Nwanne nwata akwụkwọ Elihan dị n’ahịa Agric nke Ikorodu
Legọs gwara BBC na o cheghi na nwanne ya nwụrụ ọnwụ chi ya.
Akụkọ sị na soshal midia sị na Boluwatife Omeleja dị
afọ iri na anọ dara n’ụlọakwụkwọ ha ma nwụọ n’ụbọchị Tọsde.
Ridwan Oyewumi, gwara BBC na ọ bụ nwanne Bola sị na
ebulatara ozu Boluwatife si n’ụlọakwụkwọ ha Elihans College, Ikorodu.
Mana o teghi aka e lie ya dịka okpukperechi ndị alakụba
si dị.
Ridwan sị na nna ha kwuru na ọ gaghị ewepu okwu ọnwụ
Bolu n’ụlọikpe mana ọ dị mkpa ka ha mara ihe gburu ya.
Akụkọ sị na a kpọrọ nna Bolu kaọ bịa n’ụlọakwụkwọ na
Bolu dara n’ala ma daa mba.
Dịka nna ya na-aga, ha hụrụ onye nkuzi na nwata akwụkwọ
bu Bolu n’ụgbọala mana ọ naghị emegharị ahụ.
Mgbe ha bu ya gaa n’ụlọọgwụ, dọkịta kwuru na Bolu anwụọla
Mana ndịisi ụlọakwụkwọ sị na nwata ahụ dara n’ala nwụọ
mgbe ọ na-aza ajụjụ.
Kedụ ihe mgbagwoju anya dị n’ọnwụ Bolu?
BBC hụrụ ozi Ridwan depụtara na twitter na-ebo otu onye nkuzi a kpọrọ Emmanuel ebubo ikugbu nwanne ya Bolu.
Ọ sị na nwanne Bolu ọzọ nọ n’ụlọakwụkwọ a bụ Lateef sị na ọ bụ Emmanuel kụrụ Bolu mere o ji daa na-amaghịzi onwe ya.
Nwanne Bolu chọọrọ onye nkuzi Emmanuel gaa n’ụlọ ya ugboro abụọ mana ahụghị ya.
BBC Igbo kpọrọ akara ekwentị Oduwole G.A bụ onye ezinaụlọ nyere akara ekwentị ya.
Ọ sị na ọ nọ n’ụlọọrụ ndị uweojii na ọ gaghị azali ekwentị ya ugbua.
Kedụ ihe ndị uweojii kwuru?
BBC Yoruba kpọrọ onyeisi ndị uweojii n’Ikorodu mana ọ sị na ọ maghị ihe banyere akụkọa a.
Ugbua amabeghi ihe gburu Bolu kpọmkwem, ọ ga-adị mma isi imi n’ala chọpụta.
O nweghi ebe a hụrụ onye nkuzi Emmanuel a na-ebo ebubo ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ọnwụ Bolu.