Mmadụ 25 nwụrụ oge ụgbọelu Nigerian Air Force kpọkara n'Ondo Steeti
Dịka ụmụ Naịjirịa nọ n'iru uju maka ihe mberede ụgbọelu dakwasịrị ụgbọelu ndịagha si Benin aga Lagos na Ondo steeti, n'ụbọchị Mọnde nke a sị na ndị niile nọ n'ụgbọelu ahụ nwụrụ, ajụjụ ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa kpụ n'ọnụ bụ kedụ onye na onye o metụtara?
Dịka Onyeisi agha elu Naịjirịa bụ Air Marshal Sunday Kelvin Aneke si kwuo n'ozi o wepụtara n'ọbaozi X n'ụbọchị Tuzde, ụgbọelu ahụ bu akara 931 bụ mmadụ iri abụọ na ise tupu ọ kpọkaa, nke gụnyere ndị ọrụ ụgbọelu ise na mmadụ iri abụọ ndị e bu ebu.
Ndị ọrụ ụgbọelu ahụ gụnyere onye ọkwọụgbọelu bụ 'Squadron Leader MI Aburime na ọgbọ ya ndị ọkwọụgbọ abụọ bụ Squadron Leader Ahamefule P Man Ugwueje na Flight Lieutenant IS Bako, ebe Warrant Officer Abubakar A na Corporal Uguru HC bụ ndị ọrụ ịkpa aka n'igwe.
Akụkọ na-ekwu na Ugwueje bụ nwaamala Umuahia dị n'Abia Steeti, onye gbara akwụkwọ nwaanyị izuụka ụka ole na ole gara aga,
Ndị ọzọ gụnyere: Flight Lieutenant TL Lazarus, Flight Lieutenant M Akinloye, Flying Officer IM Adeshina, Master Warrant Officer Onwuka F, Master Warrant Officer Matini BA, Warrant Officer Nuhu FS, Flight Sergeant James RB, Flight Sergeant Mohammed AI, Sergeant Ani AE, Sergeant Izibenikien SI, Sergeant Alafuka C, Sergeant Mbadugha AN, Lance Corporal Ugwumba FC, Lance Corporal Eledan GE, Mrs Ezeh Nneka, Godstmine Tarabina, Joy Micheal, Sunday Micheal, Ukeme David na Gideon Omotola.
Dịka ọ na-akwa arịrị maka ndị nwụrụ anwụ, Minịsta na-ahụ maka nchekwa Christopher Musa kwere nkwa na a ga-esinye imi n'ala inyochapụta ihe kpatara mkpọrị ụgbọelu ahụ.
Ka ọ dị ugbua, a ka na-achọ ozu ndịagha lara mmụọ n'ihu ọrụ, dịka onyeisiala Bola Tinubu kwupụtarala abalị atọ maka iru uju ndịagha anwụrụ anwụ.



