Ọkaiwu Ukwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami ekwuola na Ndị Omeiwu Naijirịa enweghị ikike ịkpọ Onyeisiala Muhammadu Buhari oku dịka ha si ka ọ bịa zara ọnu ya banyere ihe na-eme na Naịjirịa ugbua.
Nke a na-abịa dịka ndị Boko Haram kwenyere na ọ bụ ha gburu ndị ọrụ ugbo 43 na Zabarmari di na Borno Steeti.
Ndị Omeiwu sibu ka Onyeisiala Buhari zute ha nke Buhari n'onwe ya kwenyere na ya ga-eme etu a.
Mana Malami, site n'akawụkwọ mgbasaozi o binyere aka n'aya n'ụbọchị Tuzde, sị na Ndị Omeiwu enweghi ikike ịkpọ Onyeisiala.
Ọ sị na ọ bụ "na mmasị Onyeisiala Naịjirịa" ka ọ dịrị ị bịa n'ihu Ndị Omeiwu.
Ọ sị site n'iwu Naịjirịa, onweghi ebe ọbụla e dere na ndị omeiwu nwere ikike ịkpọ Onyeisiala oku.
Malami gara n'ihu kwuo na gọọmentị Buhari agbaala nnukwu mbọ ịhụ na oke mwakpo nakwa ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa ebelatala.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na atụmatụ Onyeisiala Buhari ji arụ ọrụ nchekwa abụghị ihe a ga-abịa na-ekwu n'ihu ọha.
Ọ sị na agaghị agbagha na ọ bụ n'ọchịchị Buhari ka anapụrụ Boko Haram okpuru ọchịchi ime obodo 14 nọ ha n'aka.