Mmadụ ọbụla ikwu na Lagos bụ 'no man's land' bụ mkpaarị - Rhodes-Vivour
Onye ji ọkọlọtọ pati African Democratic Congress (ADC) na-azọ ọkwa gọvanọ Lagos Steeti bụ Gbadebo Rhodes-Vivour ekwuola na ya na Peter Obi ka dị na mma n'agbanyeghị na ha anọghịzi n'otu pati.
"O nweghị ihe ọbụla na-esere mụ na Peter Obi. N'agbanyeghị ihe na-eme n'etiti ndị ndu anyị, ihe mbụ dị m n'obi bụ Lagos Steeti, ma mkpebi ọbụla m ga-enwe ga-abụ nke Lagos Steeti ga-anọ n'isi ya".
"Oge mbụ m zọrọ ọkwa Sịnetọ, Atiku Abubakar bụ ya ji ọkọlọtọ pati anyị na-azọ ọkwa onyeisiala ebe Peter Obi bụ osote ya. N'oge ntụliaka ọzọ, Atiku Abubakar na Peter zọrọ ọkwa onyeisiala, mana Peter Obi ji ọkọlọtọ pati anyị".
"Anọ m na ADC ugbua, Atiku Abubakar bụ onye ji ọkọlọtọ pati m na-azọ ọkwa onyeisiala. Ọ bụ ebe ahụ ka m nọ. Ya mere, anyị ga-eme ihe niile dị anyị n'aka maka pati anyị bụ ADC. Gosipụta ebumnobi anyị, gosipụta echiche anyị".
"Ndị Naịjirịa kwesịrị ịtụnyere onye ga-eme ka mba a gaa n'ihu, ma dịka ụmụ amaala, ka anyị gbaa mbọ hụ na a nụrụ olu anyị, ma gụnyekwa vootu anyị, ka o kwuru."
Oge a jụrụ ya gbasara ihe ụfọdụ mmadụ na-ekwu na Lagos bụ obodo na-enweghị onye nwe ya, Rhodes-Vivour sịrị na onye ọbụla na-eme nke ahụ bụ mkpaarị ka ọ na-akpaarị Lagos Steeti.
Ọ sịrị: O nwebeghị oge ọbụla Lagos bụụrụ obodo na-enweghị onye nwe ya. N'ime afọ anọ ọbụla ị nụ ihe dị etu a. Ị nụ na otu onye Igbo aha ya bụ Chukwu sịrị na Lagos bụ obodo na-enweghị onye nwe ya".
"Ihe ndị a abụghị eziokwu n'ihi na ndị a ị na-ekwu maka ha, ọ bụghị ndị ọmọ onilẹ ka ha na-akwụ ụgwọ? Ọ bụrụ na ọ bụ obodo na-enweghị onye nwe ya, ọ bụ onye ka ha na-azụrụ ala n'aka ya? Onye ọbụla ikwu na Lagos bụ obodo na-enweghị onye nwe ya bụ nnukwu mkpaarị. Ọ bụghị mkpaarị nye naanị m, kama ọ bụ mkpaarị nye ndị nna nna m."



