Gịnị na-esere ndị Ọkada, ndị agboro na ndị ọrụ nchekwa na Festac, Legọs?
N’ehihie a ka akụkọ ọgbaghara dapụtara n’ebe a na-akpọ Apple Junction dị Festac nke Legọs Steetị.
A malitere ịnụ ụda egbe aghara aghara, ịmụ ụkwụ ‘tire’ ụgbọala ọkụ nke mere ka ndị bi n’ogbe ahụ ji na-azọ isi onwe ha.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo bi nso n’ogbe ahụ sị kepu kepu ọ nụrụ bụ na ọgbaghara a bụ n’etiti ndị uweojii na ndị ọkwọ ụgbatumtum bụ Ọkada.
Ọ sị na ọ nụrụ ụda egbe ma hụkwa dịka a mụnyere ọtụtụ ụkwụ ‘tire’ ụgbọala ọkụ.
Ọ sị na ọ hụkwara ka ndị ọgbatumtum bucha ngwa ọgụ dị iche iche na-agba n’okporoụzọ.
Akụkọ kwuru na ndị uweojii jichiri ọgbatumtum otu nwoke, nke mere ndị ọgbatumtum ọzọ na-eti mkpu sị ka e mechie uweojii “end police”.
Na ndị a chọkwara ịgba ụlọọrụ ndị uweojii ahụ ọkụ nke mere ndị uweojii ji na-agba egbe iji chụsasịa ha.
Ndị uweojii a mechisiri ụzọ e si abata maọbụ agafe n’ụlọọrụ ha.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo mekwara ka anyị mata na ndịagha ejupụtalan’ụzọ niile gbara ebe ahụ gburu gburu.
Ọ sị na ụgbọala niile na-agbafe ebe ahụ tinyechara akwụkwọ ahịhịa ndụ ndụ n’ihu ụgbọala ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Olumuyiwa Adejobi azaghị ekwentị ya mgbe BBC Igbo kpọrọ ya.