A gbara m egbe n'ihu mgbe m dị afọ 15 nke gbanwere ndụ m kpamkpam - Median Bah
Median Bah dị nannị afọ 15 oge ndụ ya gbanwere kpamkpam.
O chetara ụbọchị ihe ahụ mere - 7 Eprel 2018. Ọ nọ n'akwa ọrịa ya.
Ndị ojiegbe wakporo ezinaụlọ nna ya dị na mpaghara ndịda anyanwụ mba Camerron bụ otu n'ime mpaghara abụọ a na-asụ asụsụ Bekee na mpaghara agha na esemokwu ahụ dapụtara.
Median dị afọ 23 ugbua, kwuru na ọ na-ehi ụra oge nwanne ya nwoke bịara kpọtee ya maka egwu sitere n'egbe ndị ojiegbe ahụ na-agba aghara aghara.
Nwanne ya nwoke si na mpio ụlọ ha gbapụ mana ịgba ọsọ adịghịrị Median mfe.
"Anọ m n'ọrịa, ike adịghị m isi na mpio ahụ gbapụ dịka nwanne m nwoke si mee, ọ bụ ya mere m jiri siri n'ụlọ ụzọ," ka ọ gwara BBC.
Nke a bụ ihe butere oke ihe mgbu.
O kwuru na o zutere ndị ojiegbe abụọ n'azụ ụlọ ha ndị malitere ịgba ya egbe ọtụtụ ugboro.
Ha bu ụzọ gbaa ya egbe n'ụkwụ tupu ha gbaa ya ọtụtụ mgbọ ndị ọzọ nke bibiri ihu ya.
"Ana m arịọ ha biko ka ha ghara igbu m maka na ahụ adịghị m. Mana ahụrụ m onwe n'ala," ka o kwuru.
Ọchịchịrịị gbara ebe niile. Ọ kwụsịrị inweta onwe ya ma ghara inwe ike ikwu okwu maọbụ hụ ụzọ.
Na mbụ, Median chere na ọ na-arọ nrọ.
"Mana ọ tụrụ m n'anya oge m chọpụtara na ọ bụghị nrọ."
Mwakpo ahụ merụrụ ya ahụ n'ihu, bibie eze ya niile ma mebie ọnụ ya.





