arị elu nakwa mwakpo.

    Ọ kpọpụtara ebe ahụ mmachị a ga-adị kpọmkwem dịka okpuru akwammiri Okoro-Nu-Odu dị na Rumuokoro ruo izụ ụka abụọ.

    Mana otu ụlọọrụ na-arụ ọrụ n’okpuru akwammiri ahụ agaghị esonye na mmachị ahụ ka ọrụ wee na-aga n’iru.

    Gọvanọ Wike dọkwara aka na ntị ịta ntoroọbịa ọbụla gara n’ihu mebie udo na ezi nchekwa dị na steeti ahụ.

  4. Ụnụ asaala chi?

    Nke onye chiri ya zere.

    Soro anyị taa ka ịmata akụkọ kpụ ọkụ ọnụ na Naịjirịa na mba ụwa niile.

  5. Welite ụtụisi maka ndị ọgaranya - Atiku gwara Buhari

    Osote onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga bụ Atiku Abubakar ekwuola ihe Naịjirịa nwere ike ime iji si n'ọtanisi (recession) pụta.

    O kwuru na otu n'ime ha bụ iwelite ụtụisi maka ihe ndị galara ọnụ nke ọ bụ naanị ndị ọgaranya na-azụ ha.

    Atiku depụtara nke a n'akara Twitter ya ma kwuo na ihe kpatara Naịjirịa ji banyekwa n'ọnọdụ ọtanisi ọzọ bụ maka na ọchịchị Buhari egeghị ntị na ndụmọdụ ndị ọkachamarta na-enye gbasara ibelata ego a na-emefu na gọọmentị.

    Lee ihe Atiku kwuru ka e mee iji si n'ọtanisi pụta:

    • Megharịa bọjeetị 2021 maka na nke e meburu eme agaghị enwezi isi
    • Tinye ụtụisi poasentị iri n'ise na ngwa ahịa galara ọnụ (luxury goods)
    • Wepụ ọtụtụ mmefu dị na gọọmentị
    • Tinye ego na mwulite ndị mmadụ (human development)
    • Mee ka ndị ogbenye nwee ego ha ga-eji egbo mkpa
    • Kee ndị onweghị ka ọ ha ha ego site n'akara ọbaego ha
    • Tinyekwuoro ụlọorụ mmanụ agbidi nakwa ụlọọrụ ụgbọelu ndị mba ofesi ụtụisi otu pasentị
    • Wetuo ego ihe oriri na ihe ụmụ ogbenye na-egokarị
    • Gọọmentị kwụsi ibi ego aghara aghara
  6. Ndị omekome egbuola onyeisi pati PDP na Katsina steeti

    Ndị otu Peoples Democratic Party (PDP) akwaala arịrị maka ọnwụ onye otu ha bụ onyeisi pati ha n'okpuru ọchịchị Sabuwa dị na Katsina Steeti bụ Alhaji Lawal Dako.

    Dako nwụrụ n'aka ndị omekome ụbọchị Frịade ka ha gbachara ọnụ egbe ise.

    Nke a bụ onye ndọrọndọrọ ọchị abụọ ndị ajọ mmadụ a na-egbu n'ọnọdụ dị otu a n'abalị atọ.

    N'ụtụtụ taa ka anyị nwetere akukọ maka onyeisioche ndị APC na Nasarawa steeti bụ Phillip Shekwo bụ onye ndị ntọ tọorọ gbuo.

    Dako n'onwe ya ka akụkọ na-ekwu na ọ nwụrụ ụbọchị Fraịde maka egbe ndị omekome ahụ gbara ya.

    Ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ nkuzi nke Mahadum Ahmadu Bellow dị na Zarịa.

    Onyeisi PDP na steeti ahụ, bụ Salisu Majigiri, bụ onye kwuputara nke ahụ sị na "ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ ebe ahụ" .

    Akụkọ na-ekwu na ndị ahụ gbagbukwara nwa nwa Dako n'otu mgbe ahụ.

    E lielarị Lawal Dako gbara afọ iri isii (60) n'ụzọ okpukpere chi ndị Alakụba.

    Ọnwebeghị ihe ndị uweojii kwuru maka ọnwụ ya bụ nwaamadị.

  7. Gọvanọ Nasarawa aṅụọla iyi ịchọta ndị gburu onyeisi pati APC steeti ahụ

    Gọvanọ Nasarawa Steeti bụ Abdullahi Sule ekwuola na ha ga-anwụchirịrị ndị ekperima gburu onyeisi pati APC nke steeti ahụ bụ Phillip Shekwo.

    Sule kwuru nke a dịka ndị uweojii kwupụtara na ha ahụla ozu Shekwo, bụ onye ndị ntọ tọọrọ n’abalị Satọde.

    Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Bola Longe kwuru na ha hụrụ ozu nwoke ahụ n’akụkụ ọhịa dị nso na be ya.

    Gọvanọ Sule kọwara Shekwo dịka nwoke anaghị achọ nsogbu, ma bụrụkwa ezigbo onye otu APC.

    O kwuru na ọnwụ Shekwo gbawara ya obi, ma bụrụkwa nnukwu ihe ọdachi nye ezinụlọ ya nakwa ndị steeti ahụ niile.

    Ọ gara n'ihu kwuo sị: "Ọchịchị anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike ma tinye ihe niile anyị nwere ike iji hụ na ndị kpara arụ a alaghị n'ụkpọrọ."

    "Anyị ga-agbakwa mbọ ole ike kwere anyị ichekwa ndụ na akụnụba ndị mmadụ na steeti anyị."

  8. Ihe mere '9ice' na-agụ egwu ji arịọ nwunye ya mgbaghara

    Abolore Adegbola Akande bụ otiegwu ama ama dịka 9ice anọrọla n'elu intanet rịọ ụmụ Naịjirịa ka ha rịọ nwunye ya arịrịọ maka agwa ọjọ ọ kpara gbara n'elu intanet.

    N'ime onyonyo ahụ na-efegharị n'elu intanet, Nice kwuru na ọ na-rịọ nwunye ya mgbaghara maka ihe ọjọ o mere ma na-ekwu ka ụmụ Naịjirịa soro ya rịọ nwunye ya mgbaghara.

    Gịnị bụ ihe ọjọ ahụ ọ sị o mere?Ihe anyị ma

    O nweghị ihe Nice tụrụ aka bụ ihe ọjọ o kwuru o mere mana ihe nkiri ebe ya na nwaanyị ọzọ ọ kpọrọ nwunye ya na-efegharị n'elu intaneti.

    9ice alụọla nwaanyị ugboro atọ. Ọ bụzo lụọ Toni Payne mgbe ọ ka na-amalite iti egwu ọhụrụ n'afọ 2008. Ha nwere otu nwa tupu ha agbasaa maka ebubo ịgba n'ezi.

    N'afọ 2018, ọ lụrụ Adetola Anifalaje, onye na-arụ n'Amerka. Ha mụrụ otu nwa nwaanyị tupu ha agbasaa.

    Aha nwunye ya ọ na-alụ ugbua bụ Olasunkanmi Ajala Akande bụ nke ọ na-arịọ ka ndị nso nso ya rịọ mgbaghara maka ihe ọjọ o mesoro ya.

    Ihe ọ bara onyonyo mgbaghara ahụ o wepụtara n'elu instagram bụ Ụgbọ na-emi emi.

    Ihe ndị mmadụ sara arịọrịọ ya n'elu soshal midia

  9. Ndị ntọ atọrọla onyeisioche APC na Nasarawa Steetị

    Ndị uweojii Nasarawa Steeti kwuru na ndị ntọ atọrọla onyisioche pati APC na steetị ahụ bụ Philip Shekwo.

    Komishọna uweojii bụ Bola Longe sị na a tọọrọ Shekwo n’ụlọ ya n’elekere iri na otu nke abalị Satọde.

    Longe sị na a matabeghi ndị tọọrọ ya kama na o zipu ndị uweojii ka ha sie imi n'ala chọpụta ebe ndị ntọrị a nọ.

    Ka ọ dị ugbua ntọrị, ohi na mwakpo na-arị ibe ya elu, ọkachasị na mpaghara ugwu nke Naịjirịa.

  10. Ọkaikpe awụọla Trump n'ala na mkpesa o mere na Pennsylvania

    Ọkaikpe na Pennsylvania akachapụla akwụkwọ Trump gbara sị ka akagbuo ọtụtụ nde vootu e zitere n’ozi na Steetị ahụ n’oge ntuliaka.

    Ọkaikpe a bụ Mathew Brann sị na mkpesa a Trump nyere gbakwasịrị ụkwụ n’ebubo achịtaghị aja.

    Nke a ga-eme ka nkwupụta mmeri Biden meriri Trump na Steetị ahụ gbaa mgbọrọgwụ n'izuụka na-abịa dịka o ji ihe karịrị vootu puku iri asatọ akarị Trump.

    Ọ bụ ezigbo nsogbu nye Donald Trump, bụ onye na-achọ ịgbanwe mmeri e meriri ya na ntuliaka onyeisiala e mere n'ụbọchị atọ nke ọnwa Nọvemba.

    Ọ jụla ịnabata mmeri ma bo ọtụtụ ebubo metụtara nrụrụaka na ntuliaka, na-enweghi ihe akaebe.

    Isi akwara ọ na-agba ịnabata mmeri e meriri ya emetụtala usoro ihe na-eso ntuliaka mba Amerịka.

  11. Mmadụ 246 ọhụrụ butere coronavirus na Naịjirịa n'ụbọchị Satọde

    Coronavirus ka dịkwa ire dịka ọnụọgụgụ ndị butere ya na Naịjirịa n’ụbọchị Satọde dị narị abụọ iri anọ na isii site n’ozi ụlọọrụ mgbochi ọrịa bụ NCDC wepụtara.

    Ọnụọgụgụ ndị buterela ọrịa a kamgbe ọ batara Naịjirịa ji karịa puku iri isii na puku isii, ebe ndị nwụrụ dị otu puku na otu narị na iri isii na isii.

    Ndị gbakwara akarịala puku iri isii na otu puku.

  12. Igbo ndị ọma anyị ekele ooo

    Obi sara mbara ka anyị ji asị unu nnọọ n'isonyere anyị taa.

  13. Olileanya Trump amawala afọ n'ala ka Biden merikwara na Michigan ọzọ

    Donald Trump enweela ndọghachị azụ ọhụrụ na mbọ ọ na-agba ịgbanwe mmeri e meriri ya na ntuliaka Amerịka dịka ndị omeiwu Michigan jụrụ ịkatọ mmeri Joe Biden.

    Ndị omeiwu abụọ si na pati Repọblikan kwuru na ha ga-eso usoro kwesiri ekwesị iji hụ na vootu ndị a bụ ezi dịka ha.

    N'ụbọchị Fraịde ka steetị Georgia wụrụ onyeisiala mba Amerịka n'ala site n'ịkwado obere ihe Joe Biden ji merie Trump.

    A na-atụ anya na Biden bụ onye Demokrat ga-ewere ọchịchị n'ụbọchị 20 Jenụwarị, dịka onyeisiala nke 46.

    Ndị 'electoral college' na-ekpebi onye meriri nyere Biden na Trump vootu dị 306 na 232 - Nke Biden karịrị vootu ole a chọrọ iji merie nke bụ 270. Ebe vootu o nwetere n'ọha karịrị nde 5.9.

    Trump bụ onye na-apụtachabeghi ezi kamgbe e mere ntuliaka na Nọvemba a, pụtara na Fraịde ọzọ kwuo na o meriri. "E meriri m", o kwuru, dịka ọ na-agbasaozi maka ọnụego ọgwụ.

    O bola ọtụtụ ebubo maka nrụrụaka na ntuliaka mana o gosibeghi akaebe.

    Onye odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Kayleigh McEnany boro ndị ntaakụkọ na ndị Demokratz ebubo inwe ihu abụọ.

  14. Naịjirịa abanyela n'ọnọdụ ọtanisi

    Ngalaba na-ahụ maka mgbakọ na Naịjirịa bụ nke Bekee kpọrọ National Bureau of Statistics (NBC) ekwuola na mba ahụ abnyela n'ọnọdụ ọtanisi Bekee kpọrọ "recession'.

    NBC kwuru nke a taa dịka akụnaụba ya bụ mba gbadara ruo pacenti 3.62 n'agba nke atọ nke afọ 2020 n'ọnọdụ Bekee kpọrọ "contraction".

    Nke a bụ ugboro abụọ n'ime afọ ise.

    Kedụ etu recession si abịa?

    Recession na-eme oge akụnụba a kpọrọ "Gross Domestic Product" (GDP) gbara ọnnọdụ negative na-agba nke agba abụọ.

    NBS kwuputere ọnọdụ a Naịjirịa nọ n'akwụkwo ozi ha wepụtara n'akara Twitter ha taa.

  15. Ọtụtụ ogbunigwe agbaala na Kabul, isiobodo Afghanistan

    Ọtụtụ ogbunigwe agbaala na n'etiti obodo Kabul, Afghanistan gụnyere nke metụtara n'akụkụ ebe ọtụtụ isiụlọọrụ mba ndị ọzọ dị a kpọrọ Green Zone ka ndị ọrụ mere ka a mata

    A mabeghi ndị merụrụ ahụ maọbụ nwụrụ anwụ mana ogbunigwe a gbara ọtụtụ mmadụ na-ejukarị n'Afghan.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ferdawz Faramarz kwuru na a gbara ọtụtụ ogbunigwe ebe foto si na soshal midia na-egosi ọtụtụ ihe ogbunigwe a mebiri.

    Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo sị obere ogbunigwe abụọ gbara n'isi ụtụtụ Satọde nke otu gbara ụgbọala ndị uweojii gbuo otu onye uweojii ma merụọ atọ ahụ.

    O nwebeghi ndị pụtarala kwuo na aka ha dị n'ogbunigwe a nke na-abịa dịka ọgụ na ọgbaghara na-eme n'Aghanistan na nso nso a.

  16. Ndị ọgba ọsọ na-achịpụ ya na Kaduna ugbua

    Ndị ọgba ọsọ no Kaduna steeti ugbua dịka asọmụpị ọsọ a kpọrọ Kaduna Marathon malitere n'ụtụtụ Satọde.

    Ndị ọgba ọsọ si mba 23 sọ achụ ọla na ya bu emume nke na-abịa dịka ndi ntọrị na ndị na-emekpa obodo ahụ na-enye nsogbu na ya bụ steeti.

  17. DSS ekwuola ọ bụ onye otu ha gburu Ifeanyi Okereke n'Abuja

    Ngalaba nchekwa Bekee kpọrọ "Department of State Service" (DSS) ekwuola aha onye otu ha gbagburu ore akwụkwọ akụkọ Ifeanyi Okereke n'Abuja n'ụbọchị Tụụzde n'Abuja.

    Ọnụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunanya si na onye mere ihe bụ onye ọrụ ha no ọrụ nchekwa n'ogige Onyeisi Ndị Omeiwu Obele nke Naịjirịa.

    Maazị Afunanya sị na ha amalitela inyocha ihe mere dịka ha ji ya bụ nwoke.

    DSS gawa n'ihu kwee nkwa na ha ga-eme nyocha n'ụzọ kwụ ọtọ ma gbaa ihe niile n'anwụ.

    Ha gara n'ihu tie ezinaulọ Okereke aka n'obi ma sị ka ha diwe ihe mere.

  18. Donald Trump Jr ebutela coronavirus

    Ọkpara onyeisiala Amerịka Donald Trump ebutela coronavirus, dịka ọnụ na-ekwuru ya siri kwuo.

    Ọ sị na nyocha chọpụtara na Donald Trump Jr, dị afọ 42, butere coronavirus na mbido izu ụka ma banye ịnọdụ iche na ulọ nta ya kemgbe ahụ.

    N'ime akwụkwọ ozi o wepụtara, ọ sị : "O nweghi ama ọrịa ọbụla dịka ọ na-eso usoro ndị ọrụ ahụike wepụtara maka ọrịa a."

    Don Jr bụ onye abuọ n'ụmụ onyeisala Amerịka butere ọrịa a.

    Barron Trump, dị afọ 14, butere ọrịa a n'ime ọnwa gara aga, mana ọ gbakere ọsịsọ.

    Don Jr sọ na ndi ọnụ na-eru n'okwu banyere ndọrọndọrọ ọchịchị nna ya nọ n'ime ya.

    A na-echekwe na Don Jr n'onwe ya nwere ebumnuche ịzọ oche onyeisiala Amerịka, mana ọ na-ekwuda ya bụ atụmatụ.

    Enyi nwaanyi Don Jr bụ Kimberly Guilfoyle, bụbu onye ntaakụkọ na Fox News, butere coronavirus na Jụlaị ma gbakee.

    Don Jr ebuteghi ya n'oge ahụ.

  19. Ndị ohi ịntanet wakporo tekịnụzụ otu Manchester United

    Otu egwuregwu bọọlụ Manchester United ekwuola na ndị omekome wakporo ngwa tekịnụzụ ha.

    Otu a kwuru na ndị ọkachamara n’ihe banyere ịntanetị ewerela ọnọdụ ma sị na o nweghi ihe ha ọbụla e mebiri.

    Ha sị na ngwa tekịnụzụ ha dịka websaịt, soshal midia na appụ ka kwụ chịm na o nweghi ihe mere ha.

    Manchester United na-akwado ịnabata Westbrom n'asọmpi Premier League n'ọgbọegwuregwu Old Trafford n'ụbọchị Satọde.

    Ha sị na mwakpo agaghị emetụtaghị asọmpi ahụ.

  20. Biko ka a gbatara ndị ọgụ na-ada na Tigray, Ethiopia metụtara ọsọ enyemaka - Guiterres

    Onyeisi otu United Nations bụ Antonio Guterres arịọla ka e mepee ọnụụzọ enyemaka iji nyere ndị mmadụ ọgụ na-eme na mpaghara Tigray nke Ethiopia metụtara aka.

    Guterres bụ onye kwuru nke a na New York sị na gọọmentị mba Ethiopia ajụla ịnabata arịrịọ ka e mee udo nke mere ọgụ e gburula ọtụtụ mmadụ ka ji na-aga n’ihu.

    Otu United Nations na-akwado ịnabata ndị gbara ọsọ ndụ ruru puku narị abụọ na mba dị ha n'akụkọ bụ Sudan n'ime ọnwa ndị na-abịa - mmadụ puku iri atọ abatalarịị.

    Mba Saụt Afrịka bụ ndịisi otu jikọtara mba Afrịka (African Union) sị na ọ na-ezipu ndị okpe udo mmadụ atọ na mpaghara ahụ.

    Praịm mịnịsta mba Ethiopia bụ Abiy Ahmed malitere iji ndịagha awakpo Tigray n'izuụka abụọ gara aga iji chutuo pati nọ n'ọchịchị, nke ọ sị na-enupuru gọọmentị etiti isi.