Chukwuma Soludo anatala asambodo mmeri ya n'Awka

Ụlọọrụ Inec enyefeela asambodo mmeri n'aka Chukwuma Soludo n'ụbọchị Fraịde n'Awka.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ahọpụtala Sonko dịka Prime Minister Senegal

    Praịm Minista Senegal ọhụrụ bụ Ousmane Sonko
    Nkọwa foto, Praịm Minista Senegal ọhụrụ bụ Ousmane Sonko

    Onyeisiala Senegal ọhụrụ bụ Bassirou Diomaye Faye ahọpụtala onye ndu pati kachasị ukwuu na-agba gọọmenti mba ahụ ụkwụ bụ Ousmane Sonko dịka Praịm Minista.

    Ousmane Sonko bụ onye zụlitere Faye n’igwu ndọrọndọrọ ọchịchị dịkwa ka a tụrụ ha bụ mmadụ abụọ mkpọrọ tupu ahazie ntụliakaelu n’ọnwa Maachị.

    Onyeisiala pụrụ apụ bụ Macky Sall nyere ha mgbaghara tinyere ọtụtụ ndị ọzọ a tụrụ mkpọrọ maka okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Obi ọchịchị Senegal zipụrụ ozi n’ọbaozi X kwuo sị “n’ime awa ole na ole educhara Faye n’iyi ọrụ, ọ họpụtala Sonko dịka Praịm Minista.”

    Sonko bụ onye a kpọrọ aha na mbụ dịka onye ga-eji aha pati na-agba gọọmenti ụkwụ zọọ ọkwa onyeisiala tupu anwụchie ya ma kwupụta ya dịka onye na-etozughị oke isoro zọọ ya bụ ọkwa.

    N’okwu ya dịka educhara ya n’iyi ọrụ n’ụbọchị Tuzde 2 Eprel 2024, Faye kwuru na Senegal ga-abụ mba olileanya nke ọchịchị ọhakarasị ya ga-agbasikwu ike.

  2. Senegal First Ladies: Lee ndị nọrọla dịka isinwaanyị mba Senegal kemgbe afọ1960

  3. Ebe ndị uweojii kụsara akwụ ndị Ipob/ESN n'Ọwụwa Anyanwụ n'izu a

  4. Ngagharịiwe megide Benjamin Netanyahu akpọtụọla na Israel

  5. Ndị ojiegbe awakpoola ndị uweojii n’Anambra Steeti

    Ndị ojiegbe awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ogbu nke Anambra Steeti
    Nkọwa foto, Ndị ojiegbe awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ogbu nke Anambra Steeti

    Ndị ojiegbe awakpoola ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ogbu nke Anambra Steeti.

    Akụkọ kwuru na njinji ahụ jiri n’ụbọchị Mọnde 25 Maachị 2024 mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere 2 nke ime abalị.

    Dịka akụkọ anyị nwetara siri kwuo, ndị uweojii nọ n’ọrụ n’abalị ahụ gbara mbọ iguzogide ndị ojiegbe ahụ dịka ha kwakọrịtara onwe ha mgbọ ọtụtụ oge.

    Ozi rutere anyị aka kwuru na ndị uweojii mmadụ abụọ tụfuru ndụ ha n’oge mwakpo ahụ.

    Ka osiladị, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Ogbu nke Anambra Steeti n’eziokwu mana ndị uweojii na-agba mgbọ ịchọpụta ndị kpara arụ ahụ ma nwuchie ha.

    O kwukwara na ndị uweojii Anambra Steeti ga-ewepụtara ọhanaeze ozi rijuru afọ banyere njinji ahụ n’oge na-adịghị anya.

  6. Labour Party: Julius Abure abaghachila n'ọkwa

    Ahọpụtagharịala Julius Abure dịka onyeisioche Labour Party
    Nkọwa foto, Ahọpụtagharịala Julius Abure dịka onyeisioche Labour Party

    Ahọpụtagharịala Julius Abure dịka onyeisioche Labour Party.

    Ndị nnọchiteanya niile bịara nnukwu ọgbakọ Labour Party haziri jiri otu olu kwuo na ọ bụ Abure ka ha chọrọ.

    Ọ bụ n’ụbọchị Wenezde 27 Maachị 2024 ka Abure tuuru ugo mmeri na nnukwu ọgbakọ ntuliakaelu Labour Party haziri na Nnewi nke Anambra Steeti.

    Onyeisioche nnukwu ọgbakọ ahụ ma bụrụkwa osote aka na-achị Abịa Steeti bụ Ikechukwu Emetu kwupụtara Abure dịka onye nwetara mmeri.

    Cheta na Julius Abure na ndị isi otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ NLC nọ kemgbe izuụka ole na ole na-enwe nghọtahie dịka ha kpọrọ oku ka ọ gbatuo n’ọkwa.

  7. Etu mba Senegal si wee nabata Bassirou Diomaya Faye ka o meriri ntuliaka

  8. Abia Pension law: Alex Otti ọ napụrụ Ikpeazu, T.A Orji na Uzor Kalu ara n'ọnụ?

  9. Alex Otti akwụsịla ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension' n'Abịa Steeti

    Gọvanọ Alex Otti abịanyela aka n'iwu iji kwụsị ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension'
    Nkọwa foto, Gọvanọ Alex Otti abịanyela aka n'iwu iji kwụsị ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension'

    Aka na-achị Abịa Steeti bụ Alex Otti abịanyela aka n’iwu iji machie ịkwụ ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ bụ pension.

    Ọ bụ n’ụbọchị Tọzde 21 Maachị 2024 ka Gọvanọ Otti bịanyere aka n’iwu ahụ bụ nke a maara ugbua dịka ‘Abia State Governors and Deputy Governors Pensions (Repeal) Law 2024’.

    N’oge ọ na-abịanye aka n’iwu ahụ, Gọvanọ Otti kwuru na gọọmenti abụghị maka mmasị nke onwe n’ihi na mmasị nke onwe na-ebibi gọọmenti.

    Dịka o siri kwuo “tupu iwu ọhụrụ a apụta, ọtụtụ mmadụ ndị na-eso ihe anyị na-eme ghọtara na anyị agaghị agakwa n’ihu na-akwụ ndị ọchịchị pụrụ apụ ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ na ego mmachi akpa ndị ọzọ.”

    Cheta na ọ bụ n’ụbọchị Tuzde 19 Maachị 2024 ka ụlọomeiwu Abịa Steeti nọọrọ bufee atụmatụ iwu nke kachapụrụ iwu nke dị adị na Steeti ahụ bụ nke nyere ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ikikere ịnara ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ.

  10. Ụlọomeiwu Abịa Steeti akwụsịla ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension'

    Ụlọomeiwu Abịa Steeti akwụsịla pension maka ndị gọvanọ
    Nkọwa foto, Ụlọomeiwu Abịa Steeti akwụsịla pension maka ndị gọvanọ

    Ụlọomeiwu Abịa Steeti ebufeela atụmatụ iwu iji kwụsị ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ịnara ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ bụ pension.

    Ọ bụ n’ụbọchị Tuzde 19 Maachị 2024 ka ụlọomeiwu ahụ bufere atụmatụ iwu nke kachapụrụ iwu kwadoro ndị gọvanọ Abịa Steeti pụrụ apụ na ndị osote ha ịnara ụgwọ ọnwa ndị lara ezumiike nka ọrụ.

    Atụmatụ iwu ọhụrụ ahụ akpọkwasara H.A.B 11 ga-ahụ na e nwere iwu ọhụrụ ga-akachapụ atụmatụ iwu ‘Abia State Governors and Deputy Governors Pensions Law No 4 of 2001’ bụ nke nyeburu ndị gọvanọ Abịa Steeti pụrụ apụ na ndị osote ha ikikere ịnara ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ.

    N’oge ọ na-ebufe atụmatụ iwu ahụ, onyeisioche ụlọomeiwu Abịa Steeti bụ Rt. Hon. Emmanuel Emeruwa kwuru na iwu ọhụrụ ahụ ga-enye aka belata ego Steeti ahụ na-emefu n’usoro ọchịchị ma hụkwa na etinyere ego ndị ahụ n’ọrụ mmepe dị iche iche.

    N’oge BBC Igbo kpọtụụrụ onye omeiwu na-anọchị anya Abịa Sentralụ n’ụlọomeiwu Abịa Steeti bụ Hon. Chinasa Anthony, ọ sịrị “ee nke ahụ bụ eziokwu.”

    A ga-ezigaara aka na-achị Abịa Steeti bụ Alex Otti atụmatụ iwu ahụ ka ọ bịanye aka na ya.

    Ngwangwa ọ bịanyechara aka na ya, ihe a ga-akpọzi iwu ahụ ga-abụ ‘Abia State Governors and Deputy Governors Pension (repeal) Law 2024’.

  11. Ọ naghị ewute m na m kagburu ntuliaka mba Senegal - Macky Sall

  12. Lee otu agha nnupuisi dị iche iche na-achọ iwere ọchịchị na mba Haiti

  13. Ụlọelu ọzọ adakwala n'Ọnịcha, otu onye nwereike ka tọrọ n'ime ya

  14. Lee etu ikpe Willie Obiano na EFCC si gaa n’ụlọikpe taa

  15. Gọọmenti Enugwu ewerela katapila kwọgbuo ọkụkọ karịrị 30,000 na Nchatancha Nike

  16. Igbo Culture: Gịnị bụ Ikoro na uru ọ bara n’omenala Igbo?

  17. Onitsha building collaspe: "Amaghị m na ụlọ anyị nọ n'ime ya na-ada ada ruo mgbe m hụrụ onwe m n'ime ụvụrụ aja"

  18. NLC protest: Ndịọrụ wujuru ụzọ n'Umuahia, Abakaliki, Lagos, Abuja, mana n'Enugwu ...

  19. Rotimi Akeredolu: Etu ụka olili ya na njem ikpeazụ ya si aga

  20. Fact Check: Ọ bụ eziokwu na awụrụ mmadụ 'acid' n'ọgụ dara n'etiti Sasa na ndị ahịa Ọgbọ ọgwụ?