Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye pati 'APC' na ‘Ward’ ya
Ebe foto si, ABDULLAHI GANDUJE
Nkọwa foto, Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye otu APC na ‘Ward’ ya
Akwụsịtụla
onyeisioche ‘All Progressives Congress’ (APC) bụ Abdullahi Ganduje ị bụ
onye pati ahụ na wọọdụ ya dị n’okpuruọchịchị Dawakin Tofa na Kano Steeti.
Ndị isi ọchịchị
wọọdụ Ganduje nke onyeisioche ya bụ Haruna Gwanjo kpuhere nke a n’oge ọ na-agwa
ndị ọrụ mgbasaozi okwu na Kano n’ụbọchị Mọnde 15 Eprel 2024.
Gwanjo sịrị
na Ganduje, onye bụụrụ aka na-achị Kano Steeti kwesịrị ịgọpụ onwe ya n’ebubo nrụrụakaego e boro ya banyere akwụkwọ ego Dọla.
Cheta na ụlọikpe ukwu dị
na Kano nọọrọ n’abalị 9 Eprel 2024 tinye abalị 17 Eprel 2024 dịka ụbọchị a
ga-ekpe Abdullahi Umar Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ikpe n’ihi
ebubo izukọrọ ego ọhanaeze.
Ndịagha Naịjirịa ekwuola okwu maka mwakpo e mere n'ụlọọrụ gọvanọ Oyo Steeti
Down-Below: Ihe anyi hụrụ n’ime ogbe ndi omekome n' Umuahia
Ụlọikpe ukwu
dị na Kano etinyela abalị 17 Eprel 2024 dịka ụbọchị a ga-ekpe aka chiburu Kano
Steeti bụ Abdullahi Umar Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ikpe n’ihi
ebubo izukọrọ ego ọhanaeze.
Mmadụ ndị
ahụ a kpọrọ aha ga-awụcha n’ụlọikpe n’ihi ebubo mpụ asatọ, ndị gụnyere ịnara ngarị,
izukọrọ ego nakwa imefu ego na akụnaụba gọọmenti aghara aghara.
N’akwụkwọ
ahụ a gbara n’ụlọikpe, mmadụ ndị ga-azara ọnụ ha n’ebubo ahụ gụnyere Abdullahi Umar
Ganduje, Hafsat Umar, Abubakar Bawuro, Umar Abdullahi Umar, Jibrilla Muhammad,
Lamash Properties Ltd, Safari Textiles Ltd na Lesage General Enterprises.
Gọọmenti Kano Steeti sịrị na
ya enwetala ndị akaebe iri na ise ga-agba ama megide mmadụ asatọ ahụ a na-enyo enyo n’ihu ụlọikpe.
Etinyela abali
17 nke ọnwa Eprel dịka ụbọchị a ga-anụrụ ikpe ahụ n’ihu ọkaikpe Usman Na’aba
nke ụlọikpe ukwu Kano Steeti.
Onye ọkaikpe
ukwu Kano Steeti ma bụrụkwa kọmịshọna ikpe ziri ezi bụ Haruna Isah Dederi akọwaala
na ọ bụ eziokwu na Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ga-awụcha n’ụlọikpe n’ụbọchị
ahụ a kpọrọ aha.
Jacob Zuma enwetala mmeri n’ụlọikpe isoro zọọ ọkwa na ntụliakaelu South Africa
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, Zuma, onye gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru otu pati ọhụrụ bụ uMkhonto we Sizwe (MK)
Onyeisiala
Saụt Afrịka pụrụ apụ bụ Jacob Zuma enwetala ikike isonye na ntụliakaelu a
ga-ahazi na mba ahụ n’ime ọnwa Mee.
Nke a na-abịa
dịka ụlọikpe na-ahụ maka ntụliakaelu tụgharịrị mmachi amachiri ya isoro zọọ ọkwa
n'oge ntụliakaelu.
N’ime ọnwa
gara aga, ụlọọrụ na-ahazi ntụliakaelu na Saụt Afrịka machiri Zuma isonye na ntụliakaelu
maka ịgbanahụ amamiikpe ụlọikpe.
Zuma, onye
gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru pati ọhụrụ bụ
uMkhonto we Sizwe (MK).
Dịka onye amabu ama na pati ji ọkwa ọchịchị ugbua na Saụt Afrịka bụ ‘African
National Congress’ (ANC), Zuma bụ onye aha ya na-eko achịcha ma bụrụkwa onyeisiala
malite n’afọ 2009 ruo 2018 bụ mgbe ọ rịturu n’ọkwa ọchịchị n’ihi ebubo mpụ na
nrụrụakaego.
A tụrụ ya
mkpọrọ ọnwa iri na ise n’afọ 2021 n’ihi na ọ jụrụ ịgba akaebe n’oge a
na-enyocha ya maka mpụ na nrụrụakaego, mana ka osiladị ọ gara mkpọrọ naanị ọnwa atọ
n’ihi ọnọdụ ahụike ya.
Naịjirịa eweghachitela $24m site na nnyocha Betta Edu
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Dr Edu gbara afọ 37 gọrọ aka na ụkwụ ya n’ebubo nrụrụakaego e boro ya
Ulọọrụ
na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ Economic and Financial
Crimes Commission maọbụ EFCC n’ịchafụ Bekee ekwuola na Naịjirịa eweghachitela ijeri
Naịra iri atọ ($24m; £19m) dịka akụkụ nnyocha a na-eme
mịnịsta akwụsịtụrụ ọrụ.
Ego ndị ahụ
ka enyopuru n’akpaego karịrị iri ise.
Mịnịsta
na-ahụ maka ọrụ obi ebere na mbelata ụbịam ọnụntụ bụ Betta Edu bụ onye akwụsịtụrụ ọrụ n’ọnwa Jenụwarị n’ihi ebubo itinye ego ọhanaeze dị $640,000 n’akpaego nke
onwe ya.
Onyeisiala
Tinubu nọọrọ mgbe ahụ nye iwu ka e mee nnyocha na mịnịstrị ya.
N’oge ahụ, Dr
Edu gbara afọ 37 gọrọ aka na ụkwụ ya n’ebubo nrụrụakaego ahụ e boro ya.
Ụlọọrụ ya
kwuru na o nyere nkwado ka akwụbanye ego n’akpaego nkịtị nke na-abụghị nke ya maka
‘ikesaara ndị ogbenye na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ.”
N’oge nnyocha ahụ fọdụrụ ihe ntakịrị ka o ruo izuụka isii, EFCC kwuru na ya achọtala ‘ọtụtụ akụkụ’
n’okwu ahụ nke ọ ga-enyocha.
“Ka ọ dị
ugbua, anyị na-enyocha akpaego karịrị iri ise anyị nyopuru ego ndị ahụ n'ime ya. Nke
ahụ abụghị egwu ụmụaka. Nke ahụ bụ nnukwu ihe,” ya ka onyeisioche EFCC bụ Ola
Olukoyede kwuru n’ozi ụlọọrụ ya wepụtara na nso nso a.
Ọ gwara ụmụafọ
Naịjirịa ndị na-achọ iti aka n’obi ka ha nye ụlọọrụ ya ohere ịpịakọta nnyocha
ha.
O kwuru sị “anyị
na-eleba anya n’ọtụtụ nchọpụta ndị anyị nwetara n'oge anyị na-eme nnyocha. Ya bụrụ
maka ịhụ ndị mmadụ n’ụlọmkpọrọ, ọ dị mma ka ha chere, ihe niile nwere usoro esi eme ya.”
Onyeisioche
ụlọomeiwu Saụt Afrịka bụ Nosiviwe Mapisa-Nqakula agbaala arụkwaghịm dịka ndị
uweojii wụchara n’ụlọ ya n’oge a na-enyocha ya maka ebubo mpụ.
Mapisa-Nqakula
bụ onye a na-ebo ebubo ịnara ngarị maka ịnyepụ ọrụngo n’oge ọ bụụrụ minister
nchekwa.
Ọ gọọla aka
na ụkwụ ya n’ebubo ahụ ma kwuo na ihe mere o ji gbaa arụkwaghịm “enweghị ụzọ ọbụla
o siri bụrụ ịnabata na aka ya adịghị ọcha.”
O kwuru na
dabere etu nnyocha ahụ siri dị oke mkpa na ya agaghị agakwa n’ihu n’ọrụ ya dịka
onyeisioche ụlọomeiwu.
Nwaanyị ahụ
gbara afọ 67, onye sooro buo agha megide ịkpa oke bụụrụ onyeisioche ụlọomeiwu n’afọ
2021 mana tupu mgbe ahụ, ọ bụụrụ minista nchekwa ruo afọ asaa.
N’izuụka
gara aga, ndị ọkaikpe Mapisa-Nqakula gbara akwụkwọ arịrịọ iji chọọ ka ụlọikpe nye
iwu ga-akwụsị ndị ọrụ nchekwa ịnwụchi ya dịka ha kwuru na nke ahụ ga-emechu ya
ihu.
N’ụbọchị
Tuzde 2 Eprel 2024, ndị ọkaikpe jụrụ ịnabata arịrịọ ahụ dịka ha sịrị na okwu ahụ
abụghị nke bịara na mberede ebe ha na-apụghị atụ anya nnwuchi nke na-emebeghị
eme.
Ozi sitere
n’akwụkwọ akụkọ Business Day na-ekwu na a na-ebo Mapisa-Nqakula ebubo ịnapụ otu
onye nwere ụlọọrụ ego ruru $120,000 (£96,000) iji nye
ya ikike ibuga ngwa ndịagha mba Saụt Afrịka.
E duola Bassirou Diomaye Faye n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala ọhụrụ nke mba Senegal
'Students loan': Tinubu abịanyela aka n’iwu maka ego mgbazinye ụmụakwụkwọ
Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu abịanyela aka n’iwu maka ego mgbazinye ụmụakwụkwọ
Onyeisiala
Bola Tinubu abịanyela aka n’iwu maka ego mgbazinye ụmụakwụkwọ.
Onyeisiala
mere nke a n’obi ọchịchị Naịjirịa dị n’Abuja n’ụbọchị Wenezde 3 Eprel 2024.
Atụmatụ iwu ahụ akpọkwasara ‘mkpebi maka ịgbanwe iwu ga-arọpụtara ụmụakwụkwọ ego mgbazinye nke
afọ 2024' bụ nke ekepụtara iji hiwe akpaego a ga-eji kwadoo ụmụakwụkwọ ndị nọ n’ụlọakwụkwọ
dị elu.
N’ime ọnwa
Nọvemba 2023, ụlọomeiwu Naịjirịa kwadọrọ atụmatụ iwu ahụ bụ nke chọrọ ka ehiwe ụkpụrụ a ga-eji na-agbazinye ụmụakwụkwọ Naịjirịa ego.
Dịka onyeisi
ndị ọrụ n’obi ọchịchị Naịjirịa bụ Femi Gbajabiamila siri kwuo, iwu ọhụrụ a bụ ụdị
ya nke mbụ na Naịjirịa dịkwa ka ọ ga-enye aka ịhụ na enweghị nwaafọ Naịjirịa ọ
bụla agọnarịrị ohere agụmaakwụkwọ.
Ahọpụtala Sonko dịka Prime Minister Senegal
Ebe foto si, Ousmane Sonko/Facebook
Nkọwa foto, Praịm Minista Senegal ọhụrụ bụ Ousmane Sonko
Onyeisiala
Senegal ọhụrụ bụ Bassirou Diomaye Faye ahọpụtala onye ndu pati kachasị ukwuu
na-agba gọọmenti mba ahụ ụkwụ bụ Ousmane Sonko dịka Praịm Minista.
Ousmane
Sonko bụ onye zụlitere Faye n’igwu ndọrọndọrọ ọchịchị dịkwa ka a tụrụ ha bụ
mmadụ abụọ mkpọrọ tupu ahazie ntụliakaelu n’ọnwa Maachị.
Onyeisiala
pụrụ apụ bụ Macky Sall nyere ha mgbaghara tinyere ọtụtụ ndị ọzọ a tụrụ mkpọrọ maka
okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.
Obi ọchịchị
Senegal zipụrụ ozi n’ọbaozi X kwuo sị “n’ime awa ole na ole educhara Faye n’iyi
ọrụ, ọ họpụtala Sonko dịka Praịm Minista.”
Sonko bụ
onye a kpọrọ aha na mbụ dịka onye ga-eji aha pati na-agba gọọmenti ụkwụ zọọ ọkwa
onyeisiala tupu anwụchie ya ma kwupụta ya dịka onye na-etozughị oke isoro zọọ
ya bụ ọkwa.
N’okwu ya dịka
educhara ya n’iyi ọrụ n’ụbọchị Tuzde 2 Eprel 2024, Faye kwuru na Senegal ga-abụ
mba olileanya nke ọchịchị ọhakarasị ya ga-agbasikwu ike.
Senegal First Ladies: Lee ndị nọrọla dịka isinwaanyị mba Senegal kemgbe afọ1960
Ebe ndị uweojii kụsara akwụ ndị Ipob/ESN n'Ọwụwa Anyanwụ n'izu a
Ngagharịiwe megide Benjamin Netanyahu akpọtụọla na Israel
Nkọwa foto, Ndị ojiegbe awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ogbu nke Anambra Steeti
Ndị ojiegbe
awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ogbu nke Anambra Steeti.
Akụkọ kwuru
na njinji ahụ jiri n’ụbọchị Mọnde 25 Maachị 2024 mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere 2
nke ime abalị.
Dịka akụkọ
anyị nwetara siri kwuo, ndị uweojii nọ n’ọrụ n’abalị ahụ gbara mbọ iguzogide ndị
ojiegbe ahụ dịka ha kwakọrịtara onwe ha mgbọ ọtụtụ oge.
Ozi rutere
anyị aka kwuru na ndị uweojii mmadụ abụọ tụfuru ndụ ha n’oge mwakpo ahụ.
Ka osiladị,
ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na
ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ogbu nke Anambra Steeti n’eziokwu
mana ndị uweojii na-agba mgbọ ịchọpụta ndị kpara arụ ahụ ma nwuchie ha.
O kwukwara
na ndị uweojii Anambra Steeti ga-ewepụtara ọhanaeze ozi rijuru afọ banyere
njinji ahụ n’oge na-adịghị anya.
Labour Party: Julius Abure abaghachila n'ọkwa
Ebe foto si, Labour Party/Facebook
Nkọwa foto, Ahọpụtagharịala Julius Abure dịka onyeisioche Labour Party
Ahọpụtagharịala
Julius Abure dịka onyeisioche Labour Party.
Ndị nnọchiteanya
niile bịara nnukwu ọgbakọ Labour Party haziri jiri otu olu kwuo na ọ bụ Abure
ka ha chọrọ.
Ọ bụ n’ụbọchị
Wenezde 27 Maachị 2024 ka Abure tuuru ugo mmeri na nnukwu ọgbakọ ntuliakaelu
Labour Party haziri na Nnewi nke Anambra Steeti.
Onyeisioche
nnukwu ọgbakọ ahụ ma bụrụkwa osote aka na-achị Abịa Steeti bụ Ikechukwu Emetu
kwupụtara Abure dịka onye nwetara mmeri.
Cheta na
Julius Abure na ndị isi otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ NLC nọ kemgbe izuụka
ole na ole na-enwe nghọtahie dịka ha kpọrọ oku ka ọ gbatuo n’ọkwa.
Etu mba Senegal si wee nabata Bassirou Diomaya Faye ka o meriri ntuliaka
Abia Pension law: Alex Otti ọ napụrụ Ikpeazu, T.A Orji na Uzor Kalu ara n'ọnụ?
Alex Otti akwụsịla ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension' n'Abịa Steeti
Nkọwa foto, Gọvanọ Alex Otti abịanyela aka n'iwu iji kwụsị ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension'
Aka na-achị Abịa Steeti bụ Alex Otti abịanyela aka n’iwu iji machie ịkwụ
ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ bụ
pension.
Ọ bụ n’ụbọchị Tọzde 21 Maachị 2024 ka Gọvanọ Otti bịanyere aka n’iwu ahụ
bụ nke a maara ugbua dịka ‘Abia State Governors and Deputy Governors Pensions
(Repeal) Law 2024’.
N’oge ọ na-abịanye aka n’iwu ahụ, Gọvanọ Otti kwuru na gọọmenti abụghị maka
mmasị nke onwe n’ihi na mmasị nke onwe na-ebibi gọọmenti.
Dịka o siri kwuo “tupu iwu ọhụrụ a apụta, ọtụtụ mmadụ ndị na-eso ihe anyị
na-eme ghọtara na anyị agaghị agakwa n’ihu na-akwụ ndị ọchịchị pụrụ apụ ụgwọ ndị
lara ezumiike nka ọrụ na ego mmachi akpa ndị ọzọ.”
Cheta na ọ bụ n’ụbọchị Tuzde 19 Maachị 2024 ka ụlọomeiwu Abịa Steeti nọọrọ
bufee atụmatụ iwu nke kachapụrụ iwu nke dị adị na Steeti ahụ bụ nke nyere ndị gọvanọ
Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ikikere ịnara ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ.
Ebe foto si, Abia State House of Assembly/Facebook
Nkọwa foto, Ụlọomeiwu Abịa Steeti akwụsịla pension maka ndị gọvanọ
Ụlọomeiwu
Abịa Steeti ebufeela atụmatụ iwu iji kwụsị ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị
osote ha ịnara ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ bụ pension.
Ọ bụ n’ụbọchị
Tuzde 19 Maachị 2024 ka ụlọomeiwu ahụ bufere atụmatụ iwu nke kachapụrụ iwu
kwadoro ndị gọvanọ Abịa Steeti pụrụ apụ na ndị osote ha ịnara ụgwọ ọnwa ndị
lara ezumiike nka ọrụ.
Atụmatụ iwu
ọhụrụ ahụ akpọkwasara H.A.B 11 ga-ahụ na e nwere iwu ọhụrụ ga-akachapụ atụmatụ
iwu ‘Abia State Governors and Deputy Governors Pensions Law No 4 of 2001’ bụ
nke nyeburu ndị gọvanọ Abịa Steeti pụrụ apụ na ndị osote ha ikikere ịnara ụgwọ
ndị lara ezumiike nka ọrụ.
N’oge ọ
na-ebufe atụmatụ iwu ahụ, onyeisioche ụlọomeiwu Abịa Steeti bụ Rt. Hon.
Emmanuel Emeruwa kwuru na iwu ọhụrụ ahụ ga-enye aka belata ego Steeti ahụ
na-emefu n’usoro ọchịchị ma hụkwa na etinyere ego ndị ahụ n’ọrụ mmepe dị iche
iche.
N’oge BBC
Igbo kpọtụụrụ onye omeiwu na-anọchị anya Abịa Sentralụ n’ụlọomeiwu Abịa Steeti
bụ Hon. Chinasa Anthony, ọ sịrị “ee nke ahụ bụ eziokwu.”
A
ga-ezigaara aka na-achị Abịa Steeti bụ Alex Otti atụmatụ iwu ahụ ka ọ bịanye
aka na ya.
Ngwangwa ọ
bịanyechara aka na ya, ihe a ga-akpọzi iwu ahụ ga-abụ ‘Abia State Governors and
Deputy Governors Pension (repeal) Law 2024’.