Ndị ome ihe nkiri 'Black Panther' gosiri Afrịka n'emume mbido ha

Mgbe e biputara ya

Ndị so mee ihe nkiri "Black Panther" goziri omenala Afrịka mgbe ha gara mmeme mbido ya bụ ihe nkiri nke ụlọọrụ Marvel mepụtara.

Ha niile kere ekike mba Afrịka di icheiche maka na ha kwuru sị na ọ dị mkpa igosi Afrịka nke ọma.

Chadwick Boseman bụ onye jere ozi dịka T'Challa, Eze mba Wakanda, bụ onye e ji maka ya mee ihe nkiri "Black Panther", duuru ndị ọzọ nọ n'ihe nkiri a gaa ebe emere mmeme a na Los Angeles.

Ndị dịka Lupita Nyong'o, David Oyelowo, Daniel Kaluuya, Michael B Jordan, Danai Gurira na Angela Bassett kere ekike ndị Afrịka.

N'akwụkwọ eji gwa ndị mmadụ maka mmeme a, e dere sị ha jikere ka "ndị eze Afrịka".

David na Jessica Oyelowo
Nkọwa foto, David Oyelowo bụ nwa afọ Naịjirịa na Nwunye bụ Jessica so bịa emume a
Janeshia Adams-Ginyard
Nkọwa foto, Janeshia Adams-Ginyard nọchitere anya Danai Gurari dịka Okoye Dora Milaje na ihe nkiri a
Lupita Nyong'o
Nkọwa foto, Lupita Nyong'o bụ onye Kenya nweterela ihe nrite ndị na-eme ihe nkiri a na-akpọ Oscar
Chadwick Boseman
Nkọwa foto, Chadwick Boseman bụ onye mere ka T'Challa n'ihe nkiri a
Danai Gurira
Nkọwa foto, Danai Gurira bụ nwa afọ Zimbabwe mere ka Okoye Dora Milaje n'ime ihe nkiri a

Ọ ga-adị mma ka ndị ome ihe nkiri ndị ọzọ na Hollywood bido ije omume ha a?