Ụmụnwaanyị na-agba mbọ site n'ịtụtụ mkpụrụ osikapa dị na ntụ ya n'Ebony State
Ụfọdụ ụmụnwaanyị Ebonyi State na-arụ ọrụ n'ogbe ebe igboahịhịa osikapa a kpọrọ rice mill dị n'Abakaliki kọwara etu ha si agba mbọ kwa ụbọchị.
Ha na-atụtụ mkpụrụ osikapa ndị gbajiri agbaji iji ree ma zụọ onwe ha na ezinaụlọ ha.
BBC Igbo gara njem n'ogige ahụ ịhụụ etu ndị a si agba mbọ kwa ụbọchị
Lee nkọwa ụfọdụ ụmụnwaanyị a nyere maka etu ha si agba mbọ kwa ụbọchị iji chọta ihe ezinaụlọ ga-eri.
"I lee anya ugbua, ihe ha na-eme bụ, iyọpọta nke esi na Mashine, ya bụ n'injin wee bupụta, e buta ya ebe a, ha ayọchaa ya, o nwee osikapa ka dị n'ime ya, ha ayọpọta ya, werezie nke a kpọrọ chaff bugara ndị nke n'ayọ chaff.
Ha yọọ chaff ahụ ha ayọpụta ihe ndị eji enye ọkụkọ nri, ihe e ji enye ezi nri, na ihe e ji arụpụta ihe ndị ọzọ dị iche iche. Ụfọdụ jikwa ya n'awụsa n'ala ebe ọkụkọ na-anọ.
"Ọ bụrụ na ibidoro n'ụtụtụ, ọ bụrụ na mmiri ezoghi, ị ga-ayọta ihe dịka akpa ise, ihe eji ayọ otu akpa bụ otu puku naira.
Akpa ise ka ị ga-ayọta tupu chi ejie.
Nke mbụ n'apụta na-ya bụ "nwa-ọkpa-aja. Anyị kpọrọ ya "nwa-ọkpa-aja" ma ọ b…
Anyị wepụtachaa ya ugbua, anyị asụọ ya utara. Ebea kita ka anyị n'ebuga ya, anyị bugachaa ya ebe ahụ, ha ayọzịa ya n'onwe ha, ha werezia.
Arụọla m ọrụ a afọ ise, onweghị ego m n'enweta na ya. Otu akpa a na-abụ otu nari naira, ọ bụrụ ma m butere iri, ị mara na ọ bụ otu puku naira.
Ndị nke ụmụ nwaanyị a nọ n'elu bụ ụmụ kịrịkịrị osikapa ka ha na-achọ. Ha chọyachaa osikapa ahụ ja ebudatara anyị "dust" anyị ewee jiri aka anyị yọọ ya. Anyị yọchaa ya, ndị n"ebu ya aga ụlọ ọrụ dị iche iche, eburu ya gawa m'ụlọ ọrụ.
Eburu ya gaa ebe ahụ, eji Chaff a emepụta ọtụtụ ihe, eji ya arụpụta "back of speaker", "foreign speaker" eji ya eme ọtụtụ ihe n'ụlọ ọrụ dị iche iche.
Eji nke "Rice Brown", nke "powdered" anyị n'ayọpụta ya nkea ụmụ nwaanyị a n'ayọ ugbua, ewere ya gaa na kọmpani, eji ya eme ndi ọkụkọ. Ọ bụ ya bụ nri ọkụkọ, etinye ya "wheatoffer", etinye ya ọka, tinye ya flavour, ọ bụ ya bụ nri ọkụkọ a n'egota.
Ọ bụ ya bụ nri ọkụkọ.
N'otu ụbọchị , i nwere ike inweta ego naira ruru puku ise, puku isii, puku abụọ, puku abụọ n'ụma, otu puku, ma ọ bụ nari naira ise.
Ọ bụ ka isi agba mbọ ga-ekwu ego ole ị ga-enweta.
Ọ bụ n'ime ihea anyị na-arụ ka anyị si enweta ego kwụọ ụgwọ akwụkwọ ụmụaka anyị.



