Aga m akwado Tinubu maka enyemaka ya n’inweta ntuliaka ziri ezi n'Ọshụn

Aga m akwado Tinubu maka enyemaka ya n’inweta ntuliaka ziri ezi n'Ọshụn
Mgbe e biputara ya

N'amalite okwu nnabata Gọvanọ Ademola Adeleke oge o meriri na ntuliaka nke abụọ dịka gọvanọ, ka o buruụzọ kwanyere ndị niile nwụrụ ka a na-eme ntuliaka ahụ ugwu.

O jikwara ohere ahụ kwuo na ọ ga-emezu nkwa o kwere maka ikwado Onyeisiala Tinubu na ntuliaka onyeisiala Naịjirịa na-abịa n'afọ 2027.

Gụọ ihe niile o kwuru ebe a:

"Tupu m malite okwu, a chọrọ m ka onye ọbụla kulie maka ncheta ndị ntuliaka a tara isi ha. Maka ya ka m ji ebunyere ndị Ọshụn mmeri m, dịka unu si wee họpụkwa m ịbụ Gọvanọ unu ọzọ. Agaghị m akụda mmụọ unu.

Ugbua, ka m nkeele Onyeisiala Tinubu maka nkwado ya ka anyị nwee usoro ntuliaka ziri ezi. Onyeisiala bụ nwa afọ Ọshụn Steeti, ana m emezu nkwa m ikwado ya maka ịzọ ọkwa Onyeisiala n’oge nke abụọ ya. Ana m eweliaka udo nye ndị ọzọ mụ na ha zọrọ ọkwa a, a bụ m Gọvanọ ndị niile n’Ọshụn steeti.

Ekele diri ndị ezigbo mmadụ nke Steeti Osun. Na Chineke ka anyị na-atụkwasị obi, oge niile."

Cheta na Bola Oyebamiji ji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa Gọvanọ ebe Najeem Salaam ji ọkwa ADC zọọ ọkwa a.

N'ịzaghachị Gọvanọ Adeleke, minista na-ahụ maka ụgbọelu kwuru na nkwa bụ nkwa. Ọ ka mma na Gọvanọ mezuru nkwa o kwere maka ikwado Onyeisiala Tinubu.

Ka ọ dị, obi dị ọtụtụ ndị bi n'Ọshụn steeti, nke a gosiri n'onyoonyo ha kesara oge akpọpụtara aha Gọvanọ Adeleke dịka onye mmeri, tụmadụ nwa nwanne ya nwoke bụ onye otiegwu a maa ama bụ Davido Adeleke.