Akụkọ ndị dị mkpa n'ịchafụ: Okezie Ikpeazu ekeleela Amaju Pinnick

Mgbe e biputara ya

Isiokwu ndị dị mkpa na mgbede a

ndị ọkaiwu
Nkọwa foto, SAN bụ ugwu kachasị ugwu a na-enye onye ọkaiwu pụrụ iche na Naijiria

Ụmụ afọ Igbo ruru asatọ so na ndị e bulitere n'ọkwa ọkaibe dịka ndị ọkaiwu nke a kpọrọ 'Senior Advocates of Nigeria (SAN).'

Ha bụ George Igbokwe, Emmanuel Achukwu, Kenneth Ahia, Abuchi Madu,Louis Alozie, Sonny Wogu, ọkammụta Offorinze Amucheazi, Edmund Obiagwu nakwa Cosmas Enweluzo.

Ndị na-azụ ahịa enwela mmeri taa.

Ụlọịkpe dị na Legọs Naịjirịa
Nkọwa foto, Steeti ndị ahụ kwuru na iwu na-ekewa ezinaụlọ megidere iwu ala ha bụ 'Constitution'

Ụlọịkpe n'Abuja amanyela iwu ka-ewugharịa ọdọ ahịa ndị gọọmentị obodo ahụ kwaturu n'ụlọahịa Karmo n'Abuja.

Ndị ihe a metụtara kpụpụrụ ngalaba na-ahụ maka Abuja nakwa minista na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa kemgbe 2011 maka nkwatu a mere n'afọ 2006.

#Ekitidecides

Ndị na-eche ị sepụta ego n'ụlọakụ

Dịka a na-akwado ntuliaka ọkwa Gọvanọ n'Ekiti steeti echi ụlọakụ, ụlọakwụkwọ na ụfọdụ ngalaba gọọmentị dị ịcheiche agbachiela n'oge.

Ọge ọchịchị aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Ayodele Fayose ga-ebi echi mgbe a họpụtara onye ga-anọchị anya ya.

N'akụkọ ofesi,

N Logeswari
Nkọwa foto, N Logeswari bụ nwataakwụkwọ nwụrụ mgbe a kwara ya aka

Ndị uweojii na mba India anwụchiela otu onye nkuzi kwara nwataakwụkwọ ya aka o we siri n'elu ụlọ dapụ nwụọ.

N Longeshwari bụ aha nwata ahụ na-atụ egwu isi n'elu ụlọ ahụ wutuo mgbe ha na-eme ọzụzụ nchekwa tupu onye nkuzi ahụ kwaa ya aka.

N'egwuregwu,

Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015
Nkọwa foto, Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu enyela Amaju Pinnick ekele pụrụịche maka ọkwa ọhụrụ enyere ya dịka osote onyeisi CAF

Cheta na achụrụ Amaju Pinnick n'ọrụ dịka onyeisi ngalaba egwuregwu bọọlụ nke Naịjirịa n'ụbọchị ole na ole gara aga.

Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo?

Gụọ ya ebe a:

Ofeke mmụọ
Nkọwa foto, Dịka ala, agwọ eke bụ onyeozi ọtụtụ ofeke mmụọ

Gee nkeji nke mgbede a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile