You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Otu nwoke atapụla nwunye ya mkpisiaka atọ

    Ụlọikpe majie dị n'Abụja ejichiela otu nwoke maka ịtapụ nwunye ya mkpịsịaka ya atọ.

    E kwughị ihe butere esemokwu ahụ mana dịka ụlọakụkọ Guardian siri kwuo, Amusu Olajide, onye ọrụ mekanịk bi n' ime obodo Gui dị na Sunka nso Abuja, kwetara na ya mere ya bụ ihe n'ezie.

    Onye Ọkaikpe nyere iwu ka e jichie ya bụ nwoke ganye oge nwunye ya gbakere n'ụlọọgwụ.

  2. Ndebanye aha maka ịtụ vootu ga-eri Naịjirịa otu ijeri naịra - INEC

    Ngalaba nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ 'Independent National Electoral Commission' (INEC), ekwuola na ọ bụ na mbido afọ na-abịa abịa ka ha ga-amalite idebanye aha ndị mmadụ maka ntuliaka afọ 2023, bụ nke a kpọrọ 'Continuous Voter Registration' na bekee

    Onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde oge ọ gara ịkọwara ndị omeiwu Naịjirịa atụmatụ mkpata na mmefu ego ha maka afọ 2021.

    Yakubu kwuru na ya bụ ndebanye aha ga-eri Naịjirịa otu ijeri naịra.

    Cheta na ndebanye aha maka ịtụ vootu kwesịrị imalite n'ọnwa Ọkụtoba afọ a, mana Inec yigharịrị ya n'ihi ọrịa coronavirus

    Yakubu gakwara n'ihu rịọ ndị omeiwu ka ha mee ngwangwa kwado iwu ntuliaka ọhụrụ bụ 'Electoral Act' nke ga-enye ndị Naịjirịa bi na mba ofesi ikike iso tụọ vootu ma oge ruo.

  3. Ihe anyị ga-eji ego anyị chọrọ igbaziri n'aka mba Brazil mee - Mịnịsta 'Finance'

    Mịnịsta na-ahụ maka nchịkọta ego bụZainab Ahmed ekwuola na Naịjirịa chọrọ ịgbazite ego dị otu ijeri dọla na ụma abụọ n’aka mba Brazil iji kwalite nkọpụta ihe oriri n’afọ na-abịa abịa.

    O kwuru nke a oge ọ gara ịkọwara ndị omeiwu atụmatụ mkpata na mmefu ego nke mịnịstrị ya maka afọ 2021.

    Zainab kọwara na gọọmentị etiti nwere atụmatụ ha kpọrọ 'Green Imperative Programme' bụ nke ha chọrọ iji nyere ndị ọrụ ugbo aka ma mee ka nri bawanye na Naịjirịa.

    Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị etiti ga-enwe ala ruru otu puku narị 'hectare' na steeti niile dị na Naịjirịa maka nkọpụta nri.

    Ọ kọwakwara na "gọọmentị ga-arụkwa okporoụzọ niile e si abanye n'ugbo ndị ahụ iji mee ka ọ dịrị ndị ọrụ mfe ịga ọrụ nakwa ibupụta ihe ubi ha mepụtara."

  4. Obiano ewepụtela bọjeetị nke afọ 2021

    Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano ewegarala ndị omeiwu steeti ahụ atụmatụ mkpata na mmefu ego maka afọ 2021, bụ nke Bekee kpọrọ 2021 'budget'.

    Dịka atụmatụ ahụ si dị, ego Obiano wepụtara maka iji rụọ ọrụ n'Anambara steeti n'afọ 2021 bụ otu narị ijeri naịra, na ijeri naịra iri anọ na atọ na ụma (143.6 billion).

    Ihe Obiano kpọrọ bọjeetị a bụ “Budget of Economic Recovery and Consolidation”.

    E kere ya bụ bọjeetị ụzọ abụọ: otu ụzọ bụ ego a ga-eji rụpụta ihe a na-ahụ anya, Bekee kpọrọ ya 'capital expenditure'; nke ọzọ bụ ego a ga-eji kwụọ ụgwọ ma mee ihe ndị ọzọ na-adapụta kwa mgbe kwa mgbe, bụ nke Bekee kpọrọ 'recurrent expenditure.'

    'Capital expenditure' nke afọ a bụ ijeri naịra iri asatọ na isii na ụma (N86.88 billion) nke pụtara pasentị iri isii na ụma ise (60.5%) nke bọjeetị ahụ.

    N'aka nke ọzọ, 'recurrent expenditure' bụ ijeri naịra iri ise na isii na ụma asaa (N56.77 billion) nke pụtara pasentị iri atọ na itoolu na ụma ise (39.5%) nke bọjeetị ahụ.

  5. Maradona wara akpụ n'ụbụrụisi

    Ọkpankọ ama ama n'egwubọọlụ bụ Diego Maradona awaala akpụ ụbụruisi.

    Ndị dọkịnta na-elete ya anya sị na-emere ya n'udo.

  6. Atọhapụla mmadụ 17 ndị ntọ ji na Nasarawa steeti

    Ozi ọma pụtara taa bụ na ihe karịrị mmadụ isi na asaa atọọrọ izu gara aga na Nasarawa steeti enwerela onwa.

    Otu onye n'ime ndị ahụ gwara ndị nta akụkọ na ha kwuru nde Naịra abụọ na ụma abụọ maka ịtọhapụ ha.

  7. Dịka ana agụ mpụtara ntuliaka mba Amerịka, Twitter amachiela onyeisiala Trump izisa ozi gbasara ya

    Dịka ndọrọndọrọ ọchịchị onyeisiala mba Amerịka na-akpọtụ, Joe Biden na Donald Trump ekwuola na obi kara ha n'ogogo mpụtara na steeti nke akpọpụtagoro.

    Ka ọ dị ugbua, Twitter amachiela Trump izipu ozi ọbụla gbasara nrụrụaka na ya bụ ntuliaka.

  8. 'Kamera dị na Lekki 'tollgate' anyụọlarị ka ọkụ kemgbe elekere asatọ nke abalịụbọchị ahụ' - LCC

    Ị nụkwara na camera dị na Lekki Toll gate kwusiri ịrụ ọrụ n'elekere asatọ nke abalị ụbọchị ahụ agbara ụmụmmadụ na-eme ngagharịiwe Endsars egbe?

    Onyeisi ndị Lekki Concession Company bụ Abayomi Omomuwasan gwara ndị kọmitii na-elebe anya na ya bụ okwu ụbọchị Tuzde n'ọgbakọ nke anọ ha mere bụ nke ha ji elebe anya na ndị kpara arụ site n'ịgba egbe n'ụbọchị ahụ.

    Ihe karịri izuụka abụọ ndị ana eche na ha bụ ndị agha Naịjirịa gbachara ya bụ mkpam mkpa, ya bụ kọmịtịị ka na etịnye anya ịchọpụta onye sị ha gbaa ya bụ egbe.

    Ndị agha Naịjirịa na ekwusi ike na ọbịghị ha gbara ya bụ egbe agbanyeghị na ahụrụ ndị ya akwa ndị agha n'ihe onyonyo na-efegharị ka ha na-agba ya bụ egbe.

    Ọ kwa eziokwu na ha mechere kweta na Gọvanọ Legọs ziri ha ga mee ka udo lọhachie ebe ahụ mana na-ọbụgị ha gbara ya bụ egbe. dịka onyeis ha na 81 divishọn bụ Osoba Olaniyi siri kwuo.

  9. Ndị NYSC ga-eme nnyocha coronavirus tupu anabata ha n'ogige ọzụzụ ha

    Ụlọọrụ NCDC ekwuola na ha ga-eme ụmụntorobia ji otu afọ efe ala nna nnyocha coronavirus tupu ha abata ogige ọzụzụ ha Bekee kpọrọ orientation camp.

    Onyeisi ndị ụlọọrụ a bụ Chikwe Ihekweazu bụ onye kwuru nke a mgbe ọ na agwa ndị ntaakụkọ okwu ụnyaahụ siri na nke a ga-enyere ha aka ịmata ka ọnọdụ dị na ebe ndị ọzọ na Naịjirịa.

    O kwukwara na gọomentị amalitela nke ha kpọrọ Infection Prevention and control Vangard bụ nke ọ rịọrọ ndị ntorobịa chọrọ isonye ka ha bịa tinye aha ha maka ọzụzụ.

    Ihekweazu sị na ha na-atụanya na nne na nna ga-enyeaka ịgbaziri ụmụ ha ezigbo ụzọ maka ihe ha kwesiri ịme.

  10. Ụnụ asaala chi e! Ndu mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.

  11. Ka chi fo

    Ọ bụ ebe ka anyị ga-apịachi nke taa.

    Sonyere anyị echi.

    Ndewo.

  12. Trump ekelela ụmụ Naijiria meere ya mgbasaozi nkwado

    Onyeisiala Mba Amerịka bụ Donald Trump eekela ụmụ Naijiria gosiri ya nkwado site na ngaghrị ha mere ya na Naijiria.

    O kwuru 'ọ bụ nnukwu ihe nkwanye ugwu."

    Taa ka mba Amerika mere atụmvootu iji họpụta otu n'etiti Trump na Joe Biden.

  13. Jiri otu nkeji gere akụkọ gbasara Coronavirus ka ọ dị n'Afrịka

  14. Umahi ewetuola ụgwọ akwụkwọ mahadum 'Ebonyi State University'

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahi ewetuola ụgwọ akwụkwọ ụmụakwụkwọ mahadum "Ebonyi State University."

    Dịka ozi nke odeakwụkwọ gọọmenti steeti ahụ bụ Kenneth Ugbala binyere aka ma wepụtara, nd Umahi iji puku naira iri abụọ wetuo ụgwọ akwụkwọ ndị bụ ụmụafọ Ebonyi steeti ma were pnaira puku iri wetuo nke ndị abụghị ụmụafọ steeti ahụ.

    Dịka Umahi siri kọwara , nke a bụ iji belatara ndị nne na nna ụfụ so ụkọ ego nke ọrịa coronavirus butere.

  15. Oloidi, onye nkuzi mahadum 'University of Nigeria' anwụọla

    Ụmụakwụkwọ nakwa ndị nkuzi na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' nọ n'iru ụjụ dịka otu onye nkuzi mahadum ahụ kajara akaja bụ Ola Oloidi hapụrụ ụwa ụbọchị Monde, abalị abụọ nke ọnwa Novemba afọ 2020.

    Onyeisi ngalaba "Fine and Arts" na mahadum ahụ bụ Ọkammụta Ozioma Onuzulike kwuru na "ọ zụọla ọtụtụ ndị nwere PhD."

    "Ọ bịara Nsukka na 70s, oge ọtụtụ n'ime anyị ka na-asa ahụ n'afọ n'afọ."

    Ndị mara Oloidi na-ekwu na ya bụ onye nkuzi bụ onye obi umeala na-akpakarị ọchị.

    Onuzulike kọwara sị, " Ebe ọbụla ọ hụrụ gi ọ ga-amasị gị njakịlị, gwusa gị egwu. Ndị mmadụ jiri ya mara ya."

    Oloidi ebiela ala Igbo ihe karịrị afọ iri atọ.

    Ola Oloidi tupu ọ nwụọ bụ ọkaibe na nkuzi " Art History" na "Art Criticism" ma bụrụ kwa onye a ma dịka "nna 'Modern Nigerian Arts History'.

    Ọ bịdoro ọrụ na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' n'afọ 1976 dịka 'Lecturer II' rute afọ 1996 oge o nwetara nzere 'Professor' n'afọ 1996.

  16. E nweghị 'Restructuring,' o nweghị ebe Naijiria ji azụ aga- Ohaneze, Afenifere, Ihe Nnamdi Kanu, Onyeka Onwenu, Pat Utomi na ndị ọzọ kwuru maka 'restructuring', mmekọrịta Yoroba na Igbo

    Ndị nwere agba n'Igbo nakwa ala Yoroba ekwuola na Naijiria agaghị enwe ọganihu ọbụla ma ọ bụrụ na enweghị nhazigharị na mpaghara na mpaghara nke Bekee kpọrọ 'Restructuring'.

    Ha kwuru nke a n'ọgbakọ 'Handshake Across the Niger' nke otu Njịkọ Ụmụnna hibere ụbọchị Monde ma kpoo noku ka ndị Igbo na ndị Yoroba jikọọ ọnụ were chọba ọdịmma Ndịda Anyanwụ.

    Lee ihe ụfọdụ ndị bịara ọgbakọ ahụ e mere n'ikuku kwuru:

    Ayo Adebanjo

    Okenye Yoroba bụ Ayọ Adebanjo gwara ndị Igbo sị, "a na-aghọgbu ụnụ si na-aga enye ụnụ ọkwa onyeisiala" ma sị na ọ kara onye ọbụla mma ka a hazịgharịa Naijiria, ugbua.

    "E meghị otu a ị mara ihe a chọrọ bụ ka Naijiria kewasịa."

    O kwuru na etu e siri hiwe Iwu Naijiria mere ya ka ọ bụrụ naanị otu mpaghara nwere ike ikpebi ebe onyeisiala ga-esi.

    "Onye ọbụla megidere 'restructuring' bụ onye iro Naijiria. Buhari bụ onye iro Naijiria n'ihi na ọ jụrụ ịhazigharị Naijiria ugbua."

    Onyeka Onwenu

    Otiegwu a ma ama bụ Onyeka Onwenu bụ onye jiri ngagharịiwe EndSARS maa atụ tụrụ arịrị sị na oge ọbụla e nwere nsogbu maọbụ nghọtahie na Naijiria, na ndị ọzọ na-ebokarị ya ndị Igbo.

    "Aghọtaghị ihe butere oke akpọmasị a. Ọtụtụ ndị iji nnukwu anya ele gara n'ihe onyonyo TV kwuo na ndị Igbo bụ ha nyụrụ ihe na-esinụ."

    O kwuru na oke asị e e nwere n'ebe ndị Igbo nọ mere ka ndị Igbo na-achị obi n'aka mgbe ọbụla.

    Ọnwenu onye rụtụrụ aka na nkwenye ndị Yoroba na nke ndị Igbo yitere, kporo oku ka ha jịkọta ọnụ were chọba ihe dara mmiri.

    Pat Utomi

    Ihe so mee ka Naijiria na-akpụ afọ n'ala bụ na na anyị nwere ọchịchị bute ka e rie.

    Utomi kwuru na nsogbu ọtụtụ nwere bụ na " anyị nwere bụ anyị anaghị agụ akwụkwọ maka ihe mere oge ochie" ọs ị na ọ bụ ya mere na ndị Igbo na ndị Yoroba si n'otu ezinaụlọ ma e lee asụsụ ha.

    Nnamdi Kanu

    Nnamdi Kanu kwuru na ma e tere ogiri ma e tere ụgba, na nkwenye ya bụ na nnwereonwe nke a ga-esi na referadum nweta.

  17. Ala ọma jijiji mere na Turkey ataala isi mmadụ 100

    Ndị nwụrụ n’ihe mberede ala ọma jijiji mere na mba Tọkị n’ụbọchị Fraịde gara aga eruola otu narị mmadụ ugbua.

    Mana n’ụbọchị Mọnde, ndị ọrụ gbatagbata zọpụtara ụmụ aka abụọ gbara afọ atọ na afọ iri na anọ na ya bụ ihe mberede.

    Ihe karịrị mmadụ narị abụọ merụkwara ahụ na ya bụ ihe mberede.

  18. E

    Ndịagha Naịjirịa ejichiela ụfọdụ ndị otu ha e gosiri n’onyonyo ebe ha na-apịa otu nwaagbọghọ ụtarị n’ike n’Oyo steeti, maka na ha sị na o yi akwa adịghị mma.

    Akụkọ kwuru na ndị agha ahụ jidekwara ụfọdụ ụmụokorobịa ma kpụchaa ha isi, maka na ha sị na ha bu ntutu ekwesịghị ekwesị.

    Onyeisi otu ndịagha a kpọrọ 'Operation Burst', rịọkwara ezinụlọ nwata nwaanyị ahụ ka ha gbaghara ihe niile ndị agha ahụ mere ha.

    O kwuru na ndị mere ihe ahụ ga-anata ntaramahụhụ dịịrị ha.

  19. Gọọmentị ga-akwado ụlọọrụ ụgbọelu maka ihe isi ike coronavirus kpatara

    Gọọmentị etiti ewepụtala ijeri naịra ise iji nyere ngalaba njem ụgbọelu aka ma kwado ha maka ihe isi ike so ọrịa coronavirus n’azụ.

    Mịnịsta njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika kwuru nke a n’ụbọchị Mọnde oge ya na ndị omeiwu nwere mkparịtaụka n'Abuja n'ụbọchị Mọnde.

    Mkparịtaụka a bụ maka mmegharị ndị omeiwu chọrọ imegharị iwu hibere otu dị icheiche dịka 'Nigerian Civil Aviation Authority' (NCAA), 'Nigerian Airspace Management Agency' (NAMA), 'Accident Investigation Bureau' (AIB), 'Nigerian College of Aviation Technology' (NCAT), 'Nigerian Meteorological Agency' (NIMET) na 'Federal Airports Authority of Nigeria' (FAAN).

    Mana ụfọdụ ndị omeiwu a kwuru na ijeri naịra ise agaghị ezu iji kwado ụlọọrụ ụgbọelu dị icheiche na Naịjirịa.

  20. NECO akpọpụtala ụbọchị uleakwụkwọ ha ga-amalite ọzọ

    Ụlọọrụ uleakwụkwọ bụ National Examiniation Council (NECO) ekwuputala ụbọchị Mọnde, na ha ga-amalitekwa uleakwụkwọ ha nke afọ 2020 maka ụmụakwụkwọ ndị ngụcha sekọndịrị na Naịjirịa gbaa gburugburu ụbọchị itoolu nke ọnwa Nọvemba a.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Azeez Sani kwuru nke a ụbọchị Mọnde maka ya bụ uleakwụkwọ ha kwusiburu n'ike maka ngagharịiwe Endsars.

    N'olu ya, Saani sị na " n'ihi nlọhachite udo na Naịjirịa nakwa Abuja, anyị ga-amalitekwa uleakwụkwọ ahụ akwusiburu site n'iwepụta usoro ọhụrụ a aga eji mee ya site na ụbọchi itoolu nke ọnwa Nọvemba ruo ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Nọvemba 2020."

    O kwuru na ha ga-ezigara ụlọakwụkwọ na ndị mmadụ usoro a na ọnwa a.