Etu ụfọdụ ndị ntoroọbịa Nigeria si echeta ndụ Pete Edochie
Ụfọdụ ndị ntoorọbịa Nigeria akọwaala ihe ha ji echeta ndụ Pete Edochie, onye na-eme ihe ejije Nollywood nwụrụ na Wenezde 25 Nọvemba 2026 dịka ọ gbara afọ 79.
Ezinaụlọ ya kwupụtara maka ọnwụ ya ma sị na ọ nwụrụ dịka ọ rịachara ọrịa 'prostrate cancer'.
N'ajụjụ BBC gbara ụfọdụ ndị ntoroọbịa a, ha kọwara na otu n'ime ha ga-eji echeta ya bụ ụdịrị okwu amamihe na-esi ya n'ọnụ apụta.
Onye ọzọ kwuru na ọ bụ site n'ebubo Edochie nwere nakwa etu o si edosa onwe ya.
N'okwu ha "Nnukwu mmadụ adago. Oge m nụrụ ya, ọ gbakara m isi. Ọ bụ nwoke nwere ọtụtụ okwu. Ọ bụ nwoke nwere amamihe.
"Ọ bụ nwoke kara aka. Obi takara m oge m nụrụ na ọ nwụọla. Ọ fụrụ m ụfụ n'ihi ihe niile o na-emere anyị. Ihe ọbụla ị chọrọ maka omenaala, ọ ga-akọwara gị ya ka ị ghọta ya nke ọma.
"Ọ bụ nwoke pụrụiche. Ọ bụ onye e ji eme ọnụ ma a bịa n'ejije. Ọ bụkwa ezi onye na-akụzi ezi agwa na amamihe n'ihe n'ejije ọ na-eme ma na-akụziri ndị na-eto eto ihe ma na-akwanye anyị ka anyị bụrụ mmadụ dị iche.
"O mere ejije 'Things Fall Apart' nke Chinua Achebe dere nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. Amaara na ọtụtụ ndị Nollywood na-eme ejije na-agba ọhụrụ a na-elegara ya anya. Ọ dị ezi mwute na ọ nwụọla".
Kirie ihe ha kwuru n'uju:






