ASỤỤ Strike: Gọọmenti ekwetala ịgwụ ASUU ijeri naira 65
Gọọmenti Etiti ekwetala inye otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum a kpọrọ ASUU n'ịchafụ ijeri Naira 65 maka ụgwọ e ji ha eji nakwa ịhazigharị ọnọdụ agụmakwụwọ.
Nke a so na nkwekọrịta ha nwere na ọgbakọ ASUU na Gọọmenti nwere ụbọchị Fraide.
Nkwa na na-abịa dịka ụmụakwụkwọ mahadum mere ngagharịịwe maka mmechi e mechiri ụlọakwụkwọ mahadum nke gọọmenti na Naijiria kemgbe ọnwa asatọ n'ihi nghọtahịe dapụtara n'etiti ndị nkuzi ha na gọọmenti etiti n'ihe gbasara ọdịmma ndị nkuzi nakwa agụmakwụkwọ.
Gọọmenti kwetakwara iji usoro 'Integrated Financial Management Information System' ganye mgbe a kwadochara usoro nke ASUU chọrọ bụ 'University Transparency and Accountability Solution' (UTAS ).