Ugboro ole ụgbọelu ndịagha Nigeria kpọkasịrị n'ime afọ iri gara aga

Aha onyonyo, Ugboro ole ụgbọelu ndịagha Nigeria kpọkasịrị n'ime afọ iri gara aga
Ugboro ole ụgbọelu ndịagha Nigeria kpọkasịrị n'ime afọ iri gara aga
Mgbe e biputara ya

Dịka a ka na-achọ mmadụ 32 nọ n’ụgbọelu ndịagha Nigeria kpọkara n’Ondo state; Onyeisiala Bola Tinubu ekwupụtala iri uju abalị atọ iji kwanyere ndị ihe mberede ahụ metụtara ugwu.

Cheta na ụgbọelu ndịagha ahụ aha ya bụ ATR-42 si Benin na-aga Lagos steeti mgbe ọ kpọkara n’Ondo state n’abalị ise nke ọnwa Oktoba 2026.

Ugboro ole ka ụgbọelu ndịagha Nigeria kpọkasịrịla maọbụ nwee nsogbu n'afọ iri gara aga?

N’ọnwa Julaị 2025 ka ụlọọrụ ndịagha elu bụ Nigeria Airforce kwuru na ha enweghị ihe mberede ọbụla mana ka oruru Disemba afọ ahụ ka ụgbọelu Alpha Jet nwere nsogbu mgbe ọ chọrọ ifepụ nke mere ndị ọkwọụgbọelu ahụ ji mapụ iji zọrọ onwe ha mana enweghị onye nwụrụ.

N’ọnwa Maachị 2024, ụgbọelu ndịagha a na-akpọ ‘Super Mushshak’ nwere nsogbu n’elu dịka ndị na-ọkwọ ya mmadụ abụọ mapụrụ mana onweghị onye nwụrụ na ya.

Mana mpiti kwere n’afọ 2023 dịka ugboelu ndịagha kpọkara ugboro atọ. N’ọnwa Julaị 14 2023 na Markurdi ka ụgbọelu e ji na-amụ ihe kpọkara mana enweghị onye nwụrụ na ya.

Ọzọ bụ n’Ọgọst 14, 2023 na Shiroro Niger state ka ụgbọelu ‘Mi-171 helicopter’ kpọkara oge ọ na-ebupu ndịagha merụrụ ahụ n’ihu ọgụ. N’abalị mbụ nke ọnwa Disemba 2023 ka ụgbọelu ‘Mi-35P’ kpọkara na Port Harcourt, Rivers steeti ndị nọ n’ime ya merụrụ obere ahụ mana onweghị onye nwụrụ na ya.

N’afọ 2019, ọ bụ naanị ugboro abụọ ka ụgbọelu ndịagha kpọkara. Na Damasak dị na Borno state na Jenuwarị 2 ka ụgbọelu a na-akpọ Mi-35M na-akwamgbọ kpọkara ma gbuo mmadụ ise nọ n’ime ya, ọzọ mere n’Enugu steeti n’otu afọ ahụ mgbe ụgbọelu ‘AW109 helicopter’ nwere ihe mberede mana enweghị ihe e kwuru maka ya.

N’afọ 2018, ụgbọelu ndịagha F-7Ni abụọ kwakọtara onwe ha ma kpọkasịa mgbe ha na-eme ihe ọmụmụ iji kwado emume nwereonwe Nigeria nke afọ iri ise na asatọ. Mmadụ abụọ nwụrụ ebe Bello Baba bụ onyeisi ndị ọkwọụgbọelu nwụrụ site n’ahụ o meruru ka o si n’ụgbọelu ahụ mapụ.

Mana n’afọ 2016 ka Helicopter a na-akpọ Augusta Westland AW101 feturu ala, gakwa ọzọ tupu ọ kpọkaa mana onweghị onye nwụrụ.

Dịka Onyeisiala Bola Tinubu nyerela iwu ka e mee nnyocha banyere ihe mberede ụgbọelu ndịagha mere n’Ondo steeti, cheta na amabeghị mpụtara nnyocha niile e megoro kemgbe afọ iri garaaga maka ihe mberede ụgbọelu ndịagha ndị a anyị rụtụrụ aka maka na e bipụtaghị ya n’ebe ọhaneze ga-agụ ya.