"Aga m eweghachite 'fuel subsidy' ma wepụ nrụrụaka dị na ya"

Ebe foto si, Peter Obi
Peter Obi bụ onye ji ọkọlọtọ pati Nigeria Democratic Congress (NDC) azọ ọkwa onyeisiala Nigeria n'afọ 2027 ekwuola na ọ ga-eweghachịte ego enyemaka gọọmentị na-akwụ iji belata ọnụego mmanụ ụgbọala a kpọrọ 'fuel subsidy' na Bekee ma ọbụrụ na o merie na ntuliaka ahụ.
O kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC nwere bụ ebe Obi kwuru na obi ya agbanwebeghi banyere atụmatụ ego enyemaka mmanụ ụgbọala kamgbe okwu banyere ya pụtara ihe.
"Agbanweghi m n'ebe m kwụụ. Ihe gbanwere bụ na mgbe ọbụla m kwuru okwu maka inwe ezi usoro a ga-agbaso, ndị mmadụ na-ekwu na-ekwu na echiche m agbanweela.
"Kamgbe m bidoro ikwu maka ego enyemaka mmanụ ụgbọala, m na-ekwusi ike na nrụrụaka bụ nnukwu nsogbu dị na ya."
Obi gara n'ihu kwuo sị na ọ ga-eweghachịte ego enyemaka ahụ gọọmentị na-akwụ maka mbelata ọnụego mmanụ ụgbọala.
"Ee, m ga-eweghachite ya, mana chetakwa na akọwara m na a ga-ewepụ nrụrụaka dị na ya."
'E meriri m ntuliaka afọ 2023 mana e nweghi ihe akaebe'
Mgbe a jụrụ Peter Obi maka ihe o kwuru na ọ bụ ya meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2023 kama na e ji aghụghọ napụ ya ọkwa ahụ.
Obi kwuru na ọ chọghị ịlaghachị azụ n'ihe mere eme na mbụ kama na ihe ọ maara bụ na o meriri na ntuliaka aka ahụ mana o nweghi ihe akaebe.
"Eziokwu, anaghị m achọ ịlaghachi azụ na-ekwu ihe gachara aga, mana m ka na-ekwusi ike n'ihe m kwuru na mbụ."
Mgbe a jụrụ ya ma o nwere ihe akaebe mana Obi kwuru na o nweghi ihe akaebe.
"Enweghị m; ihe niile abụghị ịgosi ihe akaebe".
'Ọ bụrụ na ị naghị ezu ohi, nrụrụaka ga-ebelata'
BBC jụrụ Peter Obi etu ọ ga-esi buo agha megide nrụrụaka, o kwuru na ọ bụrụ na ọ bụrụ na ọ naghị eme nrụrụaka, ezinaụlọ anaghị eme ya, na nke ahụ pụtara na nrụrụaka ga-ebelata n'ọkara.
"Ọ bụrụ na ị naghị ezu ohi, ọ bụrụ na ị naghị esonye ndị na-ezu ohi, ọ bụrụ na nwunye gị maọbụ ezinaụlọ gị anaghị ezu ohi, nrụrụaka ga-ebalata site na pasentị iri ise".
Obi gara n'ihu kwuo na ọ ga-anọ n'isi ọchịchị iji hụụ na ihe niile gara ka o kwesịrị isi aga ma kọwaa na ihe mere nrụrụaka jiri karịa n'oge Onyeisiala Buhari na-achị bụ maka na ọ nọghị n'isi ọchịchị.
"Ọ na-ewute m na m ga-ekwu ihe a, mana o (Buhari) ejighị nchịkwa oge ọ nọ n'isi ọchịchị. Ihe ga-adị iche n'oge nke m bụ na m ga-anọ n'isi ọchịchị.




























