Military air crash: Ihe i kwesịrị ịma gbasara ụgbọelu ATR 42-500
Ụgbọelu ndịagha Naịjirịa nwere akara NGR 931 akpọkaala ma kurie na mpaghara Igbokoda dị n'okpuru ọchịchị Ilaje nke Ondo steeti n'ụbọchị Mọnde 5 Ọktoba, 2026, mana anyị ghọtara na ụgbọelu ndịagha nwere akara NGR 931 bụ ụdịrị nke a kpọrọ ATR 42-500.
ATR 42-500 bụ ụgbọelu nwere njini abụọ. Ndị rụpụtara ya bụ ụlọorụ ATR nke mba France na Italy jikọtara aka wube. Ụgbọelu ATR 42-500 anaghị agate aka, kama e mere ya maka njem ndị na-anaghị egbu oge. Ụgbọelu a na-ebu ihe ruru mmadụ 42, dabere n'ọdịdị ya.
ATR 42-500 nwere oche dị n'agbata 30 na 50. Ogologo ya dị mita 22.67, ebe obosara nku ya dị mita 24.57. Ụdịrị njini o ji arụ ọrụ bụ nke a kpọrọ Pratt & Whitney Canada turboprop engine, bụ nke nwereike ịgba ihe ruru kilomita 1,302 ma ọ bụrụ na o juru eju.
N'ozi o wepụtara n'akara X ya, Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Festus Keyamo kwuru na ndị na-ahazi njem ụgbọelu gwara ya na ụgbọelu ahụ bu mmadụ 32 nke gụnyere ndị njem 25 nakwa ndị ọrụ ụgbọelu asaa furu ka o ji nkeji iri na abụọ gafee elekere Itoolu nke ụtụtụ, oge o si Lagos na-aga Benin n'ụbọchị Mọnde 5 Oktoba, 2026.
Ka ọ dị, Onyeisiala Nigeria bụ Bola Tinubu ezipụla ozi nkasiobi nye ezinaụlọ mmadụ iri abụọ na ise (25) nakwa ndị ọrụ asaa nọ n'ime ụgbọelu ndịagha Nigeria oge ọ kpọkara.
Nke a na-abịa dịka ndịagha elu Naịjirịa wepụtachara ozi kwuo na ha amalitela ịchọ nakwa ịnapụta ndị ihe mberede ahụ metụtara.



