Chukwuma Soludo anatala asambodo mmeri ya n'Awka

Ụlọọrụ Inec enyefeela asambodo mmeri n'aka Chukwuma Soludo n'ụbọchị Fraịde n'Awka.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Lee etu ị ga-esi mara onye bara otu nzuzo

    Ejirimara ndị otu nzuzo

    Ndị uweojiiAnambra steeti na otu ha hiwereịjị gbasaaọzị megịde ịbanye otu nzuzo a kpọrọ POCACOV depụtara ihe dị icheiche ị nwere ike ịjị mara oge nwatakịrị banyere n’otu nzuzo.

    ·Ilee anya ka nwatakịrị si akpa agwa: ọ bụrụ na nwatakịrị bụ onye na-ekwuokwu ọfụma bịdọ na-emechi ọnụ, kwụsị ikwu okwumaọbụ onye na-akpa aghara bido na-anọ nwayọọ nke a bụ otu njirimara ma bụ ihe na-arụtụ aka na nsogbụ dị.

    ·Nwata na-ajụ ajụjụ gbasara otu nzuzo: ọ bụrụ na nwatakịrị bido na-ajụ ajụjụ gbasara otu nzuzo, maọbụ na-akpa nkata gbasara otu dị icheiche, nke a na-arụ aka na nsọgbụ dị.

    ·Ka nwatakịrị sị eme na ọ hụ ngwaagha: ọ bụrụ na nwatakịrị na-atụ nnukwu ụjụ ma ọ bụ nwee nnukwu mmasị iweta ngwaagha nke ya, nke a bụ ịhe nrụtụaka.

    ·Ka nwata si eme ndị mejọrọ ya: ọ bụrụ na nwata bịdo na-an̄ụ iyi na ya ga-emegwara ndị mejọrọ ya, mara na nke a nwereike iduba ya n’otu nzuzo.

    ·Mmaya na ọgwụike: nwata nọkata malịta n’ike bịdọ na-anụ ọgwụike na oke mmanya mara na ọ bụ otu ihe na-egosiputa agwa ndị otu nzuzo.

    Ihe eserese na-egosi ndị otu nzuzo

    ·Ịgbapụ n’ụlọ: Ọ bụrụ na nwata bịdọ na-agbapụ n’ụlọ ma nọọ ebe nne na nna ya amaghị abalị ole ma ole, mara na nke a sọ n’ihe njirimara ndị otu nzuzo.

    ·Akwa ọ na-ahụ n’anya: lee anya mara na oge o bịdọrọ na-ahụ otu akwa n’anya sịte n’akwa ọ na enyị, ịhe ngbanaaka na ịhe ndị ọzọ, mara na nke a sọ.

    ·Ka ya na ndị enyi ya sị ekwe n’aka: ndị otu nzuzu niile nwere etu ha sị ekwe n’aka. Tinye anya mara oge nwa gị bịdọrọ na-ekwe n’aka n’ụzọ na-edoghị gị anya.

    ·Ihe ọ na achọ na ịntanet: Ọ bụrụ na nwatakịrị bịdọ na-achọ etu esi emerụ mmadụ ahụ na ịntanet nakwa soshal midịa mara na nsọgbụ dị.

    Ihe ngosi onye otu nzuzo ndị uweojii ji eji

    Ihe ọnụ na ekwuru ndi Uweoji n’Anambra steeti kwuru

    Ọnụ na ekwuru ndị uweoji bụ Tochukwu Ikenga bụ onye zịpụrụ ụsọrọ e jị amara ndị nọ otu nzuzo dịka POCACOV sịrị deputa kwuru na ọ dị mma ka ezinaụlọ gbadọ anya ma hara ilepu anya ka ụmụ ha sị akpa agwa, ọkachasị ihe mgbanwe na ndụ ụmụ ha.

    Tochukwu kwụpụtara ihe mere ndị mmadụ jị abanye otu nzuzo dịka oke ịchụ ego, ndị enyi na eduhie enyi ha ụzọ na ịhe ndị ọzọ.

    N’ọkwụ ya “ụmụaka ike ụwa gwụgọrọ na ndị ịwe na-ewe maka na ezinaụlọ ha eletaghị ha anya ma meere ha ihe ha chọrọ nwereike ịba otu nzuzo ka ha were ya bọọọbọ ma mekpaa ndị obodo ahụ”.

    Ọ gara n’ịhụ kwụọ na ka nne na nna mmadụ sị akpa agwa nwereike ịme ka nwatakịrị banye n’otu nzuzo na ọ bụrụ na onwere onye nọ n’ụdụrị ajọ otu ahụ n’ezinaụlọ ya.

    Ihe na-egosi ebe ndị otu nzuzo na-enwe nzuko
  2. Mahamat Deby, onyeisi ndịagha Chad emeriela na ntụliaka onyeisiala

  3. South Africa: Ihe ha tụrụ anya afọ 30 na nnwereonwe ga-ewetara ha o mezuola?

  4. Hope Uzodimma: Iwu Naịjirịa ọ kwadoro Gọvanọ ịhọpụta onwe ya dịka kọmịshọna?

  5. "Ndị PDP Imo steeti niile so Ihedioha aga ebe ọbụla ọ na-aga" - Barr. Kissinger

  6. Etu e si lie Chukwuemeka Ezeife (Okwadike) bụbu Gọvanọ Anambra Steeti

  7. Lee ndị Gọvanọ chiburu ha na EFCC na-agba egwu surugede ugbua

  8. Nnamdi Kanu ekwughị na ọ gaghị apụta maka ikpe ya maọbụrụ na e meghị ihe ọ chọrọ- Ejimakor

  9. 'Emere m mmehie, ọ bụghị DJ Switch ka anyị nwụchiri ọ bụ DJ Commissioner', Benjamin Hundeyin arịọla DJ Switch na BBC mgbaghara

  10. Ihe mere n'ikpe EFCC na Cubana Chief Priest taa

  11. Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na Kano agbaala Ganduje akwukwọ ọhụrụ n'ụlọikpe

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na Kano agbaala Ganduje akwukwọ ọhụrụ n’ụlọikpe
    Nkọwa foto, Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na Kano agbaala Ganduje akwukwọ ọhụrụ n’ụlọikpe

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Kano Steeti ekwuola na ya agbaala akwụkwọ ọhụrụ megide aka chiburu Steeti ahụ bụ Abdullahi Ganduje n’ihi nrụrụakaego na ọchịchị ọjọọ.

    Onyeisioche ụlọọrụ ahụ bụ Muhuyi Magaji kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde 16 Eprel 2024 n’ihe omume ụlọọrụ mgbasaozi Channels.

    Dịka o siri kwuo “Ihe a na-eme ugbua ka bụ mmalite ya. Dịka m na-ekwu okwu ugbua, anyị na-enyocha ebubo metụtara ego ọchịchị ime obodo dị ijeri Naịra 51.3 bụ nke ewepụrụ n’akpaego gọọmenti ma kwụbanye n’akpaego mmadụ nkịtị.”

    Magaji boro gọọmenti Ganduje ebubo ịwepụ otu ijeri Naịra n’akpaego gọọmenti Kano Steeti dịka ọ fọdụrụ naanị otu ọnwa ka ọ pụọ n’ọkwa ọchịchị na Mee 2023 mana ego ahụ bụ nke ezigara n’aka ndị mgbanwerịta ego ‘Bureau de Change’ na-abụghị maka ọrụ okporoụzọ eji mawapụta ya.

    Ọ gara n’ihu sị “anyị nwere okwu banyere ijeri Naịra 4 e sitere n’akpaego Kano Steeti zigaa n’ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ubi. Okwu ndị a niile nọcha n’ihu ụlọikpe.”

    Magaji kwuru na ọ bụ eziokwu na Ganduje họpụtara ya dịka onyeisioche ụlọọrụ ahụ, na ya agaghị ala azụ iwepụ okwu ọbụla metụtara ime nrụrụaka nke gọọmentị ahụ pụrụ apụ n’ụlọikpe.

  12. Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye pati 'APC' na ‘Ward’ ya

    Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye otu APC na ‘Ward’ ya
    Nkọwa foto, Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye otu APC na ‘Ward’ ya

    Akwụsịtụla onyeisioche ‘All Progressives Congress’ (APC) bụ Abdullahi Ganduje ị bụ onye pati ahụ na wọọdụ ya dị n’okpuruọchịchị Dawakin Tofa na Kano Steeti.

    Ndị isi ọchịchị wọọdụ Ganduje nke onyeisioche ya bụ Haruna Gwanjo kpuhere nke a n’oge ọ na-agwa ndị ọrụ mgbasaozi okwu na Kano n’ụbọchị Mọnde 15 Eprel 2024.

    Gwanjo sịrị na Ganduje, onye bụụrụ aka na-achị Kano Steeti kwesịrị ịgọpụ onwe ya n’ebubo nrụrụakaego e boro ya banyere akwụkwọ ego Dọla.

    Cheta na ụlọikpe ukwu dị na Kano nọọrọ n’abalị 9 Eprel 2024 tinye abalị 17 Eprel 2024 dịka ụbọchị a ga-ekpe Abdullahi Umar Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze.

  13. Ndịagha Naịjirịa ekwuola okwu maka mwakpo e mere n'ụlọọrụ gọvanọ Oyo Steeti

  14. Down-Below: Ihe anyi hụrụ n’ime ogbe ndi omekome n' Umuahia

  15. Ụlọikpe etinyela ụbọchị a ga-ekpe Ganduje ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze

    Etinyela ụbọchị a ga-ekpe Ganduje ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze
    Nkọwa foto, Etinyela ụbọchị a ga-ekpe Ganduje ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze

    Ụlọikpe ukwu dị na Kano etinyela abalị 17 Eprel 2024 dịka ụbọchị a ga-ekpe aka chiburu Kano Steeti bụ Abdullahi Umar Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze.

    Mmadụ ndị ahụ a kpọrọ aha ga-awụcha n’ụlọikpe n’ihi ebubo mpụ asatọ, ndị gụnyere ịnara ngarị, izukọrọ ego nakwa imefu ego na akụnaụba gọọmenti aghara aghara.

    N’akwụkwọ ahụ a gbara n’ụlọikpe, mmadụ ndị ga-azara ọnụ ha n’ebubo ahụ gụnyere Abdullahi Umar Ganduje, Hafsat Umar, Abubakar Bawuro, Umar Abdullahi Umar, Jibrilla Muhammad, Lamash Properties Ltd, Safari Textiles Ltd na Lesage General Enterprises.

    Gọọmenti Kano Steeti sịrị na ya enwetala ndị akaebe iri na ise ga-agba ama megide mmadụ asatọ ahụ a na-enyo enyo n’ihu ụlọikpe.

    Etinyela abali 17 nke ọnwa Eprel dịka ụbọchị a ga-anụrụ ikpe ahụ n’ihu ọkaikpe Usman Na’aba nke ụlọikpe ukwu Kano Steeti.

    Onye ọkaikpe ukwu Kano Steeti ma bụrụkwa kọmịshọna ikpe ziri ezi bụ Haruna Isah Dederi akọwaala na ọ bụ eziokwu na Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ga-awụcha n’ụlọikpe n’ụbọchị ahụ a kpọrọ aha.

  16. Jacob Zuma enwetala mmeri n’ụlọikpe isoro zọọ ọkwa na ntụliakaelu South Africa

    Zuma, onye gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru otu pati ọhụrụ bụ uMkhonto we Sizwe (MK)
    Nkọwa foto, Zuma, onye gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru otu pati ọhụrụ bụ uMkhonto we Sizwe (MK)

    Onyeisiala Saụt Afrịka pụrụ apụ bụ Jacob Zuma enwetala ikike isonye na ntụliakaelu a ga-ahazi na mba ahụ n’ime ọnwa Mee.

    Nke a na-abịa dịka ụlọikpe na-ahụ maka ntụliakaelu tụgharịrị mmachi amachiri ya isoro zọọ ọkwa n'oge ntụliakaelu.

    N’ime ọnwa gara aga, ụlọọrụ na-ahazi ntụliakaelu na Saụt Afrịka machiri Zuma isonye na ntụliakaelu maka ịgbanahụ amamiikpe ụlọikpe.

    Zuma, onye gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru pati ọhụrụ bụ uMkhonto we Sizwe (MK).

    Dịka onye amabu ama na pati ji ọkwa ọchịchị ugbua na Saụt Afrịka bụ ‘African National Congress’ (ANC), Zuma bụ onye aha ya na-eko achịcha ma bụrụkwa onyeisiala malite n’afọ 2009 ruo 2018 bụ mgbe ọ rịturu n’ọkwa ọchịchị n’ihi ebubo mpụ na nrụrụakaego.

    A tụrụ ya mkpọrọ ọnwa iri na ise n’afọ 2021 n’ihi na ọ jụrụ ịgba akaebe n’oge a na-enyocha ya maka mpụ na nrụrụakaego, mana ka osiladị ọ gara mkpọrọ naanị ọnwa atọ n’ihi ọnọdụ ahụike ya.

  17. Naịjirịa eweghachitela $24m site na nnyocha Betta Edu

    Dr Edu gbara afọ 37 gọrọ aka na ụkwụ ya n’ebubo nrụrụakaego e boro ya
    Nkọwa foto, Dr Edu gbara afọ 37 gọrọ aka na ụkwụ ya n’ebubo nrụrụakaego e boro ya

    Ulọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission maọbụ EFCC n’ịchafụ Bekee ekwuola na Naịjirịa eweghachitela ijeri Naịra iri atọ ($24m; £19m) dịka akụkụ nnyocha a na-eme mịnịsta akwụsịtụrụ ọrụ.

    Ego ndị ahụ ka enyopuru n’akpaego karịrị iri ise.

    Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ obi ebere na mbelata ụbịam ọnụntụ bụ Betta Edu bụ onye akwụsịtụrụ ọrụ n’ọnwa Jenụwarị n’ihi ebubo itinye ego ọhanaeze dị $640,000 n’akpaego nke onwe ya.

    Onyeisiala Tinubu nọọrọ mgbe ahụ nye iwu ka e mee nnyocha na mịnịstrị ya.

    N’oge ahụ, Dr Edu gbara afọ 37 gọrọ aka na ụkwụ ya n’ebubo nrụrụakaego ahụ e boro ya.

    Ụlọọrụ ya kwuru na o nyere nkwado ka akwụbanye ego n’akpaego nkịtị nke na-abụghị nke ya maka ‘ikesaara ndị ogbenye na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ.”

    N’oge nnyocha ahụ fọdụrụ ihe ntakịrị ka o ruo izuụka isii, EFCC kwuru na ya achọtala ‘ọtụtụ akụkụ’ n’okwu ahụ nke ọ ga-enyocha.

    “Ka ọ dị ugbua, anyị na-enyocha akpaego karịrị iri ise anyị nyopuru ego ndị ahụ n'ime ya. Nke ahụ abụghị egwu ụmụaka. Nke ahụ bụ nnukwu ihe,” ya ka onyeisioche EFCC bụ Ola Olukoyede kwuru n’ozi ụlọọrụ ya wepụtara na nso nso a.

    Ọ gwara ụmụafọ Naịjirịa ndị na-achọ iti aka n’obi ka ha nye ụlọọrụ ya ohere ịpịakọta nnyocha ha.

    O kwuru sị “anyị na-eleba anya n’ọtụtụ nchọpụta ndị anyị nwetara n'oge anyị na-eme nnyocha. Ya bụrụ maka ịhụ ndị mmadụ n’ụlọmkpọrọ, ọ dị mma ka ha chere, ihe niile nwere usoro esi eme ya.”

    Olukoyede sịrị na ego ndị ahụ eweghachitere ‘abaalarị n’akpaego gọọmenti etiti Naịjirịa.”

    Ịkwụsịtụ onye mịnịsta ọrụ bụ ihe rara ahụ omume na Naịjirịa.

  18. Rwanda Genocide: Alọghịchịrị m n'ụlọ kamgbe afọ 30 m gbara ọsọndụ n'ihi ogbugbu agbụrụ

  19. N'ihi nnyocha mpụ: Nosiviwe Mapisa agbaala arụkwaghịm

    Nosiviwe Mapisa agbaala arụkwaghịm
    Nkọwa foto, Nosiviwe Mapisa agbaala arụkwaghịm

    Onyeisioche ụlọomeiwu Saụt Afrịka bụ Nosiviwe Mapisa-Nqakula agbaala arụkwaghịm dịka ndị uweojii wụchara n’ụlọ ya n’oge a na-enyocha ya maka ebubo mpụ.

    Mapisa-Nqakula bụ onye a na-ebo ebubo ịnara ngarị maka ịnyepụ ọrụngo n’oge ọ bụụrụ minister nchekwa.

    Ọ gọọla aka na ụkwụ ya n’ebubo ahụ ma kwuo na ihe mere o ji gbaa arụkwaghịm “enweghị ụzọ ọbụla o siri bụrụ ịnabata na aka ya adịghị ọcha.”

    O kwuru na dabere etu nnyocha ahụ siri dị oke mkpa na ya agaghị agakwa n’ihu n’ọrụ ya dịka onyeisioche ụlọomeiwu.

    Nwaanyị ahụ gbara afọ 67, onye sooro buo agha megide ịkpa oke bụụrụ onyeisioche ụlọomeiwu n’afọ 2021 mana tupu mgbe ahụ, ọ bụụrụ minista nchekwa ruo afọ asaa.

    N’izuụka gara aga, ndị ọkaikpe Mapisa-Nqakula gbara akwụkwọ arịrịọ iji chọọ ka ụlọikpe nye iwu ga-akwụsị ndị ọrụ nchekwa ịnwụchi ya dịka ha kwuru na nke ahụ ga-emechu ya ihu.

    N’ụbọchị Tuzde 2 Eprel 2024, ndị ọkaikpe jụrụ ịnabata arịrịọ ahụ dịka ha sịrị na okwu ahụ abụghị nke bịara na mberede ebe ha na-apụghị atụ anya nnwuchi nke na-emebeghị eme.

    Ozi sitere n’akwụkwọ akụkọ Business Day na-ekwu na a na-ebo Mapisa-Nqakula ebubo ịnapụ otu onye nwere ụlọọrụ ego ruru $120,000 (£96,000) iji nye ya ikike ibuga ngwa ndịagha mba Saụt Afrịka.

  20. E duola Bassirou Diomaye Faye n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala ọhụrụ nke mba Senegal