Tinubu enyela ezinaụlọ ndị agha ụgbọelu ahụ nwụrụ n'ihe mberede n'Osun State ego na ụlọ

Emume ncheta nakwa olili ndịagha ụgbọelu nwụrụ n'ihe mberede
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onyeisiala Bola Tinubu ekwupụtala ego onyinye dị nde N100m n'otu n'otu nye ndị ezinaụlọ ndịagha ụgbọelu mmadụ 25 nwụrụ mgbe ụgbọelu ha kpọkasịrị n'obodo Igbokoda nke Ondo State.

O kwupụtara nke a mgbe a na-eme emume ncheta ọnwụ ndị a nakwa olili ibeghere si n'ụgbọelu ahụ n'ụbọchị Tọzde 26 Nọvemba 2026 n'ebe olili ozu dị n'Abuja.

Tinubu nyekwara ndị ezinaụlọ ndị a ụlọ ọnụụzọ atọ site n'atụmatụ 'Renewed Hope Housing Estate' dị n'isiobodo Nigeria.

O kwuru na ụlọ e nyere ndị a bụ iji gosi obi ijuafọ Nigeria nweere n'ebe ndịagha a nọ nakwa ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede a.

O kwukwara na a ga-enye ezinaụlọ ndị bụ ndị nkịtị so nwụọ n'ihe mberede ahụ.

N'oge emume ahụ, Tinubu kwuru na ọ na-ekere oke n'uju ezinaụlọ ndị a na-eru ma kwuo na ọnwụ ha bụ "nnukwu ọdachi dakwasịrị mba a".

During di memorial ceremony, Tinubu tok say e share for di grief of families wey lose dia loved ones, as e add say, di tragedy na "loss for di entire nation".

Ndịagha ụgbọelu Nigeria nwụrụ na mberede ụgbọelu

N'ụbọchị 5 Ọktoba, ụgbọelu NAF931 nke ndịagha ụgbọelu Nigeria bu ndịagha mmadụ 18 na ndị nkịtị mmadụ asaa si Benin na-aga Lagos kpọkasịrị.

Ụgbọelu NAF ATR 42 ahụ kpọkasịrị n'akụkụ ọdọ ndịagha mmiri dị n'obodo Igbokada.

Ọdachi a butere nnukwu ihe anya mmiri nye ndị Nigeria, ọkachasị ezinaụlọ ndị nwanne ha nwụrụ.

Kamgbe ọtụtụ ọnwa ihe a mere, o dobeghi anya ihe kpatara ụgbọelu ahụ jiri kpọkasịa.

Mana Onyeisiala Tinubu kwere nkwa na a ga-eme nnyocha tara ọchịchị iji mata etu ihe ahụ si mee, mụta ihe na ya ma wusie ngalaba njem ụgbọelu ike.

Ndị nwụrụ na mberede ahụ gụnyere;

Ndịagha ụgbọelu Nigeria nwụrụ na mberede ụgbọelu

Crew

1. Squadron Leader MI Aburime - (Flight Captain)

2. Squadron Leader AP Man-Ugwueje - (Co-pilot)

3. Flight Lieutenant IS Bako - (Co-pilot)

4. Warrant Officer Abubakar A - (Aircraft Technician)

5. Corporal Uguru HC - (Aircraft Technician)

Passengers

6. Flight Lieutenant - TL Lazarus

7. Flight Lieutenant - M Akinloye

8. Flying Officer IM - Adeshina

9. Master Warrant Officer - Onwuka F

10. Master Warrant Officer - Matini BA

11. Warrant Officer - Nuhu FS

12. Flight Sergeant - James RB

13. Flight Sergeant - Mohammed AI

14. Sergeant - Ani AE

15. Sergeant - Izibenikien SI

16. Sergeant - Alafuka C

17. Sergeant Mbadugha - AN

18. Lance Corporal - Ugwuba FC

19. Lance Corporal - Eledan GE

20. Ezeh Nneka

21. Godstmine Tarabina

22. Joy Michael

23. Sunday Michael

24. Ukeme David

25. Gideon Omotola

Ndịagha ụgbọelu NAF ji okoko osisi n'aka iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu

Onyeisi ndịagha ụgbọelu bụ Ọchịagha Sunday Kelvin Aneke n'oge ofufe ahụ kwuru na mmadụ 25 nwụrụ na mberede ahụ abụghị naanị ọnụọgụgụ kama na ha bụ ndị mmadụ nwere ezinaụlọ, ndị enyi nakwa ebumnobi.

O tikwara ezinaụlọ ndị o metụtara aka n'obi dịka o kwuru na o nweghi okwu maọbụ emume ọbụla a ga-eme ga-akpọghachị ndị a azụ.

Fotos ndị si n'emume olili ozu ahụ

Ndịagha ụgbọelu NAF ji okoko osisi n'aka iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu
Ndịagha ụgbọelu NAF ji okoko osisi n'aka iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu
Emume olili ozu ndịagha ụgbọelu nwụrụ anwụ
Ndịagha ụgbọelu NAF ji okoko osisi n'aka iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu
Ndịagha ụgbọelu NAF ji okoko osisi n'aka iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu