Ụfọdụ ihe onyonyo adịgboroja fesara banyere ndị NYSC a tọọrọ

Aha onyonyo, Ụfọdụ ihe onyonyo adịgboroja fesara banyere ndị NYSC a tọọrọ
Ụfọdụ ihe onyonyo adịgboroja fesara banyere ndị NYSC a tọọrọ
Mgbe e biputara ya

Akụkọ pụtara na-ekwu na a tọhapụla ndị ntoroọbịa iri abụọ ahụ a tọọrọ n’ụzọ di Onitsha aga Owerri dịka ha na-eme njem aga ebe ha ga-eji otu afọ fee ala nna ha.

A tọọrọ ndị a n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba ma mechaa tọhapụ ha n’ụbọchị Wenezde abalị asaa nke ọnwa Ọktoba afọ 2026.

Dịka akụkọ ntọrị ndị ntoroọbịa pụtara ihe, ọtụtụ ihe onyonyo na foto adịgboroja na-esosi etu e si tọọrọ ha malitere ifesa na soshal midia.

Nke a tinyere ọtụtụ ndị mmadụ n’ihe mgbagwoju anya maka etu e si tọọrọ ndị ntoroọbịa a na-agbanyeghi ha na-aga njem ịrụ ọrụ ọha.

Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ihe onyonyo ahụ nakwa ihe mere ha jiri bụ nke adịgboroja.

N’ihe onyonyo nke mbụ ị ga-ahụ na ndị ntoroọbịa yicha uwe ndị ji otu afọ efe ala nna ha mana dịka onye ka na-aga ịmalite ife ala nna, a gaghị enye gị uwe ahụ, ọ bụ naanị mgbe I ruru n’ogige ebe a na-enye ha ọzụzụ a kpọrọ ‘orientation camp’ ka ị ga-enwete uwe ahụ.

Ihe ọzọ gbapụtara ihe n’onyonyo ahụ bụ mgbe otu n’ime ụmụagbọghọ ndị ahụ furu n’ihe onyonyo ahụ n’otu ntabi anya bụ nke gosiri na ọ bụ ihe e ji akụrụngwa AI rụọ.

Ihe abụọ ndị a nakwa ndị ọzọ gosiri na ihe onyonyo ahụ adịgboroja.

Ihe onyonyo ọzọ akara a kpọrọ ‘Media Nigeria’ wepụtara na Facebook n’ubọchị anọ nke ọnwa Ọktoba gosiri ka ndị ntoroọbịa yi uwe e ji efe ala nna nakwa ndị nkịtị bucha akpa ha n’isi na-agba ọsọ, n’otu ntabi anya, a hụrụ ka ndị ahụ nọzi n’ime ọhịa na-aga ebe ndị yi uwe ndịagha ji egbe kwụrụ ha n’azụ.

N’otu aka ahụ nke a gosiri na ihe onyonyo a bụ nke adịgboroja maka na ndị ntọrị ahụ abụghị ndịagha maọbụ yiri uwe ndịagha dịka ndị uweojii si kwuo, tinyekwara na ndị ntoroọbịa ahụ e kwesighi iyi uwe e ji efe ala nna dịka e si hụta n’ihe onyonyo ahụ. Ya mere o ji bụrụ ihe AI rụpụtara.